-
Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị KraịstỤlọ Nche—1996 | Ọktoba 1
-
-
Otu àgwà emeghị oké ngosi nke Apọlọs ahụ pụtakwara ìhè na njikere ọ dị ịnakwere akwụkwọ ozi nhọpụta sitere n’aka ụmụnna ndị Efesọs nye ọgbakọ dị na Kọrint. Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu, sị: “Mgbe o zubere ịgabiga n’ofe ka ọ baa n’Akaịa, ụmụnna n’ime Kraịst . . wee degara ndị na-eso ụzọ Jisọs akwụkwọ ịnara ya nke ọma.” (Ọrụ 18:27; 19:1) Apọlọs asịghị ka a nabata ya ná ntoru nke onwe ya kama o ji imeru ihe n’ókè gbasoo ndokwa nke ọgbakọ ndị Kraịst.
-
-
Apọlọs—Onye Ọkà Okwu Na-ekwusa Eziokwu Ndị KraịstỤlọ Nche—1996 | Ọktoba 1
-
-
Ihe ndị mbụ ozi Apọlọs rụpụtara na Kọrint magburu onwe ha. Akwụkwọ bụ́ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ, sị: “Mgbe o ruru, o nyeere ha aka nke ukwuu, bụ́ ndị kwererị site n’amara: n’ihi na o ji ike kwukpaa ndị Juu ọnụ nke ukwuu, n’ihu ọha mmadụ, ebe ọ na-egosi na Jisọs bụ Kraịst ha site n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ.”—Ọrụ 18:27, 28.
Apọlọs tinyere onwe ya n’ije ozi ọgbakọ, na-agba ụmụnna ume site ná nkwadebe na ịnụ ọkụ n’obi ya. Gịnị bụ isi ihe kpatara ihe ịga nke ọma ya? N’ezie Apọlọs nwere ikike ebumpụta ụwa, o nwekwara obi ike n’ijigide nrụrịta ụka ọha nke ya na ndị Juu. Ma nke ka mkpa, o jiri Akwụkwọ Nsọ tụgharịa uche.
-