Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị “Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke” Na-akpali
    Ụlọ Nche—2002 | Ọgọst 1
    • Ndị A Kpaliri Ime Ihe!

      4. Amụma dị aṅaa nke Joel ka e mezuru n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A.?

      4 Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ nọ na Jeruselem natasịrị mmụọ nsọ, ha egbughị oge ọ bụla n’izisara ndị ọzọ ozi ọma nke nzọpụta ahụ, na-amalite n’ebe ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara n’ebe ahụ n’ụtụtụ ahụ nọ. Nkwusa ha mere mezuru otu amụma dị ịrịba ama nke Joel, bụ́ nwa Petuel, dekọrọ narị afọ asatọ tupu mgbe ahụ, sị: “M ga-awụsa Mmụọ m n’ahụ́ anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ndị okenye unu ga-arọ nrọ, ụmụ okorobịa unu ga-ahụ ọhụụ: ee, ọbụna n’ahụ́ ndị ohu ndị ikom na n’ahụ́ ndị inyom na-eje ozi ka M ga-awụsa Mmụọ m na mgbe ahụ . . . tupu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.”—Joel 1:1; 2:28, 29, 31; Ọrụ 2:17, 18, 20.

      5. N’echiche dị aṅaa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ buru amụma? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

      5 Nke a ọ̀ pụtara na Chineke gaje ime ka e nwee otu ọgbọ nke ndị amụma, ma ndị ikom ma ndị inyom, ndị ga-eyi Devid, Joel, na Debọra, ma jiri ha buo amụma banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? Ee e. ‘Ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ndị ohu ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi’ bụ́ Ndị Kraịst, ga-ebu amụma n’ụdị na mmụọ Jehova ga-akpali ha ikwusa “ihe ndị dị ebube” Jehova meworo na ndị ọ ka ga-eme. Ya mere, ha ga-eje ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Onye Kasị Ihe Nile Elu.a Otú ọ dị, olee otú ìgwè mmadụ ahụ si meghachi omume?—Ndị Hibru 1:1, 2.

  • Ndị “Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke” Na-akpali
    Ụlọ Nche—2002 | Ọgọst 1
    • a Mgbe Jehova họpụtara Mozis na Erọn ịgwa Fero okwu n’aha ndị ya, Ọ gwara Mozis, sị: “Emewo m ka ị ghọọrọ Fero chi: Erọn, bụ́ nwanne gị, ga-abụkwa onye amụma gị.” (Ọpụpụ 7:1, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Erọn jere ozi dị ka onye amụma, ọ bụghị n’echiche nke ibu amụma banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu, kama site n’ịghọ ọnụ na-ekwuru Mozis.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya