Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 7. Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya ga-achị ka iwu ndị mmadụ na-enye ndị ha na-achị mma

      Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị kwesịrị ịbara ndị ha na-achị uru ma chebe ha. Alaeze Chineke nwekwara iwu ndị ọ na-achị kwesịrị ịna-edebe. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-​11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee otú i chere ụwa ga-adị ma mmadụ niile na-edebe iwu Chineke?a

      • Ì chere na Jehova kwesịrị ịgwa ndị Alaeze ya na-achị ka ha na-edebe iwu ndị o nyere ha? Maka gịnị?

      • Olee ihe gosiri na ndị na-anaghị edebe iwu ndị a nwere ike ịgbanwe?​—Leruonụ anya n’amaokwu nke 11.

      Ebe onye uwe ojii na-akwụsị ụgbọala ndị na-agba n’ụzọ na-ekwo ekwo. Ụdị ndị dị iche iche jikwa ụkwụ na-agafe n’ụzọ ahụ.

      Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị ga-echebe ndị ha na-achị ma baara ha uru. Alaeze Chineke nwere iwu ndị ka iwu ụmụ mmadụ mere mma. Iwu ndị ahụ ga-echebe ndị Alaeze ahụ ga-achị, baakwara ha uru

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ gwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọjọọ nakwa uru irubere ya isi ga-abara anyị. Gụọnụ Ilu 7:7-27 ma ọ bụ unu akpọnye VIDIO a. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Enweghị Ezi Uche (9:31)

      • Olee otú otu nwa okorobịa si mee ihe tinyere ya n’ọnwụnwa?​—Leruonụ anya n’Ilu 7:8, 9.

      • Baịbụl kwuru n’Ilu 7:23, 26 na ịkwa iko nwere ike ịkpatara mmadụ ezigbo nsogbu. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme omume rụrụ arụ, olee nsogbu ndị na-agaghị abịara anyị?

      • Olee otú izere omume rụrụ arụ nwere ike isi mee ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi?

      Ụfọdụ ndị na-eche na ihe Baịbụl kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ na-egbochi mmadụ inwe obi ụtọ. Ma, Jehova, bụ́ Chineke hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka anyị niile na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị chọọ iso ná ndị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, anyị ga na-erubere ya isi. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ọ̀ bụ naanị nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ ka Chineke na-achọghị ka ọ na-agụ anyị agụụ?

      Anyị kwesịrị ịgbanwe otú ụfọdụ anyị si akpa àgwà ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Chineke mma. Ò nwere uru ọ ga-abara anyị? Gụọnụ Abụ Ọma 19:​8, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ì chere na iwu dị iche iche Jehova nyere dị mma? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

      Foto abụọ: 1. Ebe otu nwa agbọghọ obi na-adịghị ụtọ nọ n’akụkụ enyi ya nwoke. O so ndị enyi ha na-aṅụ ma mmanya ma sịga ebe a na-eme oriri na nkwari n’abalị. 2. Otu nwa agbọghọ ahụ nọzi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze soro ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ na-akparịta ụka, obi bụkwa ya sọ aṅụrị.

      Jehova enyerela ọtụtụ ndị aka, ha amalite idebe iwu ya. Ọ ga-enyekwara gịnwa aka

  • Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 6. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya

      Chọpụta ihe nyeere otu nwoke aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike’ (6:32)

      Foto abụọ si na vidio bụ́ ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike.’ 1. Ebe Dmitry na-ele karama mmanya anya. 2. Ebe Dmitry, nwunye ya, na nwa ha nwaanyị na-amụkọ Baịbụl ọnụ.
      • Na vidio a anyị lere, olee otú Dmitry si akpa àgwà ma ọ ṅụọ mmanya?

      • Ịkwụsị ịṅụ mmanya ọ̀ dịịrị ya mfe?

      • Olee otú o sizi mechaa kwụsị ịṅụ oké mmanya?

      Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:10, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee otú ịṅụ oké mmanya dịruru njọ?

      • Gịnị na-egosi na onye na-aṅụ oké mmanya nwere ike ịgbanwe?

      Gụọnụ Matiu 5:30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Mmadụ igbupụ aka ya Jizọs ji maa atụ ebe a na-egosi na anyị ga-agbasi mbọ ike hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee mee ihe Jehova chọrọ. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike?a

      Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na gị na ndị na-aṅụ oké mmanya na-akpa?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya