-
‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
-
-
3. Olee otú Belam nweruru ihe ịga nke ọma n’atụmatụ ya?
3 Atụmatụ ahụ ọ̀ dabara adaba? Ee, ọ dabatụrụ. Ọ ratara ọtụtụ iri puku ndị ikom Izrel, ‘ha na ndị inyom Moab enwee mmekọahụ rụrụ arụ.’ Ha malitere ife chi ndị Moab, nke gụnyere Bel nke Piọ na-asọ oyi, bụ́ chi ọmụmụ, ma ọ bụ chi mmekọahụ. N’ihi ya, iri puku ndị Izrel abụọ na puku anọ nwụrụ mgbe ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Nke ahụ bụ ọdachi dị egwu!—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9.
-
-
‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
-
-
4. Gịnị mere e ji rata ọtụtụ puku ndị Izrel ime omume rụrụ arụ?
4 Gịnị kpatara ọdachi ahụ? Ọtụtụ ndị Izrel malitere inwe ajọ obi site n’ịhapụ Jehova, bụ́ Chineke ahụ nke napụtara ha n’Ijipt, nye ha nri n’ala ịkpa, ma durute ha n’ọnụ ọnụ ala nkwa ahụ n’enweghị ọkọ kọrọ ha. (Ndị Hibru 3:12) Pọl onyeozi chetara ihe ahụ merenụ, ma dee, sị: “Ka anyị ghara ịna-akwa iko, dị ka ụfọdụ n’ime ha kwara iko, puku iri abụọ na atọ n’ime ha wee nwụọ n’otu ụbọchị.”a—1 Ndị Kọrịnt 10:8.
-
-
‘Gbaara Ịkwa Iko Ọsọ’“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
-
-
a O doro anya na mmadụ ole ahụ e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ gụnyere ma ‘ndị isi nke ndị Izrel,’ bụ́ ndị ndị ikpe gburu, ma ndị Jehova ji aka ya gbuo. Ndị ahụ ndị ikpe gburu nwere ike iru otu puku mmadụ.—Ọnụ Ọgụgụ 25:4, 5.
-