Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
SEPTEMBA 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 1-2
“Gbalịa Dịrị Umeala n’Obi Ka Esta”
Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ
11 Ọ bụrụ na e towe anyị gabiga okè, o nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi. Ka anyị lee ihe Esta mere mgbe ọnọdụ ya gbanwere. Ọ mara mma dị egwu. E dowekwara ya ebe a na-elekọta ya, na-enyekwa ya ihe ahụ́ ya chọrọ ruo otu afọ. O so n’ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ si ebe dị iche iche n’Alaeze Peshia nọkọta ọnụ na-ejike ka a mara onye nke eze Peshia ga-alụ. N’agbanyeghị ihe a, onwe ya ebughị ya isi, ọ nọkwa na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. O bidoghịkwa dịwa mpako mgbe eze mechara họrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya.—Esta 2:9, 12, 15, 17.
Ọ Gbachiteere Ndị Chineke
15 Mgbe oge ruru ka a kpọga Esta n’ihu eze, a gwara ya ka o were ihe ọ bụla o chere dị ya mkpa. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ a gwara ya were bụ ihe ọ ga-eji chọkwuo onwe ya mma. Ma, ebe ọ bụ na Esta abụghị onye oké ọchịchọ, ọ rịọghị ka e nyekwuo ya ihe ndị ọzọ ma e wezụga ndị nke Hegaị gwara ya were. (Esta 2:15) Ọ ga-abụ na ọ ghọtara na ihe ga-eme ka eze nwee mmasị n’ebe ọ nọ abụghị naanị mma ya. Ọ ma na ihe ga-aka amasị eze bụ ịdị umeala n’obi ya. Nke a ọ̀ bụ eziokwu?
Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ
12 Anyị dịrị umeala n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-eji ejiji, na-akpakwa àgwà otú ga-egosi na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Kama ịna-etu ọnụ ma ọ bụ ịna-eme ka a hụchata anyị, ka anyị cheta na ihe ga-eme ka ihe anyị na-amasị ndị ọzọ bụ ma anyị nwee ‘mmụọ dị jụụ, dịkwa nwayọọ.’ (Gụọ 1 Pita 3:3, 4; Jere. 9:23, 24) Ọ bụ otú anyị si ekwu okwu ma ọ bụ otú anyị si eme ka e si ama ma onwe anyị ọ̀ na-ebu anyị isi. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike malite ịna-agwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ, otú anyị si mara ihe na-aga n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ otú anyị na ụmụnna ndị a ma ama si bụrụ enyi. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike ikwu okwu otú ga-eme ka ndị ọzọ towe naanị anyị maka ihe anyị na ndị ọzọ mere. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Jizọs. Ebe o si nweta ọtụtụ n’ime ihe ndị o kwuru bụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O kwuru ihe ndị a otú ga-eme ka ndị na-ege ya ntị mata na ha si n’aka Jehova, ọ bụghị n’echiche nke onwe ya.—Jọn 8:28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Maara?
Ndị na-eme nchọpụta hụrụ ihe ndị Peshịa ji ụdị ide ihe a na-akpọ kunifọm dee banyere otu nwoke a kpọrọ Marduka. (Otú e si ede ya n’Igbo bụ Mọdekaị). Ọ bụ onye ọchịchị n’obodo Shushan. O nwere ike ịbụ onye na-agụkọ ego. Mgbe a hụrụ ihe ahụ ndị Peshịa dere, otu ọkachamara n’akụkọ gbasara ihe mere n’oge ochie, aha ya bụ Arthur Ungnad, kwuru na ‘e wepụ Baịbụl, ọ bụ naanị kunifọm ahụ bụ ebe ọzọ kwuru gbasara Mọdekaị.’
Kemgbe Ungnad dechara ihe ahụ, ndị ọkà mmụta asụgharịala ọtụtụ puku kunifọm ndị ọzọ bụ́ nke ndị Peshia. Ụfọdụ n’ime ha bụ mbadamba ụrọ ndị a hụrụ n’ebe bụ́bu obodo Pesepọlis. A hụrụ ha n’ebe a na-edowebu akụ̀, n’akụkụ mgbidi obodo ahụ. A chọpụtara na ọ bụ n’oge Zaksis nke Mbụ na-achị ka e dere ihe ndị dị ná mbadamba ụrọ ndị ahụ. E dere ha n’asụsụ ndị Elam. Ọtụtụ aha ndị dị n’akwụkwọ Esta dịkwa na ha.
Otu n’ime ha kwuru na Marduka bụ onye nsụgharị. Ihe ahụ o kwuru dabara adaba n’otú Baịbụl si kọwaa Mọdekaị. O jeere Eze Ahazuirọs (ya bụ, Zaksis nke Mbụ) ozi. Ọ na-asụkwa ọ dịkarịa ala, asụsụ abụọ. Mọdekaị na-anọkarị n’ọnụ ụzọ ámá eze n’obí eze dị na Shushan. (Esta 2:19, 21; 3:3) Ọnụ ụzọ ámá a bụ nnukwu ụlọ, bụrụkwa ebe ndị na-eje ozi n’obí eze na-anọ eje ozi.
E nwere ụzọ ndị pụrụ iche Marduka a a kpọrọ aha ya n’ihe ahụ e dere ná mbadamba ụrọ ndị ahụ si yie Mọdekaị e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ha dịrị ndụ n’otu oge, nwee otu ọkwá, rụọkwa otu ụdị ọrụ ahụ. O yiri ka ihe ndị a niile hà na-egosi na Marduka na Mọdekaị bụ otu onye ahụ.
SEPTEMBA 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 3-5
“Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịna-eme Ihe Niile Ha Nwere Ike Ime”
it-2 431 ¶7
Mọdekaị
O kweghị Akpọrọ Heman Isiala. Mgbe ihe a mechara, Ahazuirọs mere Heman onye agbụrụ Egag onye na-esote ya. Ahazuirọs nyere iwu ka ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá eze na-akpọrọ Heman ahụ o buliri n’ọkwá isiala. Ma Mọdekaị kpebisiri ike na ya agaghị akpọrọ Heman isiala n’ihi na ya bụ onye Juu. (Esta 3:1-4) Ebe ọ bụ na Mọdekaị kwuru na ihe mere ọ na-agaghị akpọrọ Heman isiala bụ n’ihi na ya bụ onye Juu, ọ pụtara na ọ bụ ezigbo onye Juu nke ji ofufe ọ na-efe Chineke ya bụ́ Jehova kpọrọ ihe. Mọdekaị ghọtara na ịkpọrọ Heman isiala abụghị naanị ịdara onye nọ n’ọkwá dị elu n’ala, otú ndị Izrel merela n’oge ndị gara aga naanị iji kwanyere onye na-achị ha ùgwù. (2 Sam. 14:4; 18:28; 1 Eze 1:16) Mana, e nwere ezigbo ihe mere ọ na-ekweghị akpọrọ Heman isiala. Ọ ga-abụ na Heman bụ onye Amalek. E nwekwara mgbe Jehova kwuru na ya “ga-alụso ha agha n’ọgbọ ha niile.” (Ọpụ. 17:16) N’ihi ya, Mọdekaị ghọtara na ịkpọrọ Heman isiala abụghị okwu gbasara naanị irubere onye na-achị achị isi kama ọ gbasara irubere Chineke ya isi.
it-2 431 ¶9
Mọdekaị
E Si n’Aka Ya Napụta Ndị Izrel. Mgbe e nyere iwu ka e bibie ndị Juu niile nọ n’ebe niile alaeze Peshia na-achị, Mọdekaị kwuru ihe gosiri na o nwere okwukwe na ihe mere Esta ji ghọọ nwunye eze n’oge ahụ bụ ka e nwee ike ịnapụta ndị Juu. Ọ gwara Esta nnukwu ọrụ o kwesịrị ịrụ, gwakwa ya ka ọ rịọ eze ka o meere ha amara ma nyere ha aka. Ọ bụ eziokwu na ihe a nwere ike ịta isi Esta, ma o kwetara ime ihe a gwara ya.—Esta 4:7–5:2.
Ọ Gbachiteere Ndị Chineke
22 Ọ ga-abụ na ụjọ jidere Esta mgbe ọ nụrụ ozi ahụ. Ọ bụ ugbu a ka ọ ga-edo anya ma okwukwe ya ò siri ike ma ọ bụ na o sighị. Ozi o zighachiiri Mọdekaị gosiri na ụjọ ji ya. O chetaara Mọdekaị iwu eze nyere, nke bụ́ na a ga-egbu onye ọ bụla gara n’ihu eze ma ọ bụrụ na eze akpọghị ya. Naanị ihe ga-azọ onye ahụ bụ ma eze setịara ya mkpanaka ọlaedo ya. Esta ọ̀ ga-atụwa anya na e nwere ike imere ya ebere ma ọ gaa n’ihu eze, nke ka nke ma o cheta ihe e mere Vashtaị mgbe ọ jụrụ ịbịa zaa eze òkù eze kpọrọ ya? Ọ gwara Mọdekaị na eze akpọbeghị ya ka ya bịa n’ihu ya kemgbe ụbọchị iri atọ. Òkù a eze na-akpọbeghị Esta mere ka Esta chewe ma ọ̀ ga-abụ na ihe ya adịkwaghị eze a na-ewekarị iwe ọkụ mma.—Esta 4:9-11.
23 Mọdekaị zighachiiri Esta ozi nke mere ka okwukwe Esta sikwuo ike. Ọ gwara ya na ọ bụrụ na o nweghị ihe o mere, na a ga-esi n’ebe ọzọ zọpụta ndị Juu. Ma olee otú Esta ga-esi chee na a ga-ahapụ igbu ya ma e gbuwe ndị Juu? Ihe a Mọdekaị kwuru gosiri na o nwere okwukwe na Jehova. Ọ ma na Jehova agaghị ekwe ka e gbukpọọ ndị na-efe ya, nkwa ndị O kwere agharazie imezu. (Jọsh. 23:14) Mọdekaị jụziri Esta, sị: “Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?” (Esta 4:12-14) Ọ̀ bụ na anyị enwesịghị iṅomi okwukwe Mọdekaị? Mọdekaị tụkwasịrị Chineke ya, bụ́ Jehova, obi ya niile. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, Ànyị tụkwasịrị Jehova obi otú ahụ?—Ilu 3:5, 6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ
14 Ndị Jehova taa na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka e kwe ha ife Chineke otú ọ chọrọ, otú ahụ Esta na Mọdekaị mere. (Esta 4:13-16) Ò nwere ihe i nwere ike ime ka e kwe ka anyị na-efe Chineke otú ọ chọrọ? Ee. I kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere ụmụnna anyị gọọmenti na-emekpọ ọnụ aka. Ụdị arịrịọ a ga-eme ka okwukwe ụmụnna anyị ndị a a na-emekpọ ọnụ na ndị ihe na-esiri ike, bụrụ a kwaa akwụrụ. (Gụọ Jems 5:16.) Jehova ọ̀ na-aza ụdị ekpere a? Ee. Ikpe ndị o mere ka e kpelaara anyị n’ụlọikpe na-egosi n’eziokwu na ọ naghị eji arịrịọ anyị rịọrọ maka ụmụnna anyị egwu egwu.—Hib. 13:18, 19.
SEPTEMBA 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 6-8
“Ihe Anyị Mụtara Gbasara Otú Anyị Ga-esi Na-agwa Ndị Ọzọ Okwu”
Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru
15 Otú ahụ Esta si nwee ndidi ma chere ka otu ụbọchị gafekwuo tupu ya agwa eze ihe ọ chọrọ ịgwa ya mere ka Heman jiri aka ya gbapuo onwe ya afọ. Í cheghị na ọ ga-abụ Jehova Chineke mere ka ụra pụọ eze n’anya n’abalị ahụ? (Ilu 21:1) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘na-echere’ Jehova. (Gụọ Maịka 7:7.) Ọ bụrụ na anyị echere Chineke, anyị ga-achọpụta na otú ọ ga-esi doziere anyị nsogbu anyị ga-aka mma karịa otú anyịnwa gaara esi edozi ya.
Ọ Katara Obi Kwuo Okwu
16 Esta agaghị anwa anwa hapụkwa ịgwa eze ihe ahụ ọ chọrọ ịgwa ya n’oriri nke abụọ a ọ kpọrọ ya. Ma olee otú ọ ga-esi agwa ya ihe ahụ? Ọ dabara na eze jụkwara ya ọzọ ihe ọ chọrọ ka e meere ya. (Esta 7:2) Oge eruola ka Esta kwuo okwu.
Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru
17 Weregodị ya na ị na-ahụ ka Esta bu ụzọ kpee ekpere n’obi ya, gwazie eze, sị: “Ọ bụrụ na ihe m dị gị mma, eze, ọ bụrụkwa na ọ dị eze mma, m na-arịọ ka e nye m mkpụrụ obi m, m na-arịọkwa ka e nye m ndị m.” (Esta 7:3) Ị̀ hụrụ na o mere ka eze mara na ya ma na eze ga-eme ihe ziri ezi? Esta gosiri na ya adịghị ka Vashtaị, onye bụ́bu nwunye eze, onye kpachaara anya menye eze ihere. (Esta 1:10-12) Ihe ọzọ bụ na Esta abịaghị tawa eze ụta maka na o weere Heman ka ezigbo mmadụ. Kama, ọ rịọrọ eze ka o mee ka a ghara igbu ya.
Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru
18 O doro anya na ihe ahụ Esta rịọrọ juru eze anya ma metụ ya n’obi. Olee onye ga-anwa anwa chọọ igbu nwunye eze? Esta gwakwara eze, sị: “E rewo anyị, mụ na ndị m, ka a laa anyị n’iyi, gbuo anyị ma bibie anyị. A sị na e rere anyị ka anyị ghọọ ndị ikom na-agba ohu na ndị inyom na-eje ozi, m gaara agbachi nkịtị. Ma ọdachi a ekwesịghị ekwesị ma ọ bụrụ na o mebiere eze ihe.” (Esta 7:4) Ị̀ hụrụ na Esta gwara eze hoo haa ihe bụ́ nsogbu ya, ma o kwukwara na ya gaara agbachi nkịtị ma a sị na ihe e kwuru bụ na ha ga-aghọ ndị ohu. Ọ bụrụ na eze agbachi nkịtị e gbukpọọ ndị Juu, ọ ga-emebiri ya ihe.
19 Otú Esta si kwuo okwu na-akụziri anyị otú anyị nwere ike isi gwa mmadụ okwu ya eruo ya n’obi. Ọ bụrụ na e nwere nsogbu ị chọrọ ịkọrọ onye ị hụrụ n’anya ma ọ bụ onye nọ n’isi ka o leba ya anya, ihe ga-enyere gị aka bụ inwe ndidi, ịkwanyere onye ahụ ùgwù na ịgwa ya hoo haa ihe dị gị n’obi.—Ilu 16:21, 23.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta
7:4—Olee otú ‘ihe ga-esi funahụ eze’ ma ọ bụrụ na e kpochapụ ndị Juu? Site n’iji akọ mee ka eze mara na e nwere ike ire ndị Juu dị ka ndị ohu, Esta mere ka o doo eze anya na igbu ha ga-efu ya ihe. Puku mkpụrụ ọlaọcha iri nke Heman kwere nkwa inye eze dị ala karịa ego ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na atụmatụ Heman bụ ka e ree ndị Juu dị ka ndị ohu. Ọ bụrụ na e mezuru atụmatụ ahụ, ọ ga-apụta na a ga-egbukwa nwunye eze.
SEPTEMBA 25–ỌKTOBA 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ESTA 9-10
“O Ji Ikike O Nwere Nyere Ndị Ọzọ Aka”
it-2 432 ¶2
Mọdekaị
Mọdekaị nọchiri Heman, bụrụzie onye na-esote eze. E nyekwara ya mgbaaka eze ji aka ihe akara. Esta gwara Mọdekaị ka o lekọtawa ụlọ Heman. Ọ bụ eze nyere Esta ụlọ ahụ. Mọdekaị jizi ikike eze nyere ya tie iwu ọhụrụ nke nyere ndị Juu ikike ịlụso ndị chọrọ ime ha ihe ọjọọ ọgụ. Ihe a mere ka ndị Juu nwee olileanya na a ga-azọ ha ndụ, o mekwara ha obi ụtọ. Ọtụtụ ndị nọ n’Alaeze Ukwu Peshia nọ na-akwado ndị Juu. N’abalị iri na atọ n’ọnwa Eda, bụ́ ụbọchị a ga-eme ihe iwu kwuru, ndị Juu ejikerela. Ndị isi niile nọ na-akwado ndị Juu n’ihi na Mọdekaị bụzi nnukwu mmadụ. Na Shushan, a lụrụ ọgụ ahụ ruo echi ya. E gburu ihe karịrị puku mmadụ iri asaa na puku ise (75,000) bụ́ ndị iro ndị Juu bi n’Alaeze Ukwu Peshia, ma ụmụ nwoke iri Heman mụrụ. (Esta 8:1–9:18) Mọdekaị nyere iwu ka a na-echeta abalị iri na anọ na abalị iri na ise n’ọnwa Eda n’afọ ọ bụla, ya bụ, ụbọchị Purim, ka ha bụrụ ụbọchị ha ga na-enwe aṅụrị, na-eri oriri, na-enyerịta ibe ha onyinye ma na-enye ndị ogbenye onyinye. Esta kwadoro iwu ahụ o nyere. Ndị Juu nabatakwara ya ma kpebie na ụmụ ha na ndị niile sonyeere ha ga na-echeta ụbọchị abụọ ahụ. Ebe Mọdekaị bụzi onye nke abụọ n’alaeze ukwu ahụ, ndị Juu, bụ́ ndị nyefere Chineke onwe ha, na-akwanyere Mọdekaị ùgwù, ọ nọkwa na-eme ihe na-abara ndị Juu uru.—Esta 9:19-22, 27-32; 10:2, 3.
it-2 716 ¶5
Purim
Ihe Mere E Ji Eme Ya. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl ekwuola na Ememme Purim ndị Juu na-eme n’oge a bụ omenala nkịtị, ọ bụchaghị ememme ha ji efe Chineke, mgbe ụfọdụkwa, a na-emefe ihe ókè ma e mewe ya, mana ọ dịghị otú ahụ mgbe a malitere ememme a. Mọdekaị na Esta bụ ndị na-efe ezi Chineke bụ́ Jehova, ọ bụkwa Jehova ka a na-emere ememme a n’oge mbụ. Ọ bụ Jehova Chineke napụtara ndị Juu mgbe a chọrọ igbukpọ ha maka na Mọdekaị ekweghị efe onye ọ bụla ọzọ ma ọ́ bụghị Jehova. Ọ ga-abụ na Heman bụ onye Amalek. Jehova bụkwara ndị Amalek ọnụ ma kwuo na ọ ga-ekpọchapụ ha. Mọdekaị rubeere Chineke isi ma kpebie na ọ gaghị akpọrọ Heman isiala. (Esta 3:2, 5; Ọpụ. 17:14-16) Ihe ọzọ bụ na ihe Mọdekaị gwara Esta (Esta 4:14) gosiri na o nwere olileanya na onye ka mmadụ ike ga-anapụta ndị Juu. Ọnụ Esta buru tupu ya agaa ịhụ eze ka ọ kpọọ ya ka ọ bịa oriri gosikwara na ọ rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka.—Esta 4:16.
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme Ihe
12 Jehova emewo ka e nwee ndị nlekọta maka ịdị na-edu ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 13:17) Ndị ikom a ruru eru kwesịrị iji ikike Chineke nyere ha na-eme ihe iji na-enye aka ahụ dị mkpa na iji na-eme òkè nke ha maka ọdịmma nke ìgwè atụrụ ahụ. Ọnọdụ ndị okenye nọ na ya ò nyere ha ikike ime ndị kwere ekwe ibe ha ka ọ bụ ha bụ ndị nwe ha? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dị mkpa ka ndị okenye jiri ịdị umeala n’obi na-ele ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Pita 5:2, 3) Bible na-agwa ndị nlekọta, sị: “[Na-azụnụ] ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Nke a bụ ezigbo ihe mere ha ga-eji na-emeso onye ọ bụla so n’ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro.
13 Anyị pụrụ isi otú a maa atụ ya. Otu ezigbo enyi gị gwara gị ka i lekọtara ya otu ihe onwunwe ya dị oké ọnụ ahịa. Ị maara na enyi gị mefuru ego buru ibu maka ihe ahụ. Ọ̀ bụ na ị gaghị eji ezi nlezianya lekọta ya ka ọ ghara imebi? N’otu aka ahụ, Chineke enyewo ndị okenye ọrụ ilekọta ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa n’ezie: ọgbakọ ya, bụ́ nke e ji ndị nọ na ya tụnyere atụrụ. (Jọn 21:16, 17) Jehova hụrụ atụrụ ya n’anya—n’ezie, ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu nke na o ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, zụta ha. Ọ dịghị ọnụ ahịa karịrị nke ahụ Jehova pụrụ ịkwụworị maka atụrụ ya. Ndị okenye dị obi umeala na-eburu nke ahụ n’uche ma na-emeso atụrụ Jehova ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta
9:9:10, 15, 16—Ọ bụ ezie na iwu ahụ kwadoro ha ịkwakọrọ ihe onwunwe, olee ihe mere na ndị Juu akwakọrọghị ihe onwunwe nke ndị ha gburu? Ọjụjụ ha jụrụ ime otú ahụ mere ka o doo anya na nzube ha bụ ichebe onwe ha ọ bụghị iji baa ọgaranya.
ỌKTOBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 1-3
“Nogide Na-egosi Otú Ị Hụruru Jehova n’Anya”
Ṅomie Okwukwe Noa, Daniel, Job, nakwa Otú Ha Si Rube Isi
16 Nsogbu ndị bịaara Job. E nwere ọtụtụ ihe gbanwere ná ndụ Job. Tupu nsogbu abịara ya, ọ bụ “onye kasị baa ọgaranya ná ndị Ọwụwa Anyanwụ niile.” (Job 1:3) Ọ bụ aka ji akụ̀, onye a ma ama, na onye a na-akwanyere ezigbo ùgwù. (Job 29:7-16) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, o cheghị na ọ ka ndị ọzọ mma, ma ọ bụkwanụ chee na o nweghị uru Chineke baara ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kpọrọ ya, “ohu m.” O kwukwara na ọ bụ ‘onye ezi omume, na ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.’—Job 1:8.
17 Ihe gbanwere ná ndụ Job n’otu ntabi anya. Ihe niile o nwere lara n’iyi, ya adaa mbà n’obi nke na ọ chọrọ ịnwụ. Anyị ma na onye kpatara nsogbu ya bụ onye nkwutọ, bụ́ Setan. O kwuru na Job na-efe Jehova naanị n’ihi ihe Jehova na-emere ya. (Gụọ Job 1:9, 10.) Jehova agbachighị nkịtị n’ebubo a. Kama, o nyere Job ohere ka o gosi na ọ tụkwasịrị ya obi, nakwa na ọ na-efe ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya.
Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
10 Olee otú ebubo ahụ Setan boro Job si gbasa gị? Ihe Setan na-ekwu bụ na i jighị obi gị niile hụ Jehova Chineke n’anya, nakwa na ị ga-akwụsị ịna-efe ya ka ị ghara ịnwụ. Ihe ọzọ bụ na ị gaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Job 2:4, 5; Mkpu. 12:10) Olee otú obi dị gị maka ihe a Setan kwuru? Ọ̀ kwa o wutere gị? Ma, chegodị ihe a: Jehova tụkwasịrị gị obi ma nye gị ohere magburu onwe ya iji rubere ya isi. Jehova na-enye Setan ohere ka ọ nwaa gị iji gosi ma ị̀ ga na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi siri Jehova ike na ị ga-ekwesịli ntụkwasị obi ma gosi na Setan bụ onye ụgha. Jehova kwekwara nkwa na ya ga-enyere gị aka. (Hib. 13:6) Obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ na Ọkaakaa eluigwe na ụwa tụkwasịrị gị obi. Ị̀ hụlanụ ihe mere i ji kwesị ịna-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ na-eme ka anyị gosi na Setan bụ ezigbo onye ụgha, na-emekwa ka anyị wepụ aha Nna anyị n’ụta ma kwado ọchịchị ya. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ihe Anyị Ga-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru
9 Gịnị ka Jizọs kwuru? Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (Mat. 27:46) Baịbụl ekwughị ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a. Ma, chetụgodịnụ echiche ihe okwu ahụ pụtara. Otu ihe anyị ma bụ na ihe ndị ahụ Jizọs kwuru mezuru amụma e buru n’Abụ Ọma 22:1. Ihe ọzọ bụkwa na okwu ndị ahụ mere ka anyị ghọta na Jehova agbaghị Ọkpara ya “ogige gburugburu.” (Job 1:10) Jizọs ghọtara na Nna ya hapụrụ ya ka ndị iro ya nwaa ya ruo ọnwụ. O nwetụbeghịkwa onye ọzọ a nwara otú ahụ. Ihe ọzọ bụkwa na okwu ndị ahụ gosiri na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla Jizọs mere a ga-eji maka ya gbuo ya.
ỌKTOBA 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 4-5
“Zere Akụkọ Ndị Na-abụghị Eziokwu”
it-1 713 ¶11
Elifaz
2. Ọ bụ otu n’ime ndị enyi atọ Job. (Job 2:11) Ọ bụ onye Timan. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ onye agbụrụ Elifaz nwa Ịsọ. Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ onye ikwu Ebreham, e nwetụkwara otú ya na Job si bụrụ ndị ikwu. Ya na ndị si n’agbụrụ ya turu ọnụ na ha nwere amamihe. (Jere. 49:7) N’ime mmadụ atọ ahụ sị na ha bịara ịkasi Job obi, Elifaz bụ onye a kacha mara amara na onye ọnụ na-eru n’okwu karịa ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ ga-abụ ya tọrọ ndị nke ọzọ. Ọ bụ ya bu ụzọ kwuo okwu ná nke ọ bụla n’ime ugboro atọ ha niile kwuru okwu, okwu ya tokwara ogologo karịa nke ndị ọzọ.
Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!
Ka Elifaz chetara ihe sitere n’ikike karịrị nke mmadụ ọ hụrụ otu mgbe, o kwuru, sị: “Otu mmụọ wee gabiga n’ihu m; Ajị anụ ahụ́ m wee guzo ọtọ. Ọ na-eguzo eguzo, ma amataghị m otú ọ dị n’ile ya anya; otu ụdị dị n’ihu anya m: idebe ọnụ duu dị, ma olu ka m na-anụ, sị.” (Job 4:15, 16) Olee ụdị mmụọ metụtara echiche Elifaz? Okwu ọjọọ mmụọ ahụ kwuziri na-egosi na ọ bụghị otu n’ime ezi ndị mmụọ ozi Chineke ka ọ hụrụ. (Job 4:17, 18) Ọ bụ ajọ mmụọ. Ma ọ́ bụghị ya, gịnị mere Jehova ga-eji baara Elifaz na ndị enyi ya abụọ mba n’ihi ịgha ụgha? (Job 42:7) Ee, mmụọ ọjọọ metụtara Elifaz. Ihe ndị o kwuru gosipụtara echiche nke onye na-amaghị Chineke.
Anabatala Ụgha Setan Na-agha
Setan mere ka Elifaz, bụ́ otu n’ime mmadụ atọ bụ́ ndị enyi Job, bụ́ ndị bịara ileta ya, kwuo na ụmụ mmadụ agaghị emerili ọnwụnwa Setan. Ọ gwara Job na ụmụ mmadụ “bi n’ụlọ ájá,” nakwa na “a tọrọ ntọala ha n’ájá! A na-azọpịa ha ọsọ ọsọ karịa nla. Malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị, a na-azọpịa ha; ha na-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị onye ọ na-emetụ n’obi.”—Job 4:19, 20.
Amaokwu ọzọ na Baịbụl ji anyị tụnyere ‘arịa e ji ụrọ kpụọ,’ ya bụ, ite na-akụwa akụwa. (2 Kọr. 4:7) Anyị adịghị ike n’ihi na anyị ketara mmehie na ezughị okè n’aka Adam. (Rom 5:12) Anyị agaghị emerili ọnwụnwa Setan n’ike anyị. Ma, Jehova ga-enyere anyị bụ́ Ndị Kraịst aka imeri ọnwụnwa Setan. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. (Aịza. 43:4) Ihe ọzọ bụ na Jehova na-ewere mmụọ nsọ enye ndị na-arịọ maka ya. (Luk 11:13) Mmụọ ya na-enye anyị “ike karịrị ike nkịtị,” bụ́ nke na-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla Setan nwere ike iwetara anyị. (2 Kọr. 4:7; Fil. 4:13) Ọ bụrụ na anyị eguzogide Ekwensu, ma ‘sie ike n’okwukwe,’ Chineke ga-eme ka anyị guzosie ike, meekwa ka anyị sie ike. (1 Pita 5:8-10) Ya mere, anyị ekwesịghị ịna-atụ Setan bụ́ Ekwensu ụjọ.
Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị
● Chee banyere ebe akụkọ ahụ si na ihe ọ na-ekwu
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.
Tupu i kweta akụkọ ma ọ bụ zigawara ya onye ọzọ, ma nke ọtụtụ ndị na-akọ ma nke ị nụrụ ugboro ugboro n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi, gbaa mbọ chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. Olee otú ị ga-esi eme ya?
Chee echiche ma ebe ị nụrụ ya ma ọ bụ onye kọọrọ gị ya ọ̀ bụ onye ị ga-atụkwasịli obi. Ụfọdụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi na òtù dị iche iche nwere ike ịkpatụ akụkọ ha na-akọ aka ka ọ daba n’ihe ha chọrọ ma ọ bụ n’ihe ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha chọrọ. Chọpụta ma ihe a kọrọ n’otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọ̀ bụ ihe ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọzọ kọrọ gbasara otu akụkọ ahụ. Oge ụfọdụ, ndị enyi anyị nwere ike izitere anyị akụkọ na-abụghị eziokwu n’ozi iimel ma ọ bụ n’Ịntanet n’amaghị ama. N’ihi ya, ekwetala akụkọ ọ bụla mgbe ị na-achọpụtabeghị ebe akụkọ ahụ si.
Chọpụta ma ihe e kwuru n’akụkọ ahụ ọ̀ bụ otú ihe si kwụrụ n’oge ahụ, bụrụkwa eziokwu. Lee ma ị̀ ga-ahụ ụbọchị a kọrọ akụkọ ahụ na ihe ndị gosiri na akụkọ ahụ mere eme otú e si kọọ ya. Kpachara ezigbo anya ma ọ bụrụ na otú e si kọọ gbasara ihe siri ike meziri ka ihe ahụ yie ihe dị mfe ma ọ bụ na a kọrọ akụkọ ahụ otú ọ ga-eme ka i mee ihe ndị kọrọ ya chọrọ, dị ka iwe iwe, inwe obi ụtọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nọgidesie Ike, Ma Nwee Mmeri n’Ọsọ nke Ndụ Ahụ
Iso ná nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ezi ofufe pụrụ ime nnọọ ka anyị na-eguzosi ike. Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi iso n’òtù ụmụnna dị otú ahụ na-ahụ n’anya nke zuru ụwa ọnụ! (1 Pita 2:17) Anyị pụkwara ime ka ndị kwere ekwe ibe anyị na-eguzosi ike.
Tụlee omume na-enye aka nke nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job mere. Ọbụna e mere nnọọ ka onye nkasi obi ụgha bụ́ Elifaz kweta, sị: “Okwu gị na-eme ka onye na-asụ ngọngọ guzosie ike, ị na-agbakwa ikpere na-ehuru ala ume.” (Job 4:4) Olee otú anyị na-eme n’akụkụ a? Anyị nile n’otu n’otu nwere ibu ọrụ nke inyere ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị aka ịtachi obi n’ozi Chineke. Mgbe anyị na ha na-emekọ ihe, anyị pụrụ ime ihe kwekọrọ n’okwu a: “Meenụ aka kụdara akụda ka ha dị ike, gbaakwanụ ikpere na-asụ ngọngọ ume.” (Aịsaịa 35:3) Ya mere, gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịhụ na ị na-ewusi otu Onye Kraịst ibe gị ma ọ bụ abụọ ike ma na-agba ha ume mgbe ọ bụla gị na ha nọkọrọ? (Ndị Hibru 10:24, 25) Ịgwa ha okwu ịja mma ndị na-agba ume na igosipụta ekele maka mgbalị ha nọgidere na-eme iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ pụrụ inyere ha aka n’ezie ịnọgide na-eguzosi ike, na-eburu n’uche inwe mmeri n’ọsọ nke ndụ ahụ.
ỌKTOBA 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 6-7
“Mgbe I Chere na Ị Gaghịzi Edili Nsogbu Ndị Na-abịara Gị”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
7:1; 14:14—Gịnị ka “obubu agha” pụtara? Ahụhụ Job nọ na-ata hiri nne nke na o lere ndụ ya anya dị ka ọrụ mmanye. (Job 10:17) Ebe ọ bụ na oge mmadụ ga-eji nọọ na Shiol—site n’oge ọ nwụrụ ruo mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ—bụ oge a na-amanye onye ahụ amanye ịnọ, Job ji oge ahụ tụnyere ọrụ mmanye.
Jehova Na-azọpụta Ndị Dara Mbà n’Obi
EBE ọ bụ na ndụ anyị dị mkpụmkpụ, “jupụtakwa ná nsogbu,” o nwere ike ime ka anyị na-eche echiche mgbe ụfọdụ. (Job 14:1) Ihe a nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge ochie nwere mgbe ha dara mbà. E nwedịrị mgbe ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịnwụ. (1 Eze 19:2-4; Job 3:1-3, 11; 7:15, 16) Ma n’oge ọ bụla ha dara mbà n’obi, Jehova, bụ́ Chineke ha tụkwasịrị obi, mesiri ha obi ike, meekwa ka ha dị ike. E dere akụkọ ha na Baịbụl ka ha kasie anyị obi ma kụziere anyị ihe.—Rom 15:4.
Ihe I Nwere Ike Ime ma Ọ Dị Gị Ka Ndụ Ọ̀ Gwụla Gị Ike
Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị gị ka nsogbu gị enweghị ọgwụgwụ, cheta na ọ bụghị naanị gị ka nsogbu na-echi ọnụ n’ala. Onye ọ bụla ị hụrụ taa nwere nsogbu ya na ya na-alụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu.” (Ndị Rom 8:22) Ị na-ele otú ihe si dịrị gị ugbu a, o nwere ike ịdị gị ka ụwa nke gị ọ̀ gwụla. Ma ọtụtụ mgbe, ihe na-emecha gbanwee. Ka ọ dịgodị, olee ihe ga-enyere gị aka?
Kọọrọ dimkpa, bụ́ ezigbote enyi gị, otú obi dị gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) E nwere otu nwoke a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, aha ya bụ Job. Mgbe nsogbu ụwa zuru ya ahụ́, ọ kọọrọ ndị ọzọ otú obi dị ya. Ọ bụ otú ụwa si dịrị ya mere o ji sị na ya ‘kpọrọ ndụ ya asị.’ N’agbanyeghị nke ahụ, o kwuru, sị: “M ga-ekwupụta nchegbu m na-enwe banyere onwe m. M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 10:1) Ọ bụrụ na ị kọọrọ mmadụ otú obi dị gị, o nwere ike ime ka ahụ́ rutụ gị ala. O nwekwara ike mee ka ị chọpụta na ụwa gị adịchaghị njọ otú ahụ i chere.
Gwa Chineke ihe gị na ya na-alụ. Ụfọdụ ndị na-asị na Chineke anaghị aza ekpere. Ma, Baịbụl kwuru na ọ na-aza. Abụ Ọma 65:2 kwuru na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Akwụkwọ 1 Pita 5:7 sịkwa na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ O nwere ọtụtụ ebe Baịbụl kwuru na Chineke na-enyere ndị tụkwasịrị ya obi aka. Dị ka ihe atụ:
ILU 3:5, 6 kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”
ABỤ ỌMA 145:19 kwuru, sị: “[Jehova] ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.”
1 JỌN 5:14 kwuru, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe [Chineke] nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”
ILU 15:29 kwuru, sị: “Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya, ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.”
Ọ bụrụ na ị gwa Chineke ihe gị na ya na-alụ, ọ ga-enyere gị aka. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị gị: ‘Tụkwasị ya obi mgbe niile. Wụpụ obi gị n’ihu ya dị ka mmiri.’—Abụ Ọma 62:8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Na-eme Ka Jehova Ma Gị na Ụmụnna Gị Mekọwa Ihe
10 Anyị nwere ike ịgbalị na-aghọta ụmụnna anyị si otú ahụ na-eme ka Jehova. Gbalịa mata ụmụnna gị nke ọma. Gị na ha na-ekwurịta okwu tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa ma a gbasaa. Gị na ha na-arụ n’ozi ọma. O kwe omume, kpọọ ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị. Ị na-eme otú ahụ, i nwere ike ịchọpụta na nwanna nwaanyị i chere na ọ naghị emesapụ ihu bụ onye ihere. I nwekwara ike ịchọpụta na nwanna i chere na ọ na-achụ ego ọnwụ ọnwụ na-emesapụ aka, ma ọ bụkwanụ na nwanna nwaanyị na ụmụ ya na-abịakarị ọmụmụ ihe n’azụ oge na-edi mkpagbu n’ụlọ ha. (Jems 4:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ịbụ “ndị na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha.” (1 Tim. 5:13) Ma, anyị kwesịrị ịmata ụmụnna anyị na ihe ndị merela ha ná ndụ. O nwere ike ime ka anyị na-aghọtakwu ha.
ỌKTOBA 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 8-10
“Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Na-echebe Anyị Ka Ụgha Setan Ghara Imegharị Anyị Anya”
Ànyị Ga-emeli Ihe Dị Chineke Mma?
E nwere mgbe Job tara ezigbo ahụhụ. Ma, o cheghị na ya kwesịrị ịta ụdị ahụhụ ahụ. O bidoro iche na Chineke achọghị ịma ma ò nwere okwukwe na ya ma ọ̀ bụ na o nweghị. Ihe a o chere ezighị ezi. (Job 9:20-22) Otú Job si were onwe ya ka onye ezi omume mere ka ndị ọzọ chewe na ọ na-ekwu na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke.—Job 32:1, 2; 35:1, 2.
Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru
14 Ịhụnanya Jehova pụrụ iche na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya. Mgbe Devid na-ekpe ekpere, ọ gwara Jehova, sị: “Ị bụụrụ m ebe nzuzo. Ị ga-echebe m n’oge nsogbu. Ị ga-eme ka ndị ga-eti mkpu ọṅụ maka na ị napụtala m gbaa m gburugburu. . . . Ịhụnanya Jehova na-echebe onye tụkwasịrị ya obi.” (Ọma 32:7, 10) Otú ahụ mgbidi gbara obodo gburugburu n’oge ochie na-echebe ya, ka ịhụnanya Jehova pụrụ iche na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma anyị na ya. Ihe ọzọkwa bụ na ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-eme ka ọ dọta anyị nso n’ebe ọ nọ.—Jere. 31:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Ònye Maara Uche Jehova?”
19 Olee ihe anyị mụtara banyere “uche Jehova”? Anyị kwesịrị ikwe ka Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịmara uche Jehova. Ebe ọ bụ na otú anyị si ele ihe anya anaghị ezicha ezi, anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova na-ele ihe anya otú anyị si ele ya. Job sịrị: ‘Chineke abụghị mmadụ dị ka mụ onwe m nke na m ga-asa ya okwu, nke na anyị ga-ezukọ ka e kpeere anyị ikpe.’ (Job 9:32) Ọ bụrụ na anyị aghọta uche Jehova dị ka Job ghọtara, anyị ga-ekwu ka Job, bụ́ onye sịrị: “Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile, leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị! Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”—Job 26:14.
20 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ahụ ihe siiri anyị ike nghọta mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, karịchaa, ma ọ bụrụ ihe metụtara otú Jehova si ele ihe anya? Ọ bụrụ na ọ ka siiri anyị ike nghọta mgbe anyị mechara nchọnchọ, ka anyị lee ya anya ka ihe na-anwale ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi. Cheta na mgbe ụfọdụ, ihe ụfọdụ Jehova kwuru na-enye anyị ohere igosi ma àgwà Jehova ọ̀ dị anyị mma. Ka anyị jiri obi umeala kweta na ọ bụghị ihe niile ọ na-eme ka anyị na-aghọta. (Ekli. 11:5) Nke a ga-eme ka anyị kweta na Pọl onyeozi kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya! N’ihi na ‘ònye maara uche Jehova, ma ọ bụ, ònye bụ onye ndụmọdụ ya?’ Ma ọ bụ, ‘Ònye bu ụzọ nye ya ihe, nke na a ghaghị ịkwụ ya ụgwọ ya?’ N’ihi na ihe niile si n’ebe ọ nọ, sitekwa n’aka ya, dịrịkwa n’ihi ya. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi. Amen.”—Rom 11:33-36.
ỌKTOBA 30–NỌVEMBA 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 11-12
“Ụzọ Atọ Anyị Ga-esi Enweta Amamihe ma Rite Uru na Ya”
Job Toro Aha Jehova
17 Gịnị nyeere Job aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? O doro anya na ihe nyeere ya aka bụ na ya na Jehova dị n’ezigbo mma tupu nsogbu ya amalite. Ọ bụ ezie na e nweghị ihe gosiri anyị na Job ma na Setan mara Jehova aka, o kpebisiri ike ịnọgide na-efe Jehova. Ọ sịrị: “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!” (Job 27:5) Olee otú Job na Chineke si malite ịdị ná mma? O doro anya na ihe ọ nụrụ banyere otú Chineke si mesoo Ebreham, Aịzik, na Jekọb, ndị bụ́ ndị ikwu ya, masịrị ya. Job si n’ihe dị iche iche Jehova kere mata ọtụtụ àgwà ya.—Gụọ Job 12:7-9, 13, 16.
Ị Nọghị Naanị Gị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Gị Mgbe Niile
10 Na-emeta ụmụnna enyi. Meta ụmụnna ndị i nwere ike ịmụta ihe n’aka ha enyi, ma ndị gị na ha na-abụghị ọgbọ ma ọ bụ ndị gị na ha na-esighị otu ebe. Baịbụl gwara anyị na ndị agadi nwere amamihe. (Job 12:12) Ndị agadi nwekwara ọtụtụ ihe ha nwere ike ịmụta n’aka ndị na-eto eto. Devid bụ obere nwa n’ebe Jọnatan nọ. Ma nke ahụ emeghị ka ha ghara ịbụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Devid na Jọnatan nyeere ibe ha aka ife Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike bịaara ha. (1 Sam. 23:16-18) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Irina onye ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha kwuru, sị: “Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere ike ịghọrọ anyị ndị nne na nna na ụmụnne. Jehova nwere ike iji ha nyere anyị aka.”
11 Imeta ndị enyi ọhụrụ nwere ike isiri anyị ike, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ihere. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ratna. Ọ bụ onye ihere. Ọ batara n’ọgbakọ n’agbanyeghị mkpagbu a na-akpagbu ya. Ọ sịrị: “Ekwetara m na enyemaka ndị ọgbakọ anyị dị m mkpa.” O nwere ike ịna-esiri anyị ike ịgwa ndị ọzọ ihe dị anyị n’obi. Ma, ọ bụrụ na anyị agbalịa na-agwa ha ihe dị anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị na ha bụrụ ezigbo enyi. Ndị enyi gị chọrọ inyere gị aka, chọọkwa ịgba gị ume. Ma, ọ bụ gị ga-eme ka ha mata otú ha ga-esi eme ya.
12 Otu ụzọ kacha mma isi meta ụmụnna anyị enyi bụ anyị na ha ịrụ n’ozi ọma. Carol anyị kwuru okwu ya sịrị: “Iso ụmụnna na-aga ozi ọma na ịna-eme ihe ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ emeela ka m meta ọtụtụ n’ime ha enyi. Jehova ejirila ha nyere m aka kemgbe ọtụtụ afọ.” Imeta ụmụnna anyị enyi na-aba ezigbo uru. Jehova na-eji ndị enyi anyị ndị a na-enyere anyị aka mgbe obi na-adịghị anyị mma, dị ka mgbe owu na-ama anyị.—Ilu 17:17.
it-2 1190 ¶2
Amamihe
Amamihe Si n’Aka Chineke. Ọ bụ Jehova Chineke kacha mara ihe. Baịbụl kpọrọ ya “onye naanị ya ma ihe.” (Rom 16:27; Mkpu. 7:12) Ebe ọ bụ Jehova kere ihe niile, bụrụkwa onye na-adị “ruo mgbe ebighị ebi” (Ọma 90:1, 2), ọ ma ihe niile banyere eluigwe na ụwa, ihe ndị o ji kee ha na ihe ndị dị n’ime ha, nakwa ihe niile merelanụ kemgbe o kere ha ruo taa. Ọ bụkwa Jehova mere iwu ndị na-achị ihe niile e kere eke nakwa usoro ha si arụ ọrụ. Ọ bụ iwu na usoro ndị a ha si arụ ọrụ na-enyere ndị sayensị aka ime nchọpụta na ịrụpụta ihe dị iche iche. E wepụ iwu ndị a, ha agaghị enwe ike ime ihe ndị a. (Job 38:34-38; Ọma 104:24; Ilu 3:19; Jere. 10:12, 13) Ọ dabara adaba ikwu na ntụziaka ndị Jehova nyere anyị, ya bụ, otú ọ chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ, ga-akadị abara anyị uru. Ha ga-eme ka ndụ anyị ka mma, ka anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, nakwa ka anyị bie ezigbo ndụ. (Diut. 32:4-6) O nweghị ihe Chineke na-agaghị aghọtali. (Aịza. 40:13, 14) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịgba nkịtị ka ihe ndị na-adịghị ya mma malite ime, ma ọ bụdị kwe ka ha mere na-aga, ma ọ bụ ya ga-ekpebi ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụkwa uche ya ga-eme. Ihe niile o kwuru “ga-emezurịrị.”—Aịza. 55:8-11; 46:9-11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ndị Nne na Nna na Ụmụ Ha Na-eto Eto Ikwurịta Okwu nke Ọma
▪ ‘M̀ na-esi n’ihe ọ na-ekwu na-aghọta otú obi dị ya?’ Job 12:11 kwuru, sị: “Ntị ọ̀ dịghị anwale okwu dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe oriri?” Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị ‘ịnwale’ ihe nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị na-ekwu. Ndị na-eto eto na-ekwukarị okwu dị ka à ga-asị na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị nwere ike ịsị, “Ị na-emekarị m ka m̀ bụ nwata!” ma ọ bụ “Ọ dịghị mgbe ị na-ege ntị n’ihe m na-ekwu!” Kama gị na ya ịrụwa ụka n’ihe ahụ ọ na-ekwetaghị, ghọta na ikekwe otú ahụ o si kwuo ya abụchaghị otú ọ dị ya n’obi. Dị ka ihe atụ, “Ị na-emekarị m ka m̀ bụ nwata” nwere ike ịbụ “Ọ dị m ka ị tụkwasịghị m obi.” “Ọ dịghị mgbe ị na-ege ntị n’ihe m na-ekwu” nwere ike ịbụ “M chọrọ ịgwa gị otú obi dị m.” Gbaa mbọ ka i si n’ihe ọ na-ekwu ghọta otú obi dị ya.