Ị̀ Maara?
Gịnị mere Jizọs ji kpọọ Jehova “Aba, Nna” n’ekpere?
Okwu Arameik bụ́ ʼab·baʼʹ nwere ike ịpụta “nna” ma ọ bụ “Nna m.” Ugboro atọ ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ bụ mgbe a na-ekpe ekpere na mgbe a na-ekwu banyere Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. Olee ihe okwu ahụ pụtara?
Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, sị: “N’asụsụ ndị mmadụ na-asụkarị n’oge Jizọs, ʼabbāʼ bụ ihe ụmụaka na-akpọ nna ha nke na-egosi na ha na nna ha dị ná mma, nakwa na ha na-akwanyere ya ùgwù.” Ọ bụ ihe nwa na-akpọ nna ọ hụrụ n’anya, o sokwa n’okwu mbụ nwata na-amụta. Jizọs kpọrọ ya Nna ya mgbe ọ na-ekpeku ya ekpere si ya n’ala ala obi. N’ekpere ahụ Jizọs kpere n’ogige Getsemeni mgbe ọ fọrọ awa ole na ole ka ọ nwụọ, ọ kpọrọ Jehova “Aba, Nna.”—Mak 14:36.
Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “N’akwụkwọ ndị Juu dere n’oge ndị Gris na ndị Rom na-achị ụwa, o siri ike ịhụ ebe a kpọrọ Chineke ʼabbāʼ. O doro anya na ihe kpatara ya bụ na ọ ga-adị ka à na-akparị Chineke akparị ma a kpọọ ya aha a nke na-egosi oké adịm ná mma.” Ma, “Jizọs . . . ịkpọ Chineke ʼabbāʼ n’ekpere bụ ụzọ o si gosi na o kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na ya na Chineke dị n’ezigbo mma.” Ebe abụọ ọzọ “Aba” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ, ya bụ, n’akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere, na-egosi na Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na-ekwukwa ya mgbe ha na-ekpe ekpere.—Ndị Rom 8:15; Ndị Galeshia 4:6.
Gịnị mere e ji dee akwụkwọ ụfọdụ nke Baịbụl n’asụsụ Grik?
Pọl onyeozi kwuru na e nyefere “okwu dị nsọ nke Chineke” n’aka ndị Juu. (Ndị Rom 3:1, 2) Ọ bụ ya mere o ji fọ nke nta ka ọ bụrụ Hibru, bụ́ asụsụ ndị Juu, ka e ji dechaa mpaghara mbụ nke Baịbụl. Ma, ọ bụ asụsụ Grik ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst.a Ọ̀ bụ maka gịnị?
Na narị afọ nke anọ Tupu Oge Anyị, ndị agha ndị lụụrụ Alexander Onye Ukwu agha sụrụ asụsụ Grik n’olumba dị iche iche a na-asụ n’oge gboo, bụ́ ndị gwakọtawara na-achọ ịghọ Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ. Mmeri Alexander meriri mba dị iche iche n’agha so mee ka Koine bụrụ asụsụ a na-asụ ná mba niile n’oge ahụ. Ndị Juu bi ná mba dị iche iche n’oge ahụ Alexander nọ na-emeri n’agha. Ọtụtụ narị afọ tupu oge ahụ, mgbe a hapụrụ ndị Juu ka ha si Babịlọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha, laa, ọtụtụ n’ime ha alaghachighị Palestaịn. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu amakwaghị otú e si asụ ezigbo Hibru, ihe ha na-asụzi bụ Grik. (Ọrụ 6:1) Ọ bụ iji nyere ha aka mere e ji bipụta Septuagint, ya bụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru e ji Koine, ma ọ bụ Grik ọha mmadụ na-asụ, sụgharịa.
Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na o nweghị asụsụ “dị ka asụsụ Grik ma a bịa n’inwe ọtụtụ okwu, n’ịdịrị onye ukwu na onye nta mfe ọsụsụ, nakwa n’ịgazu ebe niile n’ụwa.” N’ihi ọtụtụ okwu, ụtọ asụsụ na ngwaa dị iche iche o nwere, bụ́ ndị nwere ike ịkọwa ụdị ihe dị iche iche mmadụ chọrọ ikwu, ọ bụ “asụsụ e ji ekwurịta okwu na nke e ji agbasa ozi, nke bụ́ kpọmkwem ụdị asụsụ dị Ndị Kraịst mkpa.” Ó kwesịghị ekwesị na ọ bụ asụsụ Grik ka e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a E dere akwụkwọ ole na ole dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Arameik. Ihe àmà na-egosi na Matiu bu ụzọ dee Oziọma ya n’asụsụ Hibru, ọ ga-abụkwa na o mechara sụgharịa ya n’asụsụ Grik.
[Foto dị na peeji nke 13]
Iberibe ihe odide Septuagint Grik
[Ebe E Si Nweta Foto]
A natara Israel Antiquities Authority ikike