Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Onye Ọ Bụla Ga-enwere Onwe Ya
    Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
    • “Mkpughe nke Ụmụ Ndị Ikom Chineke”

      Jehova doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu “n’olileanya” nke na otu ụbọchị a ga-eweghachiri ezinụlọ mmadụ nnwere onwe site n’ihe omume nke “ụmụ ndị ikom Chineke.” Ole ndị bụ “ụmụ ndị ikom Chineke” a? Ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst bụ́ ndị a mụrụ n’ohu nke mmehie na ezughị okè, dị ka “[mmadụ ndị ọzọ] e kere eke.” Site n’ọmụmụ ha enweghị ezi ọnọdụ n’ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke bụ́ nke dị ọcha, zuo okè. Ma Jehova meere ha ihe dị ịrịba ama. Site n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, Ọ na-atọhapụ ha pụọ n’agbụ nke mmehie e ketara eketa ma na-agụ ha ná “ndị ezi omume,” ma ọ bụ ndị dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 6:11) Mgbe ahụ, ọ na-edo ha dị ka “ụmụ ndị ikom Chineke,” na-eweghachi ha n’ezinụlọ eluigwe na ala ya.—Ndị Rom 8:14-17.

      Dị ka ndị Jehova doro dị ka ụmụ ya ndị ikom, ha ga-enwe ihe ùgwù dị ebube. Ha ga-abụ “ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha [ga-abụkwa] eze n’elu ụwa” ha na Jisọs Kraịst dị ka akụkụ nke Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4) Nke a bụ ọchịchị e guzobesiri ike n’ụkpụrụ nke nnwere onwe na ikpe ziri ezi—ọ bụghị ná mmegbu ma ọ bụ n’ọchịchị aka ike. (Aịsaịa 9:6, 7; 61:1-4) Pọl onyeozi na-ekwu na ụmụ ndị ikom Chineke a bụ ndị enyi Jisọs, bụ́ “mkpụrụ Abraham” ahụ e kwere ná nkwa eri oge. (Ndị Galetia 3:16, 26, 29) N’ihi ya, ha na-ekere òkè dị mkpa n’imezu otu nkwa Chineke kwere enyi ya bụ́ Abraham. Otu akụkụ nke nkwa ahụ bụ na site ná mkpụrụ (ma ọ bụ, nwa) Abraham “mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.”—Jenesis 22:18.

  • Onye Ọ Bụla Ga-enwere Onwe Ya
    Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
    • Olee mgbe “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke” ga-amalite? N’oge na-adịghị anya site n’ugbu a, mgbe Jehova ga-eme ka o doo mmadụ nile anya ndị ụmụ ndị ikom Chineke ahụ bụ. Nke a ga-abụ mgbe “ụmụ ndị ikom” a, bụ́ ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie gaa n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ga-eso Jisọs Kraịst kere òkè n’ime ka ụwa a dị ọcha pụọ n’ajọ ihe na mmegbu n’agha Chineke bụ́ Ha-Magedọn. (Daniel 2:44; 7:13, 14, 27; Mkpughe 2:26, 27; 16:16; 17:14; 19:11-21) Anyị na-ahụ gburugburu anyị ihe àmà dị ukwuu na anyị abamiela n’ime “mgbe ikpeazụ,” mgbe nkwere dịruru ogologo oge nke Chineke kwere ka nnupụisi dịrị na ajọ omume ndị na-esi na ya apụta, ga-ejedebe.—2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-31.

  • Onye Ọ Bụla Ga-enwere Onwe Ya
    Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
    • Ka ị “na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike,” ị pụrụ ịzụlite obi ike ahụ Pọl onyeozi nwere ná nlekọta na nkwado na-echebe echebe nke Kraịst, ọbụna mgbe nhụjuanya na ikpe na-ezighị ezi fọrọ nke nta ka o yie ihe a na-agaghị anagideli. Mgbe ọ tụlesịrị mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke, Pọl jụrụ, sị: “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst? Ọ̀ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oké mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oké ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha?” (Ndị Rom 8:35) N’ezie, n’ikwu ya n’okwu Rousseau, ndị Kraịst n’oge Pọl ka nọ “n’agbụ” nye otu ụdị ọchịchị aka ike ma ọ bụ ọzọ. “A na-eme ka [ha] nwụọ ogologo ụbọchị dum” dị ka “atụrụ ogbugbu.” (Ndị Rom 8:36) Hà kwere ka nke ahụ karịa ha ike?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya