-
Ànyị Kwesịrị Ịtụ Setan Egwu?Ụlọ Nche—2014 | Nọvemba 1
-
-
Ihe Ndị Kraịst mere ga-enyere gị aka. Ọrụ Ndịozi 19:19 gwara anyị ihe ndị bi n’Efesọs mere mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “N’ezie, ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile. Ha wee gbakọọ ọnụ ahịa ha wee hụ na o ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise.”a Ndị Kraịst ahụ mebisịrị ihe niile ha ji eme mgbaasị n’agbanyeghị ego ole a na-ere ha. Ihe a ha mere nwere ike ịbara anyị ezigbo uru taa. Ndị na-eme anwansi na mgbaasị jụrụ ebe niile n’ụwa anyị a. O nwere ike ịdị mmadụ ka o nwechaghị ihe dị njọ n’ime mgbaasị ma ọ bụ na ihe ndị e ji eme mgbaasị adịchaghị njọ. Ma, ha nwere ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ kpatara gị nsogbu. N’ihi ya, i kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka i zere ime mgbaasị na ihe ọ bụla e ji eme ya.—Diuterọnọmi 18:10-12.
-
-
Ànyị Kwesịrị Ịtụ Setan Egwu?Ụlọ Nche—2014 | Nọvemba 1
-
-
a Ọ bụrụ na mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ ego ndị Rom a na-akpọ dinarịọs, ọ pụtara na ego ahụ bụ ego ole a ga-akwụ puku ndị ọrụ iri ise n’ụbọchị. Ọ bụghị obere ego.
-