-
Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udoỤlọ Nche—2011 | Nọvemba 15
-
-
8 Iwu Mozis, bụ́ nke e dere ọtụtụ iwu mmadụ ga-edebe na ya, mara ndị mmehie ikpe. Ihe ọzọ bụ na ndị nchụàjà na-eje ozi mgbe e nwere Iwu ahụ ezughị okè, ha agaghịkwa enwe ike ịchụ àjà ga-ezu iji kpuchie mmehie. N’ihi ya, Iwu ahụ “sitere n’anụ ahụ́ ghara ịdị ike.” Ma, Chineke “mara mmehie dị n’anụ ahụ́ ikpe site n’izite Ọkpara nke ya ka ọ dịrị n’ụdị anụ ahụ́ nke na-emehie emehie” ma nye ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, si otú ahụ mee “ihe Iwu ahụ na-apụghị ime.” N’ihi ya, a ga-agụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ná ndị ezi omume ma ha nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. A gbara ha ume ka ha “na-eje ije, ọ bụghị dị ka anụ ahụ́ si chọọ, kama dị ka mmụọ nsọ si chọọ.” (Gụọ Ndị Rom 8:3, 4.) N’eziokwu, ha ga na-eme otú ahụ ruo mgbe ha jechara ozi ha na-eje n’ụwa iji nwee ike inweta “okpueze bụ́ ndụ.”—Mkpu. 2:10.
-
-
Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udoỤlọ Nche—2011 | Nọvemba 15
-
-
10. Olee otú iwu nke mmehie na nke ọnwụ si achị anyị?
10 Pọl onyeozi dere, sị: “Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Ebe anyị bụ ụmụ Adam, iwu nke mmehie na nke ọnwụ na-achị anyị niile. Ahụ́ anyị na-ezughị okè na-agwa anyị mgbe niile ka anyị mee ihe na-adịghị mma n’anya Chineke, bụ́kwanụ ihe ga-ebutere anyị ọnwụ. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galeshia, ọ kpọrọ àgwà ndị dị otú ahụ “ọrụ nke anụ ahụ́.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” (Gal. 5:19-21) Ndị dị otú ahụ na ndị na-eje ije dị ka anụ ahụ́ si chọọ bụ otu. (Rom 8:4) Ihe ha na-eme bụ ihe ahụ́ ha na-ezughị okè gwara ha ka ha mee. Ma, ọ̀ bụ naanị ndị na-akwa iko, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị na-eme mgbaasị, na ndị na-eme mmehie ndị ọzọ dị oké njọ na-eje ije n’anụ ahụ́? Mba. Ihe ndị so n’ọrụ nke anụ ahụ́ bụ ihe mmadụ ụfọdụ nwere ike ịsị na ọ bụ adịghị ike anụ ahụ́, dị ka ekworo, iwe ọkụ, esemokwu, na anyaụfụ. Ònye ga-asị na ya akwụsịchaala ije ije dị ka anụ ahụ́ si chọọ?
-
-
Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udoỤlọ Nche—2011 | Nọvemba 15
-
-
12 E nwere ike iji otú ọ dị anyị tụnyere otú ọ dị onye a gwọrọ ọrịa nke gaara egbu ya. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ka ọrịa ahụ haa ya aka kpamkpam, ọ ga-emerịrị ihe dọkịta gwara ya mee. Ọ bụ eziokwu na iwu nke mmehie na nke ọnwụ nwere ike ịha anyị aka ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, anyị ka bụkwa ndị na-ezughị okè na ndị mmehie. O nwere ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị na Chineke nwee ike ịna-adị n’ezigbo mma, ya emeekwara anyị amara ma gọzie anyị. Ka anyị wee nwee ike ime “ihe ziri ezi nke Iwu ahụ chọrọ ka e mee,” Pọl kwuru na anyị ga na-eje ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ.
Olee Otú Anyị Ga-esi Na-eje Ije na Mmụọ Nsọ?
13. Gịnị ka ije ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ pụtara?
13 E nwee ebe anyị ji ụkwụ na-aga, anyị na-agagide ruo mgbe anyị ruru ebe ahụ. N’otu aka ahụ, ije ije dị ka mmụọ nsọ si chọọ pụtara ịna-agbalịsi ike ka anyị na Chineke na-adị ná mma, ọ pụtaghị na anyị agaghị emehie ihe. (1 Tim. 4:15) Kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-eje ije, ma ọ bụ na-ebi ndụ, dị ka mmụọ nsọ si chọọ. ‘Ịna-eje ije site na mmụọ nsọ’ na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma.—Gal. 5:16.
-