Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ònye Na-akpụzi Echiche Gị?
    Ụlọ Nche—1999 | Eprel 1
    • Ya mere, Pọl rịọrọ ndị Kraịst ibe ya ka ha ghara ‘ikwe ka e mee ka ha yie ajọ oge a.’ (Ndị Rom 12:2) Otu onye nsụgharị Bible degharịrị okwu Pọl n’ụzọ dị otú a: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụzie gị otú o si chọọ.” (Ndị Rom 12:2, Phillips) Setan ga-anwa ihe ọ bụla ọ pụrụ ime iji manye gị ịdị otú o si chọọ, dị ka ọkpụite nke oge ochie bụ́ onye sụnyejuru ụrọ n’ime ihe e ji akpụ ite iji nweta akara na njimara ndị ọ chọrọ ka ha dị n’ahụ ya. Setan emewo ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, okpukpe, na ntụrụndụ nke ụwa dị njikere ime nke ahụ. Olee nnọọ ókè mmetụta ya gbasarurula? Ọ gbasaruru ebe nile dị ka ọ gbasara n’ụbọchị Jọn onyeozi. “Ụwa dum,” ka Jọn kwuru, “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; leekwa 2 Ndị Kọrint 4:4.) Ọ bụrụ na i nwere obi abụọ ọ bụla banyere ikike Setan nwere ịrafu ndị mmadụ ma merụọ echiche ha, cheta otú o si mee nke a n’ụzọ dị irè n’ebe otu mba nke jupụtara nnọọ ná mmadụ, bụ́ Israel nọ, bụ́ ndị raara onwe ha nye Chineke. (1 Ndị Kọrint 10:6-12) Otu ihe ahụ ọ̀ pụrụ ime gị? Ọ pụrụ ma ọ bụrụ na i ghewe uche gị oghe nye mmetụta na-arafu arafu nke Setan.

  • Ònye Na-akpụzi Echiche Gị?
    Ụlọ Nche—1999 | Eprel 1
    • Ọ dịịrị gị ime nhọrọ. Ị pụrụ ịhọrọ ịbụ onye ‘e mere ka o yie ajọ oge a’ site n’ikwe ka nkà ihe ọmụma ụwa a na ihe ndị o ji kpọrọ oké ihe chịkwaa echiche gị. (Ndị Rom 12:2) Ma ụwa a ebughị ọdịmma gị n’obi. Ya mere, “Lezienụ anya,” ka Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị, “ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe.” (Ndị Kọlọsi 2:8) Ịbụ onye a kpụzigharịrị otú Setan si chọọ n’ụzọ a, ma ọ bụ onye ‘ọ na-ezu n’ohi,’ adịghị ewe mgbalị ọ bụla. Ọ dị ka anwụrụ ọkụ e kupụrụ ekupụ. Ọ pụrụ imetụta gị nanị site n’ikuru ikuku ahụ e merụrụ emerụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya