-
Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya AnyịỤlọ Nche—2012 | Mach 15
-
-
8. Dị ka e kwuru na Jud 24, gịnị gosiri na a na-enwe ọṅụ n’eluigwe mgbe otu n’ime ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ?
8 N’eziokwu, ezi Ndị Kraịst e tere mmanụ chọrọ ka Chineke chebe ha ka ha ghara ịsụ ngọngọ, nke ga-eme ka e bibie ha. Ha nwere olileanya na Jizọs Kraịst ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ka ha bụrụ ndị mmụọ zuru okè, nke ga-eme ka ha nwee ike iji oké ọṅụ gaa n’ihu Chineke. Ọ bụrụ na onye e tere mmanụ ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, o doro anya na ‘a ga-akpọlite ya dị ka ahụ́ nke mmụọ,’ ‘n’ereghị ure, n’ebube.’ (1 Kọr. 15:42-44) Ọ bụrụ na e nwere “ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ,” chegodị ụdị ọṅụ a ga-enwe n’eluigwe mgbe otu n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ jechara ozi ya n’ikwesị ntụkwasị obi n’ụwa. (Luk 15:7) Jehova na ndị mmụọ ozi ga-eso onye e tere mmanụ ṅụrịa ọṅụ mgbe onye ahụ ga-eji ‘oké ọṅụ’ nata ụgwọ ọrụ ya.—Gụọ 1 Jọn 3:2.
-
-
Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya AnyịỤlọ Nche—2012 | Mach 15
-
-
IHE MERE ATỤRỤ ỌZỌ ‘JI NWEE OLILEANYA’
-