-
“Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”Ụlọ Nche—2002 | Septemba 1
-
-
6. Nye ihe atụ nke otú Jizọs si kwuo okwu ndị dị mfe ma bụrụ nnọọ ndị ezi uche dị na ha.
6 Mgbe mgbe, Jizọs ji nkebi ahịrịokwu ndị dị mkpirikpi ma doo anya kwuo okwu ndị dị mfe ma bụrụ nnọọ ndị ezi uche dị na ha. N’oge ahụ a na-enwebeghị akwụkwọ ndị e biri ebi, o si otú ahụ kụnye ozi ya n’uche na n’obi nke ndị na-ege ya ntị n’ụzọ ha na-apụghị ichefu echefu. Rịba ihe atụ ụfọdụ ama: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; . . . unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe.” “Unu ga-amata ndị ahụ site ná mkpụrụ ha.” “Ndị nwere ahụ́ ike enweghị mkpa maka dibịa, ma ndị ahụ́ na-enye nsogbu nwere.” “Ndị nile na-ebu mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”c (Matiu 6:24; 7:1, 20; 9:12; 26:52; Mak 12:17; Ọrụ 20:35) Ruo ugbu a, bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 eri Jizọs kwusịrị ha, a na-echeta okwu ndị ahụ bụ́ ịgba n’ụzọ dị mfe.
-
-
“Ọ Dịbeghị Mgbe Mmadụ Ọzọ Kwuru Okwu Otú A”Ụlọ Nche—2002 | Septemba 1
-
-
c Ọ bụ nanị Pọl onyeozi hotara ihe atụ nke ikpeazụ a, bụ́ nke a na-achọta n’Ọrụ 20:35, n’agbanyeghị na a na-ahụ echiche dị n’okwu ndị ahụ n’Oziọma ndị ahụ. Ọ pụrụ ịbụwo na Pọl nụtara ya n’ọnụ onye ọzọ (ma ọ́ bụghị n’ọnụ onye na-eso ụzọ nke nụrụ mgbe Jizọs kwuru ya ọ bụrụ n’ọnụ Jizọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie), ma ọ bụkwanụ na ọ bụ Chineke kpughere ya nye ya.—Ọrụ 22:6-15; 1 Ndị Kọrint 15:6, 8.
-