Ị̀ Na-echeta?
Ì jiriwo nlezianya chebara mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche echiche? Ya bụrụ otú ahụ, ma eleghị anya, ị ga-enwe ike icheta ihe ndị a sonụ:
◻ Ụfọdụ n’ime ndị Kraịst e tere mmanụ hà ga-adị ndụ gabiga “oké mkpagbu” ahụ wee dịrị ndụ n’elu ala ruo nwa oge tupu a kpọgoo ha n’eluigwe?—Mkpughe 7:14.
Bible ekwughị ihe ọ bụla hoo haa banyere nke a. Ihe ndekọ ụfọdụ dị na Bible yiri ka hà na-atụ aro na ndị e tere mmanụ pụrụ ịdị ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ. Otú ọ dị, ọtụtụ nde n’ime ndị ahụ nwere olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala anatawo ọzụzụ nke dị mkpa iji duzie ụwa ọhụrụ ahụ. Ya mere, ihe nta ahụ fọdụrụnụ agaghị adị mkpa maka ọrụ nke a, Chineke pụkwara ịkpọgo ha n’eluigwe maka “ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ” mgbe e mezusịrị ihe e kpere n’ikpe n’isi nwanyị okpukpe ahụ na-akwa iko, bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 18:2, 10; 19:2, 7, 8)—8/15, peji 31.
◻ Olee ihe ndị kwesịrị ịkpali nwoke bụ onye Kraịst inwe ọchịchọ obi nke ịghọ onye nlekọta? (1 Timoti 3:1)
Mmadụ kwesịrị ime mgbalị iji ruo eru ịbụ onye nlekọta, na-eme otú ahụ n’obi dị umeala n’ihi na ọ chọrọ ijere ndị ọzọ ozi. Mgbe ezi nzube si otú a kwalie ya, ihe omume nke a o mere pụrụ iwetara ndị nile o metụtara ngọzi ime mmụo.—9/1, peji 18.
◻ N’ihi gịnị ka a na-akụdaghị Pọl onyeozi aka n’agbanyeghị ihe nile ọ na-aghaghị ịnagide?
Pọl kọwara, si: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Ọ dịghị mgbe ọ bụla Pọl nwara ibu ibu arọ ya nile nanị ya, Kama nke ahụ, o legaara Jehova anya ka ọ kwadoo ya. (Abụ Ọma 55:22)—9/1, peji 30.
◻ Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ okwu Pọl ahụ nke dị ná Ndị Efesọs 4:26: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe”?
Okwu ndị a na-egosi na ọ dị mgbe ọ pụrụ izi ezi ka mmadụ wee iwe, ma mgbe nke a mere, onye ahụ ekwesịghị ịnọgịde ‘ná mkpasu iwe ruo mgbe anyanwụ dara.’ (Ndị Efesọs 4:26) N’ihi gịnị? N’ihi na nke a ga-enye Ekwensu ohere iji onye ahụ mee ihe, ma eleghị anya na-akpali ya ime ajọ ihe, ka o wee nweta nkatọ nke Chineke. (Abụ Ọma 37:8,9)—9/15, peji 21.
◻ Nnukwute ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti ụzọ Ndịàmà Jehova si ezi ihe na ụzọ ndị ụkọchukwu Krisendọm si ezi?
Ndịàmà Jehova na-ezi ihe site n’ikike nke Okwu Chineke, ebe ndị ụkọchukwu Krisendọm na-eme ka ozizi ha dabere n’omenala okpukpe nke ndị na-efe arụsị, ndị sitere na Babilọn na Ijipt.—10/1, peji 25.
◻ Olee ihe kasị mkpa mere Ọkpara Chineke ji bịa n’elu ala?
Jisọs bịara n’elu ala ná nzube bụ isi nke idozi ihe iseokwu ahụ Setan welitere n’ihe banyere ịbụ ọkaaka nke Jehova.—10/15, peji 13.
◻ N’ịkpọ ndị ọchịchị nkịtị “ndị na-achị isi n’elu,” ọ̀ dị ụzọ ọ bụla anyị si na-ewepụ ihe ná nsọpụrụ nke ruuru Jehova? (Ndị Rom 13:1)
Ee e, ebe ọ bụ na Jehova dị elu nke ukwuu karịa ịbụ nanị ‘Onye ka elu.’ Ọ bụ “Onyenwe anyị,” “Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.” (Abụ Ọma 73:28; Daniel 7:18, 22) Ndị ọchịchị nkịtị bụ ndị ka elu nanị n’ihe banyere ụmụ mmadụ ndị ọzọ nakwa n’ihe banyere ihe omume nke ha. Ọ bụ ọrụ dịịrị ha ịchịkwa na ichebe ógbè dị iche iche.—11/1,peji 12.
◻ N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ nke kasị elu n’ime mkpụrụ itoolu nke mmụọ Chineke ndị e hotara ná Ndị Galetia 5:22, 23?
Mkpụrụ asatọ ndị nke ọzọ nke mmụọ Chineke bụ ngosipụta, ma ọ bụ akụkụ dị iche iche, nke ịhụnanya, bụ́ nke e bu ụzọ hota. Mkpụrụ nile ọzọ ndị a nke mmụọ ahụ bụkwa àgwà ndị dị mkpa, ma ha agaghị abara anyị uru ọ bụla ma ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:3)—11/15, peji 14.
◻ Gịnị bụ abamuru ndị dị n’ikpe ekpere maka ndị kwere ekwe ibe anyị?
Mgbe anyị mere ka ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ bụrụ nchegbu anyị site n’ekpere, a na-adọrọ anyị bịa nso ebe ha nọ n’ịhụnanya ụmụnna. Anyị na-enwekwa ọmịiko n’ebe ha nọ, na-ekere òkè n’ihe ndị na-amasị ha na ná mkpagbu ha nile. Otú a, a na-ewepụ obi ilu ọ bụla, na-enye ohere maka echiche ndị na-ewuli elu, ndị na-eme ka anyị bụrụ ndị na-ahụ n’anya na ndị nwere ọṅụ.—11/15, peji 21,22.
◻ Gịnị bụ ihe ndị mere o ji dị mkpa na anyị aghaghị ife Jehova Chineke?
Anyị kwesịrị ife Jehova n’ihi na ọ bụ Onye Okike, àgwà ya nile na-adọtakwa anyị nso n’ebe ọ nọ. (Deuterọnọmi 32:3,4; 1 Jọn 4:8; Mkpughe 10:6) Bible na-asị: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ọ dịghị chi ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Jehova, nke pụrụ ikwe nkwa ụgwọ ọrụ dị otú ahụ, mezuokwa nkwa ya.—12/1, peji 6, 7.