Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/1 p. 14-19
  • Ị Na-eguzogide Mmụọ nke Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Na-eguzogide Mmụọ nke Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Izere Mmụọ nke Ụwa nke A
  • Ngọsipụta nke “Mmụọ nke Ụwa”
  • Ụzọ Isi Guzogide Mmụọ nke Ụwa A
  • Guzogide “Mmụọ nke Ụwa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nata Mmụọ Chineke, Ọ Bụghị Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Ntorobịa—Guzogidenụ Mmụọ nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/1 p. 14-19

Ị Na-eguzogide Mmụọ nke Ụwa?

“Anyị onwe anyị anataghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Nke sitere na Chineke.”​—⁠1 NDỊ KỌRINT 2:12.

1, 2. Olee ọdachi metụtara gas na-egbu egbu mere na Bhopal, India, ma “gas” dị aṅaa nke na-egbu egbu karị ka a na-ekuru gburugburu ụwa?

N’OTU abalị dị jụụ na December 1984, ihe na-anwụ ibubo n’ahụ mere na Bhopal, India. N’obodo ahụ, e nwere otu ụlọ ọrụ mmepụta mmiri ọgwụ, n’abalị December ahụ kwa, otu nkwuchi ọnụ pọmpụ dị n’ime otu tankị e ji echebe gas mebiri. Ná mberede, ọtụtụ tọn nke mmiri ọgwụ methyl isocyanate malitere ịwụba n’ikuku. Ebe ikuku na-ebugharị ha, gas a na-egbu egbu kubara n’ọtụtụ ụlọ ma kukwasị ọtụtụ ezinụlọ na-ehi ụra. Ndị nwụrụ ruru ọtụtụ puku n’ọnụ ọgụgụ, ọtụtụ ndị ọzọ karị nwere nkwarụ. Ruo mgbe ahụ ọ bụ ihe mberede kasị njọ nke ụlọ ọrụ na-emepụta ihe.

2 Ndị mmadụ ruru újú mgbe ha nụrụ banyere Bhopal. Ma, n’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ ndị o gburu, gas ahụ kupụrụ n’ebe ahụ gburu ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ala karịa ndị a na-egbu n’ụzọ ime mmụọ site n’otu “gas” nke ndị mmadụ gburugburu ụwa na-ekuru kwa ụbọchị. Bible na-akpọ ya “mmụọ nke ụwa.” Ọ bụ ọnọdụ ahụ na-egbu egbu nke Pọl ji tụnyere mmụọ nke sitere n’ebe Chineke nọ mgbe ọ sịrị: “Ma anyị onwe anyị anataghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Nke sitere na Chineke; ka anyị wee mata ihe nile Chineke weere amara nye anyị.”​—⁠1 Ndị Kọrint 2:12.

3. Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa”?

3 Gịnị kpọmkwem bụ “mmụọ nke ụwa”? Dị ka akwụkwọ The New Thayer’s Greek English Lexicon of the New Testament na-ekwu, okwu ahụ bụ́ “mmụọ” (Grik, pneuʹma) na-apụtakarị “ọnọdụ uche ma ọ bụ ikike nke na-emejupụta ma na-achịkwa mkpụrụ obi nke onye ọ bụla.” Mmadụ pụrụ inwe mmụọ, ma ọ bụ ọnọdụ uche, dị mma ma ọ bụ dị njọ. (Abụ Ọma 51:10; 2 Timoti 4:22) Otu ìgwè ndị mmadụ pụkwara inwe mmụọ, ma ọ bụ ọnọdụ uche nke na-achịkwa ya. Onyeozi bụ́ Pọl degaara enyi ya bụ Faịlimọn akwụkwọ, sị: “Ka amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.” (Faịlimọn 25) N’ụzọ yiri nke ahụ​—⁠ma bụrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu⁠—​ụwa n’ozuzu nwere mmụọ nke na-achịkwa ya, nke a bụkwa “mmụọ nke ụwa” nke Pọl zoro aka na ya. Dị ka akwụkwọ Vincent bụ́ Word Studies in the New Testament na-ekwu, “okwu ahụ pụtara ụkpụrụ nke ihe ọjọọ nke na-akwanye ụwa nke na-enweghị mmekwata ọkụ.” Ọ bụ ọchịchọ mmehie na-ejupụta echiche ụwa nke a ma na-enwe mmetụta siri ike n’ụzọ ndị mmadụ si akpa àgwà.

4. Ònyè bụ isi iyi nke mmụọ nke ụwa, mmetụta dị aṅaa ka mmụọ nke a na-enwekwa n’ahụ ụmụ mmadụ?

4 Mmụọ nke a na-egbu egbu. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-esite n’aka “onye isi ụwa nke a,” Setan. N’ezie, a kpọrọ ya “onye isi nke ike nke mbara eluigwe . . . bụ́ mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a.” (Jọn 12:31; Ndị Efesọs 2:2) O siri ike ịgbanarị “ikuku,” ma ọ bụ “mmụọ nke a nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a.” Ọ dị ebe nile n’etiti ọha mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ekuru ya, anyị na-amalite ịnakwere àgwà ya, nzube ya. Mmụọ nke ụwa na-agba ume ‘ịdị ndụ dị ka anụ ahụ si chọọ,’ ya bụ, n’ikwekọ n’ezughị okè mmehie anyị