Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mee Jehova Obi Ike Gị
    Ụlọ Nche—2003 | Septemba 1
    • N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

      10, 11. (a) Dị ka e dere ná Ndị Rom 8:19-22, gịnị mere “ihe nile e kere eke”? (b) Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta onye doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu?

      10 Otu akụkụ nke akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom mere ka a ghọtakwuo isiokwu a dị mkpa. Pọl dere, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke. N’ihi na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, na-adabere n’olileanya bụ́ na a ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke. N’ihi na anyị maara na ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:19-22.

      11 Iji ghọta isi ihe ndị dị n’amaokwu ndị a, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ zaa ajụjụ ụfọdụ ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, Ònye doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu? Ụfọdụ ekwuwo na ọ bụ Setan; ndị ọzọ asị na ọ bụ Adam. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ọ pụrụ ịbụ ya doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ nke doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu mere otú ahụ “na-adabere n’olileanya.” Ee, o mere ka e nwee olileanya na ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-emesịa “pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.” Ma Adam ma Setan apụghị ime ka e nwee olileanya dị otú ahụ. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime otú ahụ. Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọ bụ ya doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu.

      12. Olee ihe mgbagwoju anya bilitere n’ihe banyere ihe “ihe nile e kere eke” pụtara, oleekwa otú a pụrụ isi zaa ajụjụ a?

      12 Otú ọ dị, gịnị bụ “ihe nile e kere eke” e zoro aka na ya n’akụkụ ihe odide a? Ụfọdụ na-asị na “ihe nile e kere eke” na-ezo aka n’ala nkịtị, gụnyere ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ. Ma ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ hà nwere olileanya nke inweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke”? Ee e. (2 Pita 2:12) Mgbe ahụ, “ihe nile e kere eke” pụrụ izo aka nanị n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ nke a bụ ihe e kere eke nke mmehie na ọnwụ na-emetụta n’ihi nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden, nke olileanya dịkwa mkpa nke ukwuu.—Ndị Rom 5:12.

      13. Gịnị ka nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden mere ihe a kpọrọ mmadụ?

      13 Gịnị kpọmkwem ka nnupụisi ahụ kpataara ihe a kpọrọ mmadụ? Pọl ji okwu abụọ kọwaa ihe si na ya pụta: ihe efu. Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, okwu a na-akọwa “ịbụ ihe efu nke ihe na-adịghị arụ ọrụ e mere ya ịrụ.” E mere ụmụ mmadụ ka ha na-adị ndụ ebighị ebi, na-arụkọ ọrụ dị ka ezinụlọ dị n’otu, nke zukwara okè n’ilekọta paradaịs elu ala. Kama nke ahụ, ha na-ebi ndụ dị mkpụmkpụ, nke ihe mgbu jupụtara, ọtụtụ mgbe bụrụkwa nke na-agbakasị ahụ́. Dị ka Job si kwuo ya, “mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ọ bụ ihe efu n’ezie!

      14, 15. (a) Ihe ama dị aṅaa nke ikpe ziri ezi ka anyị na-achọta n’ikpe Jehova mara ihe a kpọrọ mmadụ? (b) N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu “ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya”?

      14 Anyị eruteziela n’ajụjụ bụ́ isi: N’ihi gịnị ka “Onyeikpe ụwa nile” ji doo ihe a kpọrọ mmadụ ibi ndụ nke ihe mgbu na mgbakasị ahụ́? (Jenesis 18:25) Ihe ahụ o mere ò ziri ezi? Ọ dị mma, cheta ihe nne na nna anyị mbụ mere. Site n’inupụrụ Chineke isi, ha sonyeere Setan, bụ́ onye mara ọbụbụeze Jehova aka n’ụzọ siri ike. N’ihi ihe ahụ ha mere, ha kwadoro nzọrọ ahụ bụ́ na mmadụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị na Jehova, na-achị onwe ya n’okpuru nduzi nke mmụọ e kere eke nupụrụ isi. N’ịma ndị nnupụisi ahụ ikpe, Jehova nyeziri ha ihe ha rịọrọ maka ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. O nyere mmadụ ohere ịchị onwe ya n’okpuru ikike Setan. N’ọnọdụ dị otú ahụ, olee mkpebi nke pụrụ izi nnọọ ezi karịa ido ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe efu ma ná ndabere nke olileanya?

      15 N’ezie, nke a abụghị n’ihi ‘ọchịchọ nke ihe e kere eke.’ A mụrụ anyị dị ka ohu nke mmehie na ire ure, anyị enweghịkwa nhọrọ ọ bụla ime n’okwu ahụ. Ma Jehova, site n’obi ebere ya, nyere Adam na Iv ohere ibizu ndụ ha fọdụrụnụ na ịmụ ụmụ. Ọ bụ ezie na dị ka ụmụ ha, e doro anyị n’ihe efu nke mmehie na ọnwụ, anyị nwere ohere ime ihe ahụ Adam na Iv na-emeghị. Anyị pụrụ ige Jehova ntị ma mụta na ọbụbụeze ya ziri ezi ma zuo okè, ebe ọchịchị ụmụ mmadụ na-achị n’adabereghị na Jehova na-eweta nanị ihe mgbu, obi nkoropụ, na ihe efu. (Jeremaịa 10:23; Mkpughe 4:11) Mmetụta Setan na-emekwa ka ihe na-akawanye nanị njọ. Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na-agba akaebe banyere eziokwu ndị a.—Eklisiastis 8:9.

      16. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọ bụghị Jehova na-akpata nhụjuanya nke anyị na-ahụ n’ụwa taa? (b) Olileanya dị aṅaa ka Jehova jiworo ịhụnanya mee ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nwee?

      16 N’ụzọ doro anya, Jehova nwere ezi ihe ndị mere o ji doo ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe efu. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ bụ Jehova na-akpata ihe efu na nhụjuanya na-abịakwasị onye ọ bụla n’ime anyị taa? Cheedị echiche banyere ọkàikpe nke mara omekome ikpe n’ụzọ ziri ezi. Onye ahụ a mara ikpe pụrụ ịta ahụhụ dị ukwuu ka ọ na-anọzu oge mkpọrọ ya, ma ọ̀ pụrụ izi ezi ịta ọkàikpe ahụ ụta na ọ bụ ya kpataara ya ahụhụ ahụ ọ na-ata? Ọ dịghị ma ọlị! Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ọ bụ Jehova na-akpata ajọ omume. Jems 1:13 na-ekwu, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” Ka anyị chetakwa na Jehova kwupụtara amamikpe a ‘ná ndabere nke olileanya.’ O jiriwo ịhụnanya meere ndị na-ekwesị ntụkwasị obi sitere n’eriri Adam na Iv ndokwa ịhụ njedebe nke ihe efu na inwe obi ụtọ inweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” Ruo mgbe nile ebighị ebi, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-echegbu onwe ha na ihe nile e kere eke ga-adaba ọzọ n’ọnọdụ na-egbu mgbu nke ihe efu. Jehova ime ihe n’ụzọ ziri ezi ga-emeworị ka a mara oruru o ruuru ya ịbụ eze ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 25:8.

  • Mee Jehova Obi Ike Gị
    Ụlọ Nche—2003 | Septemba 1
    • • Olee otú Devid si gosi na ya mere Jehova obi ike ya?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya