Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Iji “Olileanya Siri Ike” Na-echere
    Ụlọ Nche—1998 | Septemba 15
    • “Olileanya Siri Ike nke Ihe Nile E Kere Eke”

      12, 13. Olee otú ihe e kere eke bụ́ mmadụ si bụrụ ndị ‘e doro n’okpuru ihe efu,’ gịnịkwa na-agụsi atụrụ ọzọ ahụ ike?

      12 Atụrụ ọzọ ahụ hà nwekwara ihe ha ga-eji maka ya na-ebi n’olileanya siri ike? N’ezie ha nwere. Mgbe o kwusịrị banyere olileanya dị ebube nke ndị ahụ Jehova nabatara dị ka “ụmụ ndị ikom” ya e ji mmụọ nsọ mụta na “ndị ha na Kraịst na-ekekọ” n’Alaeze eluigwe, Pọl kwuru, sị: “Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:14-21; 2 Timoti 2:10-12.

  • Iji “Olileanya Siri Ike” Na-echere
    Ụlọ Nche—1998 | Septemba 15
    • 14. Gịnị ka “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke” ga-agụnye, oleekwa otú nke a ga-esi mee ka ihe a kpọrọ mmadụ bụrụ ndị e mere ka ha “pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi”?

      14 A ga-ebu ụzọ ‘kpughee’ ihe fọdụrụ ‘n’ụmụ ndị ikom Chineke’ ahụ e tere mmanụ. Gịnị ka nke a ga-agụnye? N’oge nke Chineke, ọ ga-edo atụrụ ọzọ ahụ anya na ‘a kasịwo ndị ahụ e tere mmanụ akara,’ meekwa ka ha nọrọ n’ebube iso Kraịst chịa. (Mkpughe 7:2-4) A ‘ga-ekpughekwa’ “ụmụ ndị ikom Chineke” ahụ e si n’ọnwụ kpọlite mgbe ha ga-eso Kraịst kere òkè n’ibibi ajọ usoro ihe Setan. (Mkpughe 2:26, 27; 19:14, 15) Mgbe ahụ, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ‘ga-ekpughekwu’ ha dị ka usoro ndị nchụàjà maka ikesa abamuru nke àjà mgbapụta Jisọs nye “ihe e kere eke” bụ́ mmadụ. Nke a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ bụrụ ndị ‘e mere ka ha pụọ n’ịbụ ohu mmebi,’ n’ikpeazụ baakwa n’ime “inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:21; Mkpughe 20:5; 22:1, 2) N’ịbụ ndị nwere ụdị olileanya ahụ dị ebube, ọ̀ bụ ihe ijuanya na atụrụ ọzọ ahụ ji “olileanya siri ike” “na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike”?—Ndị Rom 8:19.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya