Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 19 p. 113-119
  • Ịka Israel nke Chineke Akara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịka Israel nke Chineke Akara
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ifufe Anọ nke Ụwa
  • Ịka Ndị Ohu Chineke Akara
  • Mmadụ Ole Ka A Kara Akara?
  • Israel nke Chineke Taa
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’Eluigwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Otu Ìgwè Atụrụ, Otu Onye Ọzụzụ Atụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 19 p. 113-119

Isi nke 19

Ịka Israel nke Chineke Akara

Ọhụụ 4—Mkpughe 7:1-17

Isiokwu: A kara 144,000 akara, a hụkwara ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-eguzo n’ihu ocheeze Jehova nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ

Oge mmezu ya: Malite n’oge Kraịst Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na 1914 ruo n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya

1. “Ònye pụkwara iguzo” n’oké ụbọchị ahụ nke iwe Chineke?

“ÒNYE pụkwara iguzo?” (Mkpughe 6:17) Ee, olee nnọọ onye ọ bụ? Mgbe oké ụbọchị nke iwe Chineke bibiri usoro ihe nke Setan, ndị ọchịchị na ndị nile bi n’ụwa pụrụ ịjụ nnọọ ajụjụ ahụ. Nye ha, ọ ga-adị ka oké mbibi ahụ na-abịanụ ga-ekpochapụ ndụ mmadụ dum. Ma, ọ̀ ga-eme otú ahụ? Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na onye amụma Chineke mesiri anyị obi ike, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Joel 2:32) Ndị ozi bụ Pita na Pọl kwadoro eziokwu ahụ. (Ọrụ 2:19-21; Ndị Rom 10:13) Ee, ndị kpọkuru aha Jehova ga-alanarị. Olee ndị bụ ndị a? Ka ọhụụ nke na-eso na-emeghe, anyị ga-ahụ ndị ha bụ.

2. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe e kwesịrị ịrịba ama na a ga-enwe ndị ga-adị ndụ gabiga ụbọchị ikpe Jehova?

2 Ọ bụ n’ezie oké ihe na a ga-enwe onye ga-adị ndụ gabiga ụbọchị ikpe Jehova, n’ihi na otu n’ime ndị amụma Chineke ji okwu ndị a kọwaa ya: “Lee, oké ifufe nke Jehova, bụ́ ọnụma ya, apụwo, ọ bụ oké ifufe nke na-efechapụ efechapụ: n’isi ndị na-emebi iwu ka ọ ga-efekwasị sie ike. Iwe dị ọkụ nke Jehova agaghị alaghachi azụ, ruo mgbe o mesịrị, ruokwa mgbe o mesịrị ka nzube nile nke obi ya guzosie ike.” (Jeremaịa 30:23, 24) Ọ dị oké mkpa ka anyị mee ihe iji belata ike nke oké ifufe ahụ!—Ilu 2:22; Aịsaịa 55:6, 7; Zefanaịa 2:2, 3.

Ifufe Anọ nke Ụwa

3. (a) Ozi pụrụ iche dị aṅaa nke ndị mmụọ ozi na-eje ka Jọn hụrụ? (b) Gịnị ka “ifufe anọ” ndị ahụ sere onyinyo ha?

3 Tupu Jehova atọhapụ ọnụma ya, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe rụrụ otu ọrụ pụrụ iche. Jọn na-ahụ nke a ugbu a n’ọhụụ: “Mgbe nke a gasịrị m wee hụ ndị mmụọ ozi anọ ka ha na-eguzo n’elu nkuku anọ nke ụwa, na-ejidesi ifufe anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla wee ghara ife n’elu ụwa, ma ọ bụ n’elu oké osimiri, ma ọ bụ n’elu osisi ọ bụla.” (Mkpughe 7:1) Gịnị ka nke a pụtaara anyị taa? “Ifufe anọ” ndị a bụ ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ nke ikpe mbibi nke a gaje ịtọhapụ n’oge na-adịghị anya n’isi òtù ụmụ mmadụ na-emebi iwu n’elu ala, ‘n’oké osimiri’ na-amagharị amagharị nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emebi iwu, nakwa n’isi ndị ọchịchị e buliri elu dị ka oké osisi, ndị na-enweta nkwado site n’aka ndị nile bi n’elu ala.—Aịsaịa 57:20; Abụ Ọma 37:35, 36.

4. (a) Gịnị ka ndị mmụọ ozi anọ ahụ nọchiri anya ya? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ọ ga-enwe ná nzukọ elu ala nke Setan mgbe a tọhapụrụ ifufe anọ ahụ?

4 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mmụọ ozi anọ ndị a nọchiri anya òtù ndị mmụọ ozi, ndị Jehova ji eme ihe n’ijighachi mmezu nke ihe o kpere n’ikpe azụ ruo mgbe oge a kara aka maka ya ruru. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ikuku ndị ahụ nke iwe Chineke ifekwasị ụwa n’otu mgbe site n’ugwu, ndịda, ọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, ọ ga-eweta mbibi dị ukwuu. Ọ ga-eyi, kama ọ bụ n’ụzọ dị njọ karị, ojiji Jehova jiri ifufe anọ mee ihe n’ịchụsasị ndị Ilam nke oge ochie, na-etisasị ha, na-ekpochapụkwa ha. (Jeremaịa 49:36-38) Ọ ga-abụ oké ifufe hiri nne nke ukwuu nke ga-ebibi ihe karịa “oké ifufe” nke Jehova ji kpochapụ mba Amọn. (Emọs 1:13-15) Ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke nzukọ Setan dị n’elu ala nke ga-enwe ike iguzo n’ụbọchị oké iwe Jehova, mgbe ọ ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta ruo mgbe nile ebighị ebi.—Abụ Ọma 83:15, 18; Aịsaịa 29:5, 6.

5. Olee otú amụma Jeremaịa si enyere anyị aka ịghọta na ikpe Chineke ga-emetụta elu ụwa dum?

5 Ànyị pụrụ ijide n’aka na ikpe Chineke ga-emetụta elu ala dum? Gee ntị ọzọ ka onye amụma ya bụ Jeremaịa na-ekwu okwu: “Lee, ihe ọjọọ na-apụ si n’otu mba jeruo mba ọzọ, a ga-akpọtekwa oké ifufe site ná nsọtụ nile nke ụwa. Ndị Jehova gburu ga-adịzukwa n’ụbọchị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa.” (Jeremaịa 25:32, 33) Ọ bụ n’oge ajọ oké ifufe nke a ka ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa nke a. A ga-eme ka òtù ọchịchị ya nile mee mkpatụ, wee pụọ n’anya. (Mkpughe 6:12-14) Ma ọdịnihu agaghị agba ọchịchịrị nye mmadụ nile. N’ihi nke a, ọ̀ bụ n’ihi olee ndị ka a na-ejighachi ifufe anọ ahụ azụ?

Ịka Ndị Ohu Chineke Akara

6. Ònye gwara ndị mmụọ ozi ahụ ka ha jighachi ifufe anọ ahụ azụ, gịnịkwa ka nke a na-enye ohere ka e mee?

6 Jọn gara n’ihu ịkọwa ụzọ a ga-esi kaa ụfọdụ ndị akara maka nlanarị, na-asị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-esi n’ọwụwa anyanwụ rịgoo, na-enwe akara nke Chineke dị ndụ: o wee were oké olu tiere ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ́ ndị e nyere ha ike imejọ ụwa na oké osimiri, sị, Emejọla ụwa, ma ọ bụ oké osimiri, ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị ga-akasịwo ndị ohu Chineke anyị akara n’egedege ihu ha.”—Mkpughe 7:2, 3.

7. Ònye n’ezie bụ mmụọ ozi nke ise nke a, ihe àmà dịkwa aṅaa na-enyere anyị aka ịkwado onye ọ bụ?

7 Ọ bụ ezie na a kpọghị aha mmụọ ozi nke ise nke a, ihe àmà nile na-egosi na ọ ghaghị ịbụ Onyenwe anyị Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube. N’ikwekọ n’ọbụbụ Jisọs bụ Onyeisi ndị mmụọ ozi, e gosiri ya ebe a dị ka onye nwere ikike n’ahụ ndị mmụọ ozi ndị ọzọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16; Jud 9) O si n’ebe ọwụwa anyanwụ bilite, dị ka “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa”—Jehova na Kraịst ya—ndị bịara imezu ihe e kpere n’ikpe, dị ka ndị eze bụ Daraịọs na Saịrọs mere mgbe ha weturu Babilọn oge ochie n’ala. (Mkpughe 16:12; Aịsaịa 45:1; Jeremaịa 51:11; Daniel 5:31) Mmụọ ozi nke a yikwara Jisọs n’ihi na e nyere ya ọrụ nke ịka ndị Kraịst e tere mmanụ akara. (Ndị Efesọs 1:13, 14) Ọzọkwa, mgbe a tọhapụrụ ifufe ndị ahụ, ọ bụ Jisọs na-eduru usuu ndị agha nke eluigwe jee n’imezu ihe e kpere n’ikpe megide mba nile. (Mkpughe 19:11-16) N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ọ ga-abụ Jisọs bụ onye nyere iwu ka e cheretụgodị n’ibibi nzukọ elu ala nke Setan ruo mgbe a kara ndị ohu Chineke akara.

8. Gịnị bụ ịka akara ahụ, oleekwa mgbe ọ malitere?

8 Gịnị bụ ịka akara nke a, oleekwa ndị bụ ndị ohu Chineke? Ịka akara ahụ malitere na Pentikọst 33 O.A. mgbe e ji mmụọ nsọ tee ndị Juu mbụ ghọrọ ndị Kraịst mmanụ. E mesịa, Chineke gara n’ihu ịkpọpụta, “ndị mba ọzọ,” teekwa ha mmanụ. (Ndị Rom 3:29; Ọrụ 2:1-4, 14, 32, 33; 15:14) Pọl onyeozi dere banyere onwunwe ndị Kraịst e tere mmanụ nwere nkwa nke bụ na ha ‘dịịrị Kraịst’ ma kwuokwa na Chineke “kakwara anyị akara, nyekwa anyị mmụọ nsọ n’obi anyị, bụ́ ihe anyị ji mara na anyị ga-enwezu nkwa ahụ nile.” (2 Ndị Kọrint 1:21, 22; tụlee Mkpughe 14:1.) Otú a, mgbe a nabatara ndị ohu ndị a dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke, ha na-ebu ụzọ nata ihe àmà nke ihe nketa eluigwe ha—akara, ma ọ bụ nkwa. (2 Ndị Kọrint 5:1, 5; Ndị Efesọs 1:10, 11) Mgbe ahụ ha pụrụ ikwu, sị: “Mmụọ nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyị na ya otuto.”—Ndị Rom 8:15-17.

9. (a) Ntachi obi dị aṅaa ka a chọrọ n’aka ndị fọdụrụ n’ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ mụta? (b) Ruo ole mgbe ka a ga-anọgide na-ele ndị ahụ e tere mmanụ ule?

9 “Ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ”—gịnị ka nke ahụ pụtara? Ka ha wee nata okpueze ahụ, bụ́ ndụ, ndị Kraịst e tere mmanụ aghaghị inwe ntachi obi, kwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ. (Mkpughe 2:10) Ọ bụghị okwu metụtara ‘a zọpụtahaala mmadụ, a zọpụtachaala ya.’ (Matiu 10:22; Luk 13:24) Kama nke ahụ, a dụrụ ha ọdụ, sị: “Na-anụnụ ọkụ n’obi karị ime ka ọkpụkpọ unu na nhọpụta unu bụrụ ihe na-eguzosi ike.” Dị ka Pọl onyeozi, ha aghaghị inwe ike ikwu, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.” (2 Pita 1:10, 11; 2 Timoti 4:7, 8) Ya mere, n’elu ala ebe a, ule na myọcha nke ihe fọdụrụ n’ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ mụta aghaghị ịnọgide na-aga n’ihu ruo mgbe Jisọs na ndị mmụọ ozi ya na ha so ga-akanyewo akara ahụ n’ụzọ siri ike “n’egedege ihu” nke ndị a nile, na-akwado ọmụma a ma ha, n’ụzọ a na-apụghịkwa ịgbanwe agbanwe, dị ka “ndị ohu Chineke anyị” a nwapụtaworo, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, akara ahụ na-abụ nke na-adịgide adịgide. O doro anya na mgbe a tọhapụrụ ifufe anọ ahụ nke mkpagbu, a ga-akawo ndị nile so n’Israel ime mmụọ ahụ akara nke ikpeazụ, ọ bụ ezie na ole na ole n’ime ha ka ga-anọ ndụ n’anụ ahụ. (Matiu 24:13; Mkpughe 19:7) Ndị ga-eso na ya ga-ezuworị!—Ndị Rom 11:25, 26.

Mmadụ Ole Ka A Kara Akara?

10. (a) Akụkụ akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa na-egosi na ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ a kara akara bụ nke a kpaara ókè? (b) Gịnị bụ ngụkọta nke ndị ahụ a kara akara, oleekwa otú e si depụta ha?

10 Jisọs gwara ndị a gaje ịka akara nke a, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze ya.” (Luk 12:32) Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ, dị ka Mkpughe 6:11 na Ndị Rom 11:25, na-egosi na ọnụ ọgụgụ nke ìgwè atụrụ nta nke a bụ n’ezie nke a kpaara ókè, nke a kakwararịị aka. Okwu ọzọ Jọn kwuru kwadoro nke a: “M wee nụ ọnụ ọgụgụ ndị a kararịị, [puku narị na iri anọ na anọ], ndị a kararịị akara site n’ebo nile ọ bụla nke ụmụ Israel. A kararịị akara site n’ebo Juda [puku iri na abụọ]: site n’ebo Reuben [puku iri na abụọ]: site n’ebo Gad [puku iri na abụọ]: site n’ebo Asha [puku iri na abụọ]: site n’ebo Naftali [puku iri na abụọ]: site n’ebo Manase [puku iri na abụọ]: site n’ebo Simeọn [puku iri na abụọ]: site n’ebo Livaị [puku iri na abụọ]: site n’ebo Isaka [puku iri na abụọ]: site n’ebo Zebulun [puku iri na abụọ]: site n’ebo Josef [puku iri na abụọ]: site n’ebo Benjamin [puku iri na abụọ].”—Mkpughe 7:4-8.

11. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ ịbụ na ozuzo aka e mere n’ebe ebo 12 ahụ dị emetụtaghị Israel anụ ahụ efu? (b) N’ihi gịnị ka Mkpughe ji depụta ebo 12 ahụ? (ch) N’ihi gịnị ka a na-enweghị agbụrụ ọ bụla nke nanị ya bụ ndị eze ma ọ bụ ndị nchụàjà n’Israel nke Chineke?

11 Nke a ọ́ gaghị abụ izo aka n’Israel anụ ahụ efu? Ee e, n’ihi na Mkpughe 7:4-8 agbasoghị ụzọ a na-esibu edepụta agbụrụ ndị ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 1:17, 47) O doro anya na ihe ndepụta dị n’ebe a abụghị ná nzube nke ime ka a mara ndị Juu anụ ahụ site n’agbụrụ ha dị iche iche, kama na ọ bụ iji gosi nhazi yiri nke ahụ maka Israel ime mmụọ. Nke a guzoziri eguzozi. A ga-enwe kpọmkwem 144,000 ndị nọ ná mba ọhụrụ nke a—12,000 site na nke ọ bụla n’ebo 12 ndị ahụ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime agbụrụ ndị dị n’Israel nke Chineke nke a nke ọ bụ nanị ya bụ nke ndị eze ma ọ bụ ndị nchụàjà. Mba ahụ dum ga-achị dị ka ndị eze, mba ahụ dum ga-ejekwa ozi dị ka ndị nchụàjà.—Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 20:4, 6.

12. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka 24 ndị okenye ndị ahụ na-abụ abụ n’ihu Nwa Atụrụ ahụ n’okwu ndị dị ná Mkpughe 5:9, 10?

12 Ọ bụ ezie na ndị Juu anụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ka e nyere ohere mbụ ịbụ ndị a họpụtara iso n’Israel ime mmụọ, ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị mba ahụ zara òkù ahụ. N’ihi nke a, Jehova gbasapụrụ ọkpụkpọ òkù ahụ nye ndị Jentaịl. (Jọn 1:10-13; Ọrụ 2:4, 7-11; Ndị Rom 11:7) Dị ka ọ dị n’ihe banyere ndị Efesọs, ndị nọbu dị ka ‘ndị e kewapụrụ n’ebe ndị Israel nọ,’ ugbu a, a pụrụ iji mmụọ Chineke kaa ndị na-abụghị ndị Juu akara, ha bụrụkwa akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ. (Ndị Efesọs 2:11-13; 3:5, 6; Ọrụ 15:14) N’ihi ya, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka 24 ndị okenye ahụ na-abụ abụ n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, sị: “I werekwa ọbara gị gbatara Chineke mmadụ si n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta, i wee mee ha ka ha bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.”—Mkpughe 5:9, 10.

13. N’ihi gịnị ka o ji zie ezi na nwanne Jisọs bụ Jemes dere akwụkwọ ozi ya nye ‘ebo iri na abụọ ahụ gbasasịrị agbasasị’?

