-
“Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
“Ha niile malitere ibe ezigbo ákwá.”—Ọrụ 20:37
22. Gịnị mere ndị okenye si Efesọs ji hụ Pọl n’anya?
22 Otú Pọl si jiri obi ya niile hụ ụmụnna ya n’anya mere ka ha hụ ya n’anya. N’eziokwu, mgbe oge ruru ka ọ laa, “ha niile malitere ibe ezigbo ákwá, ha makụkwara” ya “ma susuo ya ọnụ.” (Ọrụ 20:37, 38) Ndị Kraịst anaghị eji ndị na-ebu mkpa atụrụ Chineke n’isi ka Pọl egwuri egwu, ha na-ahụkwa ha n’anya. Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe Pọl mere, ọ̀ bụ na i kwetaghị na o kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi”?—Ọrụ 20:26.
-