-
Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme, Ndị Mmadụ Ana-atakwa Ahụhụ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 26
Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme, Ndị Mmadụ Ana-atakwa Ahụhụ?
E nwee ọdachị, ihe a na-ajụkarị bụ: “Gịnị mere ihe a ji mee?” Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl zara ajụjụ a otú doro anya.
1. Olee otú Setan si mee ka ihe ọjọọ malite ime n’ụwa?
Setan bụ́ Ekwensu nupụụrụ Chineke isi. Ọ chọkwara ịna-achị ndị ọzọ. N’ihi ya, o mere ka mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, soro ya nupụrụ Chineke isi. Otú o si mee ya bụ na ọ ghaara Iv ụgha. (Jenesis 3:1-5) O mere ka Iv chewe na e nwere ihe dị mma Jehova na-achọghị ka o nweta. Ihe Setan na-ekwu bụ na ndị mmadụ ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha anaghị erubere Chineke isi. Ọ bụ Setan bụ onye mbụ ghara ụgha. Ọ gwara Iv na ọ gaghị anwụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”—Jọn 8:44.
2. Gịnị ka Adam na Iv kpachaara anya mee?
Jehova nyere Adam na Iv ihe niile ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. Ọ gwara ha na ha nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ogige Iden, ma e wezụga otu. (Jenesis 2:15-17) Ma, ha kpachaara anya rie mkpụrụ osisi ahụ a gwara ha erila. Baịbụl kwuru na Iv ‘ghọọrọ mkpụrụ ya rie,’ mechaakwa nye Adam “ya erie.” (Jenesis 3:6) Otú a ka ha abụọ si nupụrụ Chineke isi. Ebe ọ bụ na Adam na Iv zuru okè, ime ihe ọjọọ anaghị agụ ha agụụ, ihe na-agụ ha bụ ime ihe dị mma. Ma, ha kpachaara anya nupụrụ Chineke isi. Ha si otú a mehie ya, gosikwa na ha achọghị ka ọ bụrụ ya ga na-achị ha. Ihe a ha mere mere ka ha malite ịta ezigbo ahụhụ.—Jenesis 3:16-19.
3. Olee otú ihe Adam na Iv mere si gbasa anyị?
Mgbe Adam na Iv mehiechara, ha ghọrọ ndị na-ezughị okè. Ha bufeere ụmụ ha niile ezughị okè. Baịbụl kwuru otú ihe Adam mere si gbasa anyị. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile.”—Ndị Rom 5:12.
O nwere ihe dị iche iche mere anyị ji ata ahụhụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ata ahụhụ n’ihi ihe na-adịghị mma anyị mere. Anyị na-atakwa ahụhụ mgbe ụfọdụ n’ihi ihe na-adịghị mma ndị ọzọ mere. E nwekwara oge ụfọdụ anyị na-ata ahụhụ n’ihi na anyị nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị.—Gụọ Ekliziastis 9:11.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere na ọ bụghị Chineke na-akpata ma ahụhụ ndị mmadụ na-ata ma ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa taa. Chọpụtakwa otú obi na-adị Chineke mgbe anyị na-ata ahụhụ.
4. Onye na-akpata ahụhụ anyị na-ata
Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ihe a ha na-eche ọ̀ bụ eziokwu? Kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Jems 1:13 na 1 Jọn 5:19. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ma ahụhụ ndị mmadụ na-ata ma ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa?
5. Otú ihe si kwụrụ kemgbe Setan chịwara
Gụọnụ Jenesis 3:1-6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ụgha Setan ghara?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 4 na nke 5.
Olee otú Setan si kwuo na Jehova achọghị ka ụmụ mmadụ nweta ihe dị mma?
Gịnị ka Setan kwuru nke pụtara na ndị mmadụ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Jehova na-achị ha?
Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
N’oge a niile ọ na-abụghị Jehova na-achị ndị mmadụ, olee otú ihe si kwụrụ n’ụwa?
A. Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ha zuru okè, birikwa na Paradaịs. Ma, ha gere Setan ntị ma nupụrụ Jehova isi
B. Mgbe ha nupụchaara Chineke isi, mmehie, ahụhụ, na ọnwụ juziri ebe niile n’ụwa
CH. Jehova ga-akwụsị mmehie, ahụhụ, na ọnwụ. Ụmụ mmadụ ga-ezu okè ọzọ ma biri na Paradaịs
6. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi
Ahụhụ anyị na-ata ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi? Chegodị gbasara ihe Eze Devid na Pita onyeozi dere. Gụọnụ Abụ Ọma 31:7 na 1 Pita 5:7. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị ịmata na Jehova na-ahụ ahụhụ anyị na-ata nakwa na ọ na-emetụ ya n’obi?
7. Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata
Gụọnụ Aịzaya 65:17 na Mkpughe 21:3, 4. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Jehova kwere nkwa na ọ ga-emezi ihe niile ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kpatara. Gịnị mere nkwa a ji akasi gị obi?
Ị̀ ma ihe a?
Mgbe Setan ghara ụgha mbụ, o kwutọrọ Jehova, ya bụ, o mebiri aha ya. Ihe o kwuru pụtara na Jehova anaghị ekpe ikpe ziri ezi nakwa na ọ kpọrọ ndị ọ na-achị asị. Jehova ga-eme ka a kwụsị imebi aha ya n’oge na-adịghị anya mgbe ọ ga-emezi ihe niile ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata kpatara. E nwere ike ikwu na ọ ga-eme ka onye ọ bụla mara na e nweghị ọchịchị ka nke ya mma. Ime ka a kwụsị imebi aha Jehova so n’ihe kacha mkpa a ga-eme ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Matiu 6:9, 10.
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ahụhụ anyị na-ata bụ uche Chineke.
Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?
NCHỊKỌTA
Ọ bụ ihe Setan bụ́ Ekwensu na Adam na Iv mere kacha akpata ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi, ọ ga-akwụsịkwa ya n’oge na-adịghị anya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ụgha Setan bụ́ Ekwensu ghaara Iv?
Olee otú isi Adam na Iv nupụrụ si gbasa anyị?
Olee otú anyị si mara na ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova n’obi?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na mmehie bụ.
Gụọ isiokwu a ka ị hụ otú e si kọwakwuo ihe Setan bụ́ Ekwensu kwuru n’ogige Iden.
“Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2014)
Chọpụta otú e si zaa otu ajụjụ tara akpụ otú na-akasi obi.
“Gịnị Mere Chineke Ji Gba Nkịtị E Gbukpọọ Ndị Juu Bi na Yurop?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta ihe otu nwoke mụtara gbasara ahụhụ ndị ezinụlọ ha na-ata.
-
-
Olee Otú Ọnwụ Jizọs Ga-esi Zọpụta Anyị?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Anyị na-emehie, na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ maka na di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụụrụ Chineke isi.a Ma, anyị nwere olileanya. Jehova haziri otú ọ ga-esi si n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Baịbụl kwuru na Jizọs nwụrụ iji gbapụta anyị. Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji gbapụta mmadụ. Ụgwọ Jizọs kwụrụ ka a gbapụta anyị bụ ndụ ya zuru okè o ji chụọ àjà. (Gụọ Matiu 20:28.) Jizọs ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, o ji obi ya niile kweta ka e gbuo ya. Ihe a o mere ga-eme ka anyị nwee ike inweta ihe niile Adam na Iv tụfuru. Jizọs gosikwara anyị na otú ya na Jehova si hụ anyị n’anya enweghị atụ. Isiokwu a ga-eme ka i jiri ọnwụ Jizọs nwụrụ kpọrọkwuo ihe.
1. Olee otú ọnwụ Jizọs si abara anyị uru ugbu a?
Anyị na-eme ọtụtụ ihe na-adịghị Jehova mma maka na anyị bụ ndị mmehie. Ma, ọ bụrụ na mmehie anyị mere ewute anyị, anyị esi n’aka Jizọs rịọ Jehova mgbaghara, gbaakwa mbọ ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ, anyị na Chineke ga-adị n’ezigbo mma. (1 Jọn 2:1) Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst, bụ́ onye ezi omume, nwụrụ naanị otu ugboro n’ihi ndị mmehie ka o duga unu ebe Chineke nọ.”—1 Pita 3:18.
2. Olee otú ọnwụ Jizọs ga-esi baara anyị uru n’ọdịnihu?
Jehova zitere Jizọs Kraịst ka o jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà “ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na [Jizọs], kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’ihi ihe a Jizọs mere, ọ gaghị adị anya Jehova emezie ihe niile isi Adam nupụrụ mebiri. Ọ pụtara na ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, anyị ga-enwe ike inwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs.—Aịzaya 65:21-23.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo ihe mere Jizọs ji jiri ndụ ya chụọ àjà nakwa otú àjà ahụ ga-esi baara gị uru.
3. Ọnwụ Jizọs napụtara anyị n’aka mmehie na ọnwụ
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe Adam tụfuru mgbe o nupụụrụ Chineke isi?
Gụọnụ Ndị Rom 5:12. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe mmehie Adam kpataara gị?
Gụọnụ Jọn 3:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere Jehova ji zite Ọkpara ya n’ụwa?
Adam bụ mmadụ zuru okè. N’ihi mmehie o mere, ụmụ mmadụ na-emehie, na-anwụkwa anwụ
Jizọs bụ mmadụ zuru okè. N’ihi otú o si rubere Chineke isi, ụmụ mmadụ ga-ezu okè, dịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi
4. Ọnwụ Jizọs nwere ike ịbara mmadụ niile uru
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ọnwụ otu onye ga-esi baara mmadụ niile uru?
Gụọnụ 1 Timoti 2:5, 6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Adam bụ mmadụ zuru okè, ma n’ihi mmehie o mere, mmadụ niile na-emehie, na-anwụkwa anwụ. Jizọs bụkwa mmadụ zuru okè. Olee otú o si “nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile”?
5. Àjà Jizọs chụrụ bụ onyinye Jehova nyere gị
Ndị enyi Jehova na-ewere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Jehova nyere ha. Dị ka ihe atụ, gụọnụ Ndị Galeshia 2:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú Pọl onyeozi si gosi na o weere àjà ahụ Jizọs chụrụ ka onyinye Chineke nyere ya?
Mgbe Adam mehiechara, a mara ya na ụmụ ọ ga-amụta ikpe ọnwụ. Ma Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nwụọ, nke mere na i nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi.
Ka ị na-agụ amaokwu ndị a, chegodị otú ọ ga-abụ na obi dị Jehova mgbe Ọkpara ya nọ na-ata ahụhụ. Gụọnụ Jọn 19:1-7, 16-18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị maka ihe Jehova na Jizọs meere gị?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma otu onye ọ̀ ga-anwụli maka mmadụ niile.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ọnwụ Jizọs mere ka Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị, meekwa ka o kwe omume na anyị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?
Olee otú o si bụrụ na ndụ Jizọs nke zuru okè bụ ihe mgbapụta dabara adaba?
Olee otú ọnwụ Jizọs nwere ike isi baara gị uru?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe mere e ji kpọọ àjà Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ ihe mgbapụta.
“Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ ‘Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ’?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta ihe anyị ga-eme ka a zọpụta anyị.
Jehova ò nwere ike ịgbaghara onye mere mmehie jọrọ ezigbo njọ?
Chọpụta otú ịmụta na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà si nyere otu nwoke aka ịgbanwe otú o si ebi ndụ.
“Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
a Mmehie abụghị naanị mgbe mmadụ mere ihe ọjọọ. Otú ime ihe ọjọọ si agụ anyị agụụ maka na anyị bụ ụmụ Adam na Iv bụkwa mmehie.
-