13 Ọgbakọ ndị Kraịst bụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ.” (1 Pita 2:9) Mgbe ọ nọchiri ọnọdụ Israel anụ ahụ dị ka mba nke Chineke, ọ ghọrọ Israel ọhụrụ nke bụ ‘Israel n’ezie.’ (Ndị Rom 9:6-8; Matiu 21:43)a N’ihi nke a, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka onye otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jemes dee akwụkwọ ozi ọzụzụ atụrụ ya nye ‘ebo iri na abụọ ahụ ndị gbasasịrị agbasasị,’ ya bụ, nye ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ nke ga-emesịa nwee 144,000 ndị nọ n’ime ya.—Jemes 1:1.

Israel nke Chineke Taa

14. Gịnị gosiri na Ndịàmà Jehova anọgidewo na-ekwere na 144,000 bụ ọnụ ọgụgụ efu nke ndị mejupụtara Israel ime mmụọ?

14 Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmata na Charles T. Russell, ghọtara 144,000 ahụ ịbụ ọnụ ọgụgụ nkịtị nke mmadụ ndị ga-emejupụta Israel ime mmụọ. N’akwụkwọ bụ́ The New Creation, Mpịakọta nke Isii nke usoro akwụkwọ ya bụ́ Studies in the Scriptures, nke e bipụtara na 1904, o dere, sị: “Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na ọnụ ọgụgụ ahụ a kara aka nke ndị a họpụtaworo [bụ́ ndị e tere mmanụ] bụ nke ahụ e kwuru ọtụtụ ugbo n’akwụkwọ Mkpughe (7:4; 14:1); nke bụ́ 144,000 ‘ndị a gbatara n’etiti mmadụ.’” N’akwụkwọ bụ́ Light, Akwụkwọ nke Mbụ, nke Ndị Mmụta Bible bipụtara na 1930, e kwukwara n’otu aka ahụ, sị: “E si otú a gosipụta 144,000 ndị ahụ so n’ahụ Kraịst dị ka ndị a họpụtara n’etiti ìgwè mmadụ, teekwa ha mmanụ, ma ọ bụ kaa ha akara.” Ndịàmà Jehova anọgidewo na-ekwere na ọ bụ ọnụ ọgụgụ efu nke 144,000 ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara Israel ime mmụọ.

15. N’oge na-adịghị anya tupu mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị, gịnị ka ndị ji ezi obi na-amụ Bible chere na ndị Juu anụ ahụ ga-enweta mgbe Oge ndị Jentaịl gasịrị?

15 Otú ọ dị, ọ̀ bụ na Israel anụ ahụ nke oge a ekwesịghị inweta ihu ọma ụfọdụ pụrụ iche? N’oge na-adịghị anya tupu mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, mgbe ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu ka na-amalite ịchọpụtaghachi eziokwu ndị bụ isi nke Okwu Chineke, e chere na mgbe Oge ndị Jentaịl ahụ gwụsịrị, ndị Juu gaje inwetaghachi ọnọdụ pụrụ iche n’ihu Chineke. N’ihi nke a, akwụkwọ C. T. Russell bụ́ The Time Is at Hand (Mpịakọta nke Abụọ nke usoro akwụkwọ Studies in the Scriptures), nke e bipụtara na 1889, kọwara Jeremaịa 31:29-34 dị ka nke metụtara ndị Juu anụ ahụ, wee kwuo, sị: “Ụwa nile bụ ndị akaebe n’eziokwu ahụ bụ na ntaramahụhụ a na-enye ndị Israel n’okpuru ọchịchị ndị Jentaịl anọgidewo kemgbe B.C. [607], na ọ nọgidekwara na-aga n’ihu, na ọ dịghịkwa ihe mere a ga-eji tụọ anya na ha ga-ahazighachi onwe ha dị ka otu mba tupu A.D. 1914, bụ́ ọgwụgwụ nke ‘oge asaa’ ha—2520 afọ.” N’oge ahụ, o yiri ka à gaje iweghachi ndị Juu dị ka otu mba, olileanya nke a siwanyekwara ike na 1917, mgbe Nkwupụta Balfour ahụ kwere nkwa na Britain ga-enye nkwado ha n’ime ka Palestine ghọọ ala nke mba ndị Juu.

16. Mgbalị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova mere iji ozi ndị Kraịst ahụ jekwuru ndị Juu anụ ahụ, gịnị sikwa na nke a pụta?

16 Mgbe agha ụwa mbụ gasịrị, Palestine ghọrọ ókèala nke dị n’okpuru ike ọchịchị Great Britain, ụzọ meghekwaara ọtụtụ ndị Juu ịlọghachi n’ala ahụ. Na 1948, a mụpụtara Israel dị ka otu Mba. Nke a ó gosighị na a gaje inye ndị Juu ngọzi Chineke? Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova chere na ọ bụ otú ahụ. N’ihi nke a, na 1925, ha bipụtara otu akwụkwọ nwere 128 peji, bụ́ Comfort for the Jews. Na 1929, ha wepụtara otu ọmarịcha akwụkwọ nwere 360 peji, bụ́ Life, nke a kwadebere ịdọrọ mmasị ndị Juu, na-elebakwa anya n’akwụkwọ Bible bụ Job. E mere oké mgbalị, karịsịa na New York City, iji ozi banyere Mesaịa ahụ ruo ndị Juu. Ọ bụ ihe obi ụtọ na mmadụ ole na ole n’ime ha zaghachiri, ma ndị Juu ahụ, dị nnọọ ka ndị nna ha ochie nke narị afọ mbụ, jụrụ ihe àmà nke ọnụnọ Mesaịa ahụ.

17, 18. Gịnị ka ndị ohu Chineke nọ n’elu ala ghọtara banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na amụma mweghachi nile ndị dị na Bible?

17 Ọ ghọrọ ihe doro anya na ndị Juu, dị ka otu ndị nakwa dị ka otu mba, abụghị Israel ahụ a kọwara ná Mkpughe 7:4-8 ma ọ bụ n’amụma Bible ndị ọzọ ndị metụtara ụbọchị Onyenwe anyị. N’ịgbaso omenala, ndị Juu nọgidere na-ezere iji aha Chineke eme ihe. (Matiu 15:1-3, 7-9) N’ịtụle Jeremaịa 31:31-34, akwụkwọ bụ́ Jehovah, nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1934, mere nkwubi okwu, sị: “Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ enweghị ihe ọ bụla jikọtara ya na ndị si n’Israel anụ ahụ pụta nakwa ya na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha, ma . . . o metụtara nanị Israel ime mmụọ.” Amụma nile banyere mweghachi ndị dị na Bible emetụtaghị ndị Juu anụ ahụ ma ọ bụkwanụ Israel nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke so n’òtù United Nations, bụrụkwa akụkụ nke ụwa ahụ Jisọs kwuru okwu ya na Jọn 14:19, 30 na 18:36.

18 Na 1931, ndị ohu Chineke nọ n’elu ala ji oké ọṅụ nata aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ha pụrụ iji obi ha nile kwado okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 97:11: “A ghaworo onye ezi omume ìhè dị ka mkpụrụ, a ghawokwara ndị ziri ezi n’obi ọṅụ.” Ha pụrụ ịghọta n’ụzọ doro anya na ọ bụ nanị Israel ime mmụọ ka a kpọbataworo n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Ndị Hibru 9:15; 12:22, 24) Ndị Israel anụ ahụ na-adịghị anakwere ozi ahụ enweghị òkè ọ bụla n’ime ya, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha enweghịkwa òkè ọ bụla na ya. Nghọta nke a meghere ụzọ maka oké mwụpụ nke ìhè Chineke, bụ́ nke pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme nke usoro ọchịchị Chineke. Nke a ga-egosi ókè Jehova na-egosipụtaru obi ebere ya, amara, na eziokwu ya nye mmadụ nile ndị bịara ya nso. (Ọpụpụ 34:6; Jemes 4:8) Ee, ndị ọzọ na-abụghị Israel nke Chineke ga-erite uru site ná ndị mmụọ ozi ahụ ijighachi ifufe anọ nke mbibi ahụ azụ. Olee ndị ka ndị a pụrụ ịbụ? Ị̀ pụrụ ịbụ otu n’ime ha? Ka anyị lee ugbu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ụzọ kwesịrị ekwesị, aha ahụ bụ́ Israel pụtara “Chineke Na-agba Mgba; Onye So Chineke Na-agba Mgba (Na-ejidesi Ya Ike).”—Jenesis 32:28, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.

[Foto dị na peeji nke 114]

[Foto ndị dị na peeji nke 116, 117]

Nhọpụta bụ́ isi nke ezi Israel nke Chineke malitere n’ụbọchị Pentikọst nke 33 O.A. ruo n’afọ 1935 mgbe, ná mgbakọ Ndịàmà Jehova ahụ bụ ihe oké akụkọ nke e mere na Washington, D.C., e chegharịrị ihu gaa n’ịchịkọbata oké ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya ndụ elu ala (Mkpughe 7:9)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya