“E Weere Ọnụ Ahịa Gbara Unu”
“E weere ọnụ ahịa gbara unu: ya mere nyenụ Chineke otuto n’ahụ unu.”—1 NDỊ KỌRINT 6:20.
1, 2. (a) Gịnị meghere “ụzọ nile isi n’ọnwụ pụọ”? (b) Gịnị ka ọ dịrị mkpa ka e mee iji wee mee ka àjà Kraịst wee bụrụ nke dị irè n’ụzọ iwu kwadoro, dị ka gịnị si see onyinyo ya?
ONYE ọbụ abụ ahụ kwuru, sị, “Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta azọpụta; ọ bụkwa Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, nwe ụzọ nile isi n’ọnwụ pụọ.” (Abụ Ọma 68:20) Àjà nke Jisọs Kraịst meghere ụzọ ahụ. Ma, ka àjà ahụ wee bụrụ ihe bara uru n’ụzọ iwu kwadoro, ọ dị mkpa ka Kraịst bịa n’onwe ya n’ihu Chineke onwe ya.
2 E sere onyinyo nke a n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie mgbe onye isi nchụaja na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ. (Levitikọs 16:12-15) Pọl onyeozi dere, sị, “Ma Kraịst, ebe ọ bịara ka ọ bụrụ onye isi nchụaja . . . , o siteghịkwa n’ọbara nke ewu na nke ụmụ ehi, kama o sitere n’ọbara nke ya onwe ya, baa n’ebe nsọ nanị otu mgbe, ebe ọ chọpụtara mgbapụta ebighị ebi. N’ihi na Kraịst abaghị n’ebe nsọ e ji aka mee, bụ́ ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie; kama ọ bara n’eluigwe onwe ya, igosi onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.”—Ndị Hibru 9:11, 12, 24.
Ike nke Ọbara
3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-efe Jehova si ele ọbara anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị gosiri na ọbara nwere ike iwu kwadoro ikpuchi mmehie?
3 Ọrụ dị aṅaa ka ọbara Kraịst na-arụ ná nzọpụta anyị? Eri oge Noa, ndị na-efe ezi ofufe anọwo na-ele ọbara anya dị ka ihe dị nsọ. (Jenesis 9:4-6) Ọbara na-arụ ọrụ dị mkpa n’usoro ndụ, n’ihi na Bible na-ekwu na “ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị.” (Levitikọs 17:11) Ya mere, Iwu Mosis ahụ kwuru na mgbe e jiri anụmanụ chụọ àjà, a gaje ịwụpụ ọbara ya n’ihu Jehova. Mgbe ụfọdụ, a na-etinyekwa ọbara n’elu mpì nile nke ebe ịchụ àjà. O doro anya na ike ikpuchi mmehie nke àjà dị n’ọbara ya. (Levitikọs 8:15; 9:9) “Ọ fọdụrụ ihe nta ka m sị na e jikwa ọbara eme ihe nile ka ha dị ọcha, dị ka iwu anyị si dị, ọ bụrụkwa na mwụsi ọbara adịghị mgbaghara mmehie adịghị.”—Ndị Hibru 9:22.
4. (a) Nzube dị aṅaa ka mgbochi Chineke tinyere n’ojiji e ji ọbara eme ihe mezuru? (b) Gịnị bụ ihe dị mkpa n’ụzọ e si gbuo Jisọs?
4 Ya mere, ihe ijuanya dị ukwuu adịghị ya na n’okpuru Iwu ahụ, ahụhụ a na-ata onye ọ bụla ji ọbara mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ ọnwụ! (Levitikọs 17:10) Anyị nile maara na mgbe e mere ka ihe dị ụkọ, ma ọ bụ belata ojiji a na-eji ya eme ihe nke ukwuu, ọnụ ahịa ya na-arị elu. Mgbochi Jehova tinyere n’iji ya eme ihe mere ka e jide n’aka na a ga-ele ọbara anya, ọ bụghị dị ka ihe ọnụ ahịa ya dị ala, kama dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ihe bara uru. (Ọrụ 15:29; Ndị Hibru 10:29) Nke a kwekọrọ ná nzube dị elu nke ọbara Kraịst ga-emezu. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ nwụrụ n’ụzọ mere ka a wụfuo ọbara ya. Otú a, ọ pụtara ìhè na Kraịst abụghị nanị na o jiri anụ ahụ mmadụ ya chụọ àjà, kama ọ wụpụkwara mkpụrụ obi ya, jiri ndụ ya n’onwe ya chụọ àjà dị ka mmadụ zuru okè! (Aịsaịa 53:12) Kraịst atụfughị iru eru ahụ iwu kwadoro inweta ndụ ahụ n’ihi ezughị okè, ya mere, ọbara ya nke a wụfuru nwere ọnụ ahịa dị elu nke ukwuu, a pụkwara iche ya n’ihu Chineke iji kpuchie mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ.
5. (a) Gịnị ka Kraịst ji banye n’eluigwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ụzọ o si pụta ìhè na Chineke naara àjà Kraịst?
5 Kraịst apụghị iji ọbara nkịtị ya banye n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:50) Kama nke ahụ, o ji ihe ọbara ahụ sere onyinyo ya wee banye: ọnụ ahịa nke ndụ mmadụ ya zuru okè e jiri chụọ àjà. N’ihu Chineke, ọ pụrụ iche ndụ ahụ n’ihu dị ka ihe mgbapụta iji gbanwere ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. Nnara Jehova naara àjà ahụ pụtara ìhè na Pentikọst nke 33 O.A., mgbe mmụọ nsọ bịakwasịrị 120 ndị na-eso ụzọ nọ na Jerusalem. (Ọrụ 2:1-4) Kraịst, dị ka a pụrụ ikwu ya, bụzi onye nwe agbụrụ mmadụ ugbu a site n’ịzụrụ ha azụrụ. (Ndị Galetia 3:13; 4:5; 2 Pita 2:1) Ya mere, abamuru ndị sitere n’ihe mgbapụta ahụ pụrụ irugara ihe a kpọrọ mmadụ.
Ndị Mbụ Ritere Uru site n’Ihe Mgbapụta ahụ
6. Ndokwa dịgasị aṅaa ka Chineke meworo maka iji uru nke àjà mgbapụta Kraịst mee ihe?
6 Otú ọ dị, nke a pụtaghị na a gaje inye ihe a kpọrọ mmadụ izu okè anụ ahụ n’otu ntabi anya, n’ihi na ọ gwụlakwa ma e meriri ọdịdị mmehie nke mmadụ, ọ gaghị ekwe omume inwe izu okè nke anụ ahụ. (Ndị Rom 7:18-24) N’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa òle mgbe, ka a ga-emeri mmehie? Chineke buru ụzọ mee ndokwa ka 144,000 ndị ga-anọ n’eluigwe dị ka ‘ndị nchụaja nye Chineke anyị, chịa achị dị ka ndị eze n’elu ụwa’ ha na Kraịst Jisọs. (Mkpughe 5:9, 10; 7:4; 14:1-3) Site n’aka ha, a ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka uru nile nke ihe mgbapụta ahụ rutere ihe a kpọrọ mmadụ n’ogologo oge nke otu puku afọ.—1 Ndị Kọrint 15:24-26; Mkpughe 21:3, 4.
7. (a) Gịnị bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, òle ndị bụkwa ndị so na ya, nzube dị aṅaa ka ọ na-emezukwa? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka mmadụ nwụọ iji mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kwe omume, ọrụ dịkwa aṅaa ka ọbara Kraịst na-arụ?
7 Iji wee mezuo nke ahụ, ‘e sitere n’etiti mmadụ gbata’ 144,000 ndị eze bụkwa ndị nchụaja. (Mkpughe 14:4) E mezuru nke a site ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ.’ Ọgbụgba ndụ nke a bụ nkwekọrịta dị n’etiti Jehova Chineke na Israel ime mmụọ nke Chineke ka ndị òtù ya jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụaja. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Galetia 6:16; Ndị Hibru 8:6-13; 1 Pita 2:9) Ma, olee ụzọ o si kwe omume inwe ọgbụgba ndụ n’etiti Chineke na ụmụ mmadụ na-ezughị okè? Pọl kọwara, sị: “N’ihi na ebe ọgbụgba ndụ [n’etiti Chineke na mmadụ na-ezughị okè] dị, ọ dị mkpa ka ọnwụ nke onye gbara ya dị ya. N’ihi na ọgbụgba ndụ na-eguzosi ike n’elu ndị nwụrụ anwụ: n’ihi na [“o nweghị,” NW] ụzọ ọ ga-abụ ihe dị ike mgbe ọ bụla onye gbara ya dị ndụ.”—Ndị Hibru 9:16, 17.
8, 9. Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ihe mgbapụta ahụ na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
8 Ya mere, àjà mgbapụta ahụ bụ isi ihe dị mkpa n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke Jisọs bụ Onye Ogbugbo ya. Pọl dere, sị: “Otu Chineke dị, otu onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, onye ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs, onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta [“ruru eru,” NW] n’ihi mmadụ nile; nke a ga-agba àmà ya n’oge nke aka ya.” (1 Timoti 2:5, 6) Okwu ndị ahụ metụtakarịrị 144,000 ahụ, bụ́ ndị e so banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.
9 Mgbe Chineke sooro Israel anụ ahụ banye n’ọgbụgba ndụ, ọ bụghị ihe dị irè n’ụzọ iwu kwadoro ruo mgbe a wụpụrụ ọbara anụmanụ n’ọchụchụ àjà. (Ndị Hibru 9:18-21) N’ụzọ yiri nke ahụ, ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ wee malite ịdị irè, ọ dịrị mkpa ka Kraịst wụpụ ‘ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ.’ (Matiu 26:28; Luk 22:20) Ebe Kraịst na-eje ozi dị ka ma Onye Isi Nchụaja ma “onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” Chineke na-eji uru nke ọbara Jisọs mee ihe maka abamuru nke ndị e webatara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, na-agụnyere ha ezi omume mmadụ n’ụzọ iwu kwadoro. (Ndị Hibru 9:15; Ndị Rom 3:24; 8:1, 2) Mgbe ahụ, Chineke pụrụ iwebata ha n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka ha wee bụrụ ndị eze na ndị nchụaja n’eluigwe! Dị ka Onye Ogbugbo na Onye Isi Nchụaja ha, Jisọs Kraịst na-enyere ha aka n’ịnọgide n’ọnọdụ dị ọcha n’ihu Chineke.—Ndị Hibru 2:16; 1 Jọn 2:1, 2.
Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Elu Ala
10, 11. (a) Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ si metụta ihe karịrị ndị Kraịst e tere mmanụ? (b) Olee ndị bụ oké ìgwè mmadụ ahụ, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ha nwere n’ebe Chineke nọ?
10 Ọ̀ bụ nanị ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ inweta ntọhapụ site n’ihe mgbapụta ahụ, mgbaghara nke mmehie ha? Ee e, Chineke na-eme ka ya na ihe ndị ọzọ nile dịghachi n’otu site n’iji ọbara ahụ a wụpụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ mee udo, dị ka Ndị Kọlọsi 1:14, 20 na-egosi. Nke a metụtara ihe ndị dị n’eluigwe (144,000 ahụ) nakwa ihe ndị dị n’elu ala. Ndị nke abụọ ahụ bụ ndị ruru eru inweta ndụ elu ala, bụ́ ụmụ mmadụ ndị ga-enweta ndụ zuru okè n’ime Paradaịs n’elu ala. Karịsịa kemgbe 1935, e mewo mgbalị pụrụ iche ịchịkọta ndị dị otú ahụ. Mkpughe 7:9-17 na-akọwa ha dị ka “oké ìgwè mmadụ” ndị nzọpụta ha sitere n’aka Chineke na n’aka Nwa Atụrụ ahụ. Ọ ka dị mkpa ka ha lanarị “oké mkpagbu ahụ,” ka e ‘duru ha jee n’isi iyi nke mmiri nke ndụ’ n’ihi na Mkpughe 20:5 na-egosi na ndị dị otú ahụ ga-adị ndụ n’ụzọ zuru ezu, na-enwe ndụ mmadụ zuru okè, n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. Mgbe ahụ, ndị gafere ule ikpeazụ n’ọnọdụ ha dị ka ụmụ mmadụ zuru okè ga-abụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume iji nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 20:7, 8.
11 Otú o sina dị, n’ụzọ nke nkwadebe, oké ìgwè mmadụ ahụ ‘asaworị uwe mwụda ha mee ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 7:14) Kraịst adịghị arụ ọrụ dị ka Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ebe ha nọ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha na-erite uru site n’ọgbụgba ndụ nke a site n’ịrụ ọrụ nke Alaeze Chineke. Otú ọ dị, Kraịst ka na-eme ihe n’ebe ha nọ dị ka Onye Isi Nchụaja, onye Jehova si n’aka ya na-eji ihe mgbapụta ahụ na-eme ihe n’ókè nke na a gụwo ha ugbu a ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke. (Tụlee Jemes 2:23.) N’ime Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ, a ga-eji nwayọọ nwayọọ ‘mee ka ha pụọ n’ịbụ ohu mmebi [ruo mgbe ha ga-emesịa] nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:21.
12. N’ihe ndabere dị aṅaa ka Chineke mesoro ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge Kraịst ihe?
12 N’ihe banyere ọnọdụ ha n’ebe Chineke nọ, ọ pụrụ iyi ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ hà dịtụ iche n’ebe ndị na-efe ofufe tupu oge ndị Kraịst nọ. Otú ọ dị, Chineke mesoro ndị nke abụọ ahụ ihe n’eburu ndokwa nke ihe mgbapụta ahụ n’uche. (Ndị Rom 3:25, 26) Ha nwetara mgbaghara nke mmehie ha nile nanị n’ụzọ a kpaara ókè. (Abụ Ọma 32:1, 2) Kama ịnapụcha ha kpam kpam “akọ na uche ọ bụla nke mmehie dị iche iche,” àjà ụmụ anụmanụ a na-achụ kpatara “ncheta nke mmehie.”—Ndị Hibru 10:1-3.
13. Abamuru dịgasị aṅaa ka anyị nwere, nke ndị ohu Chineke tupu Kraịst na-enweghị?
13 Ọnọdụ dị iche n’ihe banyere ezi ndị Kraịst taa. Ha na-efe ofufe n’ihe ndabere nke ihe mgbapụta nke a kwụworo akwụ! Site n’Onye Isi Nchụaja ha, ha ‘na-ewere nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara.’ (Ndị Hibru 4:14-16) Ịbụ ndị e mere ka ha na Chineke dịghachi n’otu abụghị ihe omume a ka na-ele anya ya, kama ọ bụ ihe meworo eme ugbu a! (2 Ndị Kọrint 5:20) Mgbe ha mehiere, ha pụrụ ịnata ezi mgbaghara. (Ndị Efesọs 1:7) Ha na-enwe akọ na uche nke e mere ka ọ dị ọcha n’ezie. (Ndị Hibru 9:9; 10:22; 1 Pita 3:21) Ngọzi ndị a bụ ndetụ iré bu ụzọ nke nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke, nke ndị ohu Jehova ga-enweta n’ọdịnihu!
Ịdị Omimi nke Amamihe na Ịhụnanya Chineke
14, 15. Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ si eme ka amamihe Chineke nke a na-apụghị ịchọpụta achọpụta pụta ìhè, tinyekwara ezi omume na ịhụnanya ya?
14 Lee nnọọ onyinye dị ebube sitere n’aka Jehova ihe mgbapụta ahụ bụ! Ọ dị mfe ịghọta ya, ma ọ dịkwa omimi ruo n’ókè ime ka onye kasị nwee ọgụgụ isi tụọ egwu. Ntụleghachi anyị meworo banyere ihe mgbapụta ahụ bụ nanị ịkpatụ ya aka n’elu. Ma, anyị so Pọl onyeozi na-eti mkpu sị: “Aa! Omimi nke akụ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! Lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ ya nile!” (Ndị Rom 11:33) A na-egosi amamihe Jehova n’eziokwu ahụ nke bụ na o nwere ike ma ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ nakwa iwepụ ịbụ ọkaaka ya n’ụta. Site n’ihe mgbapụta ahụ, “e mewo ka ezi omume Chineke pụta ìhè . . . Chineke chere [Kraịst] n’ihu ọha mmadụ ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi, site n’okwukwe e kwere n’ọbara ya.”—Ndị Rom 3:21-26.
15 Ọ dịghị nkatọ ọ bụla a pụrụ iweta megide Chineke maka ịgbaghara mmehie ndị na-efe ya tupu oge Kraịst. Ọzọkwa, a pụghị ikwu okwu nkatọ megide Jehova maka ịgụ ndị ezi omume e tere mmanụ dị ka ụmụ ya ma ọ bụ oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ndị enyi ya. (Ndị Rom 8:33) N’ịbụ nke furu ya ihe dị ukwuu, Chineke agbasozuwo nnọọ iwu, ma ọ bụ emewo ihe n’ụzọ ziri ezi, ná mmeso ya nile, na-emeri kpam kpam nzọrọ ụgha Setan na-azọrọ na Jehova bụ onye ọchịchị nke na-adịghị eme ihe n’ikpe ziri ezi! Ịhụnanya Chineke nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya n’ebe ihe ndị o kere eke nọ abụwokwa nke e gosipụtara n’ókè ajụjụ ọ bụla na-adịghị ya.—Ndị Rom 5:8-11.
16. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ihe mgbapụta ahụ siworo mee ndokwa maka idozi ihe iseokwu ahụ metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke? (b) Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ si enye anyị ihe ndabere maka inwe okwukwe n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke na-abịanụ?
16 Ụzọ e si wepụta ihe mgbapụta ahụ dozikwara ihe iseokwu ndị metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke. Nanị nrubeisi Jisọs mezuru nke ahụ. (Ilu 27:11; Ndị Rom 5:18, 19) Ma, tụkwasị na nke ahụ ụzọ ndụ nke 144,000 ndị Kraịst ndị, n’agbanyeghị mmegide Setan, nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ! (Mkpughe 2:10) Ihe mgbapụta ahụ mere ka o kwe ndị a omume ịnata ụgwọ ọrụ ha nke anwụghị anwụ—ndụ nke a na-apụghị ibibi ebibi! (1 Ndị Kọrint 15:53; Ndị Hibru 7:16) Nke a mere ka nzọrọ ahụ Setan na-azọrọ na ndị ohu Chineke bụ ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi bụrụ ihe na-enweghị isi! Ihe mgbapụta ahụ enyewokwa anyị ihe ndabere siri ike maka inwe okwukwe ná nkwa nile nke Chineke. Anyị pụrụ ịhụ ndokwa e mere maka nzọpụta nke “e nyeworo n’iwu” site n’àjà mgbapụta ahụ. (Ndị Hibru 8:6) E si otú a na-eme ka e jide n’aka na a gaje inwe ụwa ọhụrụ nke ezi omume!—Ndị Hibru 6:16-19.
Ekwela Ka Nzube Ya Funarị Gị
17. (a) Olee ụzọ ụfọdụ ndị si na-egosi na nzube nke ihe mgbapụta ahụ efunarịwo ha? (b) Gịnị pụrụ ịkpali anyị ịnọgide n’ịdị ọcha nke omume?
17 Iji wee rite uru site n’ihe mgbapụta ahụ, ọ dị mkpa ka mmadụ nara ihe ọmụma, nwee okwukwe, na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Bible. (Jọn 3:16; 17:3) Ma, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole dị njikere ime nke ahụ. (Matiu 7:13, 14) Ọbụna n’etiti ezi ndị Kraịst, ụfọdụ ndị pụrụ ‘ịnara amara Chineke ma kwee ka nzube ya funarị ha.’ (2 Ndị Kọrint 6:1) Dị ka ihe atụ, n’ime afọ ndị gaworo aga, a chụpụwo ọtụtụ puku mmadụ n’ọgbakọ maka àgwà na-ezighị ezi ndị metụtara mmekọahụ. Lee nnọọ ihe ihere ọ bụ n’iburu n’uche ihe Jehova na Kraịst mewooro anyị! Ọ̀ bụ na inwe ekele maka ihe mgbapụta ahụ agaghị akpali mmadụ izere ‘ichezọ nsachapụ nke mmehie ochie ya nile’? (2 Pita 1:9) Ya mere, n’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Pọl chetaara ndị Kraịst, sị: “E weere ọnụ ahịa gbara unu: ya mere nyenụ Chineke otuto n’ahụ unu.” (1 Ndị Kọrint 6:20) Icheta nke a na-enye anyị ihe mkpali siri ike iji nọgide n’ịdị ọcha nke omume!—1 Pita 1:14-19.
18. Olee ụzọ onye Kraịst nke dabaworo n’ajọ mmehie ka nwere ike isi rite uru site n’ihe mgbapụta ahụ?
18 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ adabaworị n’ajọ mmehie? O kwesịrị ịnara mgbaghara mmehie nke ihe mgbapụta ahụ na-eme ka o kwe omume, na-anata enyemaka site n’aka ndị nlekọta na-ahụ n’anya. (Jemes 5:14, 15) Ọbụna ma a sị na ọ dị mkpa inye ahụhụ siri ike, onye Kraịst nke nwere nchegharị ekwesịghị inwe nkụda mmụọ mgbe e nyere mgbazi olu dị otú ahụ. (Ndị Hibru 12:5) Anyị nwere nkwà nke a siri ike dị na Bible: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, ka o wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.”—1 Jọn 1:9.
19. Olee ụzọ onye Kraịst pụrụ isi lee mmehie o mere tupu ọ mụta eziokwu ahụ anya?
19 Mgbe ụfọdụ, ndị Kraịst na-enwe nkụda mmụọ n’enweghị ezi ihe kpatara ya n’ihi ajọ omume ha meworo n’oge gara aga. Otu nwanna nwoke nke nwere nkụda mmụọ dere, sị, “Tupu m bata n’eziokwu, mụ na nwunye m butere ọrịa herpes nke na-eme n’akụkụ ahụ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-adịghị ọcha, dị ka à ga-asị na anyị ‘ekwekọghị’ n’ime nzukọ Jehova nke dị ọcha.” Ọ bụ ezie na ọbụna mgbe ha ghọsịworo ndị Kraịst, ụfọdụ ndị pụrụ inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ụfụ site n’ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. (Ndị Galetia 6:7) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, e nweghị ihe mere a ga-eji nwee mmetụta nke ịbụ onye na-adịghị ọcha n’anya Jehova ma ọ bụrụ na mmadụ echegharịwo. “Ọbara Kraịst” nwere ike “ime akọ na uche anyị ka ọ dịkarịa ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ.”—Ndị Hibru 9:14.
20. Olee ụzọ inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ pụrụ isi napụta onye Kraịst site n’ibu ọrụ amamikpe nke ọ na-adịghị mkpa ka o buru?
20 Ee, inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ pụrụ inyere anyị aka ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ibu arọ nke amamikpe ndị ọ na-adịghị mkpa na anyị ga-ebu. Otu nwanna bụ nwa agbọghọ nakweere, sị: “Anọwo m na-alụ ọgụ megide àgwà ahụ na-adịghị ọcha nke imetọ ahụ onwe onye ruo ihe karịrị afọ 11 ugbu a. N’otu mgbe, ọ fọrọ nke nta ka m hapụ ọgbakọ, na-eche na Jehova agaghị achọ ka onye rụrụ arụ otú a nọrọ na-emetọ ọgbakọ ya.” Ma, anyị aghaghị icheta na Jehova ‘dị mma, dịrịkwa njikere ịgbaghara mmehie,’ ya bụrụhaala na anyị ji ezi akọ na uche na-alụ ọgụ megide ajọ omume, ọ bụghị ikwere ka ọ na-emeri anyị!—Abụ Ọma 86:5.
21. Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ kwesịrị isi metụta ụzọ anyị si ele ndị mejọrọ anyị anya?
21 Ihe mgbapụta ahụ kwesịkwara inwe mmetụta n’ụzọ ị na-esi emeso ndị ọzọ ihe. Dị ka ihe atụ, olee ụzọ ị na-esi emeghachi omume mgbe onye Kraịst ibe gị mejọrọ gị? Ị̀ na-adị njikere ịgbaghara dị ka Kraịst? (Luk 17:3, 4) Ì ‘nwere obi ọmịiko, werekwa amara na-agbaghara ndị ọzọ, dị ka Chineke werekwara amara gbaghara gị n’ime Kraịst’? (Ndị Efesọs 4:32) Ka ị̀ na-ebukọ mmejọ ma ọ bụ iwe n’obi? N’ezie nke ahụ ga-abụ ikwe ka nzube nke ihe mgbapụta ahụ funarị gị.—Matiu 6:15.
22, 23. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ihe mgbapụta ahụ kwesịrị inwe n’ihe mgbaru ọsọ na ụzọ ndụ anyị? (b) Mkpebi dị aṅaa ka ndị Kraịst nile kwesịrị ime n’ihe banyere ihe mgbapụta ahụ?
22 Nke ikpeazụ, inwe ekele maka ihe mgbapụta ahụ kwesịrị inwe mmetụta dị omimi n’ebe ihe mgbaru ọsọ na ụzọ ndụ anyị dị. Pọl kwuru, sị: “E weere ọnụ ahịa gbara unu; unu aghọla ndị ohu mmadụ.” (1 Ndị Kọrint 7:23) Mkpa ndị metụtara akụ na ụba—ụlọ, ọrụ, ihe oriri, ihe oyiyi—hà ka bụ ihe ndị bụ isi ná ndụ gị? Ka ì bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ, na-etinye okwukwe ná nkwa Chineke nke inye gị ihe ndị dị gị mkpa? (Matiu 6:25-33) Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-arụrụ onye were gị n’ọrụ ọrụ nke ukwuu ma na-aghara iwepụta oge zuru ezu maka ọrụ ndị metụtara ọchịchị Chineke? Cheta na Kraịst “nyere onwe ya n’ihi anyị ka o wee . . . sachaakwara onwe ya otu ndị nke ga-abụ ndị nke aka ya, ndị obi ha na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ.”—Taịtọs 2:14; 2 Ndị Kọrint 5:15.
23 ‘Ekele dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst’ maka onyinye nke a na-enweghị atụ—ihe mgbapụta ahụ! (Ndị Rom 7:25) Ka nzube nke ihe mgbapụta ahụ ghara ifunarị anyị mgbe ọ bụla, kama ka anyị kwe ka ọ bụrụ ike nke na-akpali akpali n’ezie n’ime ndụ anyị. N’echiche, n’okwu, na n’omume, ka anyị na-enye Chineke otuto mgbe nile, jiri obi ekele na-echeta na e jiwo ọnụ ahịa wee gbara anyị.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka e ji ele ọbara anya dị ka ihe dị nsọ, oleekwa ụzọ e si chee ọbara Kraịst n’ihu Jehova n’eluigwe?
◻ Ọrụ dị aṅaa ka ọbara Kraịst rụrụ n’ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dịrị irè?
◻ Olee ụzọ ihe mgbapụta ahụ na-esi abara ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ahụ uru?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi na nzube nke ihe mgbapụta ahụ efunarịbeghị anyị?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ike mkpuchi mmehie nke àjà dị n’ọbara ndụ ya
[Foto dị na peeji nke 17]
Onye nwere ekele maka mgbaghara nke Chineke na-adị njikere ịgbaghara ndị ọzọ