Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
    Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 15
    • Iji Ihe Ọma Na-emeri Ihe Ọjọọ

      13, 14. (a) Olee ihe mere na mkpagbu ndị iro na-akpagbu anyị anaghị atụ anyị n’anya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi na-agọzi ndị na-akpagbu anyị?

      13 Gụọ Ndị Rom 12:14, 21. Ebe ọ bụ na obi siri anyị nnọọ ike na Jehova ga-emezu ihe niile bụ́ nzube ya, anyị kwesịrị ịna-arụsi ọrụ o nyere anyị ike, ya bụ, izisa ozi ọma “alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Anyị ma na ọrụ a anyị na-arụ ga-akpasu ndị iro anyị iwe, n’ihi na Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Ya mere, ọ naghị atụ anyị n’anya na a na-akpagbu anyị, anyị anaghịkwanụ ada mba n’ihi ya. Pita onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-ere n’etiti unu, nke na-ere ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụtụbeghị na-adakwasị unu. Kama nke ahụ, na-aṅụrịnụ ọṅụ, ebe unu bụ ndị na-eketa òkè n’ahụhụ nke Kraịst.”—1 Pita 4:12, 13.

  • “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
    Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 15
    • 15. Olee ụzọ kacha mma anyị ga-esi jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ?

      15 Ya mere, ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme ihe amaokwu ikpeazụ dị ná Ndị Rom isi iri na abụọ kwuru. Ọ sịrị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kpatara ihe ọjọọ niile. (Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19) N’ọhụụ e mere ka Jọn hụ, Jizọs kwuru na ụmụnna ya e tere mmanụ ‘meriri Setan n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na n’ihi okwu ha gbara àmà ya.’ (Mkp. 12:11) Nke a na-egosi na ụzọ kacha mma anyị ga-esi merie Setan na ihe ọjọọ niile ọ na-akpatara anyị n’ụwa a bụ ime ihe ọma site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya