“Ọ Bụrụ na I Ji Ụgwọ Ụtụ Isi, Kwụọ Ụgwọ Ụtụ Isi”
“N’ỤWA a ọ dịghị ihe e ji n’aka e wezụga ọnwụ na ụtụ isi.” Otú ahụ ka nwa amaala America na narị afọ nke 18 na onye nchọpụta ihe bụ́ Benjamin Franklin kwuru. Okwu ya, nke a na-ehotakarị, na-egosipụta ọ bụghị nanị na ụtụ isi bụ ihe a na-apụghị izere ezere kamakwa ụjọ nke ha na-akpalite. Nye ọtụtụ ndị, ịtụ ụtụ isi adịghị atọ ụtọ dị nnọọ ka ịnwụ anwụ na-adịghị atọ.
Ọ bụ ezie na ịtụ ụtụ isi pụrụ ịbụ ihe na-adịghị atọ ụtọ, nke a bụ ibu ọrụ ezi ndị Kraịst ji na-akpọrọ ihe nke ukwuu. Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom, sị: “Nye onye ọ bụla ihe i ji ya n’ụgwọ: Ọ bụrụ na i ji ụgwọ ụtụ isi, kwụọ ụgwọ ụtụ isi; ọ bụrụ ụtụ ahịa, mgbe ahụ ụtụ ahịa; ọ bụrụ nkwanye ùgwù, mgbe ahụ nkwanye ùgwù; ọ bụrụ nsọpụrụ, mgbe ahụ nsọpụrụ.” (Ndị Rom 13:7, New International Version) Jisọs Kraịst na-ezokwa aka kpọmkwem n’ebe ụtụ isi dị mgbe ọ sịrị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.”—Mak 12:14, 17.
Jehova ekwerewo ka ndị gọọmenti “na-achị isi” dịrị ma chọọ ka ndị ohu ya na-erubere ha isi ruo n’ókè ụfọdụ. Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka Chineke ji kwusie ike na ndị na-efe ya ofufe ga-atụ ụtụ isi? Pọl kwuru ihe atọ bụ isi kpatara ya: (1) “iwe” nke “ndị na-achị isi” n’ịta ndị na-emebi iwu ahụhụ; (2) akọ na uche onye Kraịst, nke na-agaghị adị ọcha ma ọ ghọọ aghụghọ n’ụtụ isi ya; (3) mkpa nke ịkwụ ndị a ‘na-ejere ọha ozi’ ụgwọ n’ihi ije ozi dị iche iche na ịhụ na a nọgidere na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị n’usoro. (Ndị Rom 13:1-7) Ọtụtụ nwere ike ha agaghị enwe mmasị ịtụ ụtụ isi. Ma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-ahọrọ ya kama ibi n’ala ebe a na-enweghị ndị uwe ojii ma ọ bụ nchebe pụọ n’ọkụ, ndị na-edozi ụzọ, ụlọ akwụkwọ ọha mmadụ, usoro mbugharị ozi. Ọkà ikpe bụ́ onye America bụ́ Oliver Wendell Holmes nwere mgbe o tinyere ya otú a: “Ụtụ isi bụ ihe anyị na-akwụ maka ọha mmadụ na-akpazi àgwà.”
Ịtụ ụtụ isi abụghị ihe ọhụrụ nye ndị ohu Chineke. Ndị bi n’Israel oge ochie tụrụ otu ụdị ụtụ isi iji kwadoo ndị eze ha, ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị ndị ahụ bogbukwara ndị ahụ n’ibu arọ site n’ịchọ ụtụ isi na-enweghị isi. Ndị Juu tụkwara ụtụ ahịa na ụtụ isi nye ike ọchịchị ndị ala ọzọ chịrị ha, dị ka Ijipt, Peasia, na Rom. Ya mere ndị Kraịst n’ụbọchị Pọl maara nke ọma ihe ọ na-ekwu banyere ya mgbe o kwuru banyere ịtụ ụtụ isi. Ha maara na ma ụtụ isi ndị ahụ hà bụ nke ezi uche dị na ha ma ọ bụ na ha abụghị, n’agbanyeghịkwa ụzọ gọọmenti chọrọ isi jiri ego a mee ihe, ha aghaghị ịtụ ụtụ isi ọ bụla ha ji ụgwọ ya. Otu ihe ahụ dịkwaara ndị Kraịst taa. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị dị aṅaa pụrụ inye anyị nduzi mgbe anyị na-atụ ụtụ isi anyị n’oge ndị a siri ike?
Ụkpụrụ Ise Na-enye Nduzi
Dị n’usoro. Anyị na-efe, na-eṅomikwa Jehova, onye na-abụghị “Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33; Ndị Efesọs 5:1) Ịdị n’usoro dị oké mkpa mgbe a bịara n’ịtụ ụtụ isi. Ihe ndekọ gị hà zuru ezu, zie ezi, bụrụkwa nke a haziri ahazi? Usoro itinye ihe na faịlụ nke dị oké ọnụ adịkebeghị mkpa. Ị pụrụ inwe otu faịlụ e nyere aha maka ụdị ihe ndekọ nke ọ bụla (dị ka risit ndị na-egosi ụdị mmefu nile i mere). Ọ pụrụ izu ezu ịchịkọta ndị a na faịlụ ndị buru ibu maka afọ nke ọ bụla. N’ọtụtụ ala ọ dị mkpa idebe faịlụ ndị dị otú ahụ ruo ọtụtụ afọ a dị ama ama gọọmenti ekpebie inyochagharị ihe ndekọ ndị gara aga. Ya mere atụfula ihe ọ bụla ruo mgbe i ji n’aka na ọ dịkwaghị mkpa.
Na-eme ihe n’eziokwu. Pọl dere, sị: “Na-ekpenụ ekpere banyere anyị: n’ihi na e mere ka anyị kwenye na anyị nwere akọ na uche ọma, ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Ọchịchọ si n’obi ime ihe n’eziokwu kwesịrị iduzi mkpebi ọ bụla anyị na-eme mgbe anyị na-atụ ụtụ isi anyị. Nke mbụ, tụlee ụtụ isi ndị a ga-atụ maka ego a rụtara nke e kwesịrị idebanye n’akwụkwọ. N’ọtụtụ ala, ego ndị ọzọ a rụtara—site n’ego mmiri oyi, ọrụ ndapụta, ire ahịa—bụ nke a ga-atụrụ ụtụ isi ozugbo ha gafere otu ọnụ ego kpọmkwem. Onye Kraịst nwere “akọ na uche ọma” ga-achọpụta ihe mejupụtara ego nrụta a ga-atụrụ ụtụ isi n’ebe o bi ma tụọ ụtụ isi ahụ kwesịrịnụ.
Nke abụọ, e nwere okwu nke isepụ ego. Gọọmenti na-enyekarị ndị na-atụ ụtụ isi ohere isepụ mmefu ego ụfọdụ site n’ego nrụta ha ga-atụrụ ụtụ isi. N’ụwa nke a nke emeghị ihe n’eziokwu, ọtụtụ adịghị ahụ ihe ọjọọ ọ bụla ‘n’imepụta ihe’ ma ọ bụ “ichepụta ihe” mgbe ha na-azọrọ ego nsepụ ndị a. Otu nwoke na United States ka a sịrị na ọ zụụrụ nwunye ya uwe kootu e ji ájị́ anụ mee, wee kowe ya n’ụlọ ọrụ ya ruo otu ụbọchị ka o wee nwee ike isepụ ego ya dị ka otu ụdị nke “ihe ịchọ mma” maka ụlọ ọrụ ahụ! Nwoke ọzọ zọọrọ mmefu ego agbamakwụkwọ nwa ya nwanyị dị ka ego a ga-esepụ n’azụmahịa ya. Onye ọzọkwa nwara isepụ mmefu dị iche iche nke njem nwunye ya so ya mee ruo ọtụtụ ọnwa gaa n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ọ bụ ezie na ọ gara ebe ahụ n’ezie maka nnọkọ ọha na eze na ntụrụndụ. O yiri ka e nweghị ọgwụgwụ nye ihe ndị dị otú ahụ. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ịkpọ ihe ego nsepụ azụmahịa mgbe ọ na-abụghị ihe yiri ya ma ọlị bụ otu ụdị nke ịgha ụgha—ihe Chineke anyị, bụ́ Jehova, kpọrọ asị nke ukwuu.—Ilu 6:16-19.
Dị akọ. Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” (Matiu 10:16) Okwu ndụmọdụ ahụ pụkwara imetụta àgwà anyị dị iche iche banyere ịtụ ụtụ isi. Karịsịa ná mba ndị mepere emepe, ọtụtụ mmadụ karị n’ụbọchị ndị a na-akwụ ụlọ ọrụ ngụzi ego ma ọ bụ ndị ọkachamara ụfọdụ ụgwọ ịkwadebe ụtụ isi ha. Mgbe ahụ nanị ihe ha na-eme bụ ịbịanye aka na fọm ndị ahụ ma ziga akwụkwọ ndọrọ ego n’ụlọ akụ̀. Nke a ga-abụ oge dị mma iji ịdọ aka ná ntị ahụ e dekọrọ n’Ilu 14:15 mee ihe: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”
Ọtụtụ ndị na-atụ ụtụ isi enwewo nsogbu n’ebe ndị gọọmenti nọ n’ihi na ha ‘kwenyere okwu nile ọ bụla’ nke onye ngụzi ego dị arụrụala ma ọ bụ onye nkwadebe ụtụ isi nke na-enweghị ahụmahụ. Lee ka o si ka mma inwe ezi uche! Ghọta ijeụkwụ gị site n’iji nlezianya gụọ akwụkwọ ọ bụla tupu ị bịanye aka na ya. Ọ bụrụ na ihe ụfọdụ e debanyere, a hapụrụ, ma ọ bụ e sepụrụ eyie gị ihe na-edoghị anya, mee ka a kọwaa ya—ugboro ugboro ma ọ dị mkpa—ruo mgbe afọ juru gị na okwu ahụ bụ nke ịkwụwa aka ọtọ na nke kwekọrọ n’iwu. N’eziokwu, n’ọtụtụ ala iwu ụtụ isi aghọwanyewo nke dị mgbagwoju anya, ma ruo n’ókè o kwere omume, ọ bụ ụzọ nke amamihe ịghọta ihe ọ bụla ị na-abịanye aka na ya. N’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ ịhụ na onye Kraịst ibe gị nke maara iwu ụtụ isi pụrụ inye gị nghọta ụfọdụ. Otu onye Kraịst bụ́ okenye nke na-ahụ maka ihe metụtara ụtụ isi dị ka ọkà iwu kwuru ná nchịkọta, sị: “Ọ bụrụ na onye ngụzi ego gị atụọ aro ihe yiri ihe mabigara mma ókè ịbụ eziokwu, mgbe ahụ ma eleghị anya ọ bụghị eziokwu!”
Na-eji ihe akpọrọ ihe. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Galetia 6:5) Mgbe a bịara n’ịtụ ụtụ isi, onye Kraịst ọ bụla aghaghị iburu ibu ọrụ nke ime ihe n’eziokwu na ime ihe iwu chọrọ. Nke a abụghị okwu nke ndị okenye ọgbakọ ga-elekwasị ìgwè atụrụ ha na-elekọta anya banyere ya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 1:24.) Ha adịghị etinye onwe ha n’okwu ụtụ isi ọ gwụla ma okwu nke ajọ mmehie ihe, ma eleghị anya na-agụnye akụkọ ọjọọ n’ógbè, abara ha ntị. N’ozuzu ya, nke a bụ akụkụ ebe onye Kraịst ọ bụla na-ebu ibu ọrụ nke iji akọ na uche nke ya a zụrụ nke ọma mee ihe n’itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. (Ndị Hibru 5:14) Nke a gụnyere ịmata na ịbịanye aka n’akwụkwọ ụtụ isi—n’agbanyeghị onye kwadebere ya—pụrụ nnọọ ịbụ okwu iwu kwadoro nke na ị gụwo akwụkwọ ahụ kwetakwa na ihe dị na ya bụ eziokwu.a
Bụrụ onye a na-adịghị akalu. Ndị nlekọta ndị Kraịst aghaghị ịbụ ndị “a na-adịghị akalu” iji ruo eru maka ọkwá ha. N’otu aka ahụ, ọgbakọ dum kwesịrị ịbụ nke a na-adịghị akalu n’anya Chineke. (1 Timoti 3:2; tụlee Ndị Efesọs 5:27.) Ya mere ha na-agbalịsi ike ịnọgide na-enwe aha ọma n’ógbè ha, ọbụna mgbe a bịara n’ịtụ ụtụ isi. Jisọs Kraịst n’onwe ha setịpụrụ ihe nlereanya n’akụkụ nke a. A jụrụ onye na-eso ụzọ ya bụ́ Pita ma Jisọs ọ na-atụ ụtụ ụlọ nsọ, obere okwu banyere ọkara otu shekel [drachma abụọ]. N’ezie, Jisọs nweere onwe ya pụọ n’ụtụ isi nke a, ebe ọ bụ na ụlọ nsọ ahụ bụ ụlọ Nna ya, ọ dịghịkwa eze nke na-ana nwa nke ya ụtụ isi. Jisọs kwuru nke ahụ; ma ọ tụrụ ụtụ isi ahụ. N’ezie, ọbụna na o jiri otu ọrụ ebube weta ego ahụ a chọrọ! Gịnị mere o ji tụọ ụtụ isi nke o nweere onwe ya pụọ na ya? Dị ka Jisọs n’onwe ya kwuru, ọ bụ “ka anyị wee ghara ime ka ha ma n’ọnyà”—Matiu 17:24-27.b
Nọgide Na-enwe Aha Ọma nke Na-asọpụrụ Chineke
Ndịàmà Jehova taa n’otu aka ahụ na-echegbu onwe ha ka ha ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na dị ka otu ìgwè, ha na-enwe aha ọma gburugburu ụwa dị ka ụmụ amaala na-eme ihe n’eziokwu, ndị na-atụ ụtụ isi. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ Spain bụ́ El Diario Vasco kwuru banyere nzere ọha mmadụ na-ezere ịtụ ụtụ isi na Spain, ma kwuo, sị: “Nanị ndị pụrụ iche [bụ] Ndịàmà Jehova. Mgbe ha zụrụ ma ọ bụ ree ihe, ihe ha kwuru bụ ọnụ ahịa [ala] ahụ bụ kpọmkwem eziokwu.” N’otu aka ahụ, akwụkwọ akụkọ United States bụ́ San Francisco Examiner kwuru n’afọ ụfọdụ gara aga, sị: “Ị pụrụ ile [Ndịàmà Jehova] anya dị ka ụmụ amaala a ga na-eṅomi. Ha dị uchu n’ịtụ ụtụ isi, ilekọta ndị ọrịa, ịlụso amaghị agụ na amaghị ede ọgụ.”
Ọ dịghị ezi onye Kraịst ga-achọ ime ihe ọ bụla ga-etetọ aha ọma nke a siri ike nnweta. Ọ bụrụ na nhọrọ echee gị ihu, ị̀ ga-achọ ka a mara gị dị ka onye na-aghọ aghụghọ n’ụtụ isi n’ihi ichekwa ego ụfọdụ? Ee e. N’ezie kama nke ahụ ị ga-achọ ka ego funahụ gị kama imetọ aha ọma gị ma tinye ụkpụrụ ọma ndị i nwere na ọbụna ofufe ị na-efe Jehova n’ile anya ọjọọ.
N’eziokwu, ịnọgide na-enwe aha ọma dị ka onye ziri ezi, na-eme ihe n’eziokwu pụrụ iwe gị ego mgbe ụfọdụ. Dị ka onye ọkà ihe ọmụma Grik oge ochie ahụ bụ́ Plato kwuru na narị afọ 24 gara aga: “Mgbe e nwere ụtụ isi ego a rụtara, onye ziri ezi ga-akwụ karịa ebe onye na-ezighị ezi ga-akwụ ihe dị ala karị n’otu ọnụ ego a rụtara.” Ọ pụrụ ịgbakwụnyewo na onye ziri ezi adịghị mgbe ọ na-akwa ụta ịkwụ ọnụ ego ahụ maka ịbụ onye ziri ezi. Ọbụna inwe aha ọma dị otú ahụ na-akwụghachi ụgwọ ihe ọ na-efu. Nke a n’ezie bụ eziokwu nye ndị Kraịst. Aha ọma ha dị oké ọnụ ahịa nye ha n’ihi na ọ na-asọpụrụ Nna ha nke eluigwe, ọ pụkwara inye aka ịdọta ndị ọzọ nso n’ụzọ ndụ ha na n’ebe Chineke ha, bụ́ Jehova, nọ.—Ilu 11:30; 1 Pita 3:1.
Ma, karịsịa ihe nile, ezi ndị Kraịst na-ewere mmekọrịta ha na Jehova n’ihe bara uru. Chineke na-ahụ ihe nile ha na-eme, ha na-achọsikwa ike ime ihe na-atọ ya ụtọ. (Ndị Hibru 4:13) Ya mere, ha na-ajụ ọnwụnwa nke ịnwa ịghọ gọọmenti aghụghọ. Ha matara na Chineke na-enwe mmasị n’àgwà nke ime ihe n’eziokwu, nke ime ezi omume. (Abụ Ọma 15:1-3) Ebe ọ bụkwanụ na ha chọrọ ime ka obi Jehova ṅụrịa, ha na-atụ ụtụ isi nile ha ji ụgwọ ya.—Ilu 27:11; Ndị Rom 13:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke a pụrụ iweta ihe ịma aka nye onye Kraịst so di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe tinyekọọ akwụkwọ nnaraghachi ego ụtụ isi. Nwunye ahụ bụ́ onye Kraịst ga-eme mgbalị si n’ezi obi idebe ụkpụrụ ịbụ isi na mkpa nke irubere iwu ụtụ isi nke Siza isi n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Ma, o kwesịrị ịmara ihe ndị dị n’iwu pụrụ isi n’ilezi anya bịanye aka n’ihe ndekọ ụgha pụta.—Tụlee Ndị Rom 13:1; 1 Ndị Kọrint 11:3.
b N’ụzọ na-adọrọ mmasị, nke Matiu bụ nanị Oziọma nke dekọrọ ihe omume nke a n’oge ndụ elu ala nke Jisọs. Dị ka onye ọna ụtụ na mbụ n’onwe ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmụọ Jisọs gosipụtara n’okwu a masịrị Matiu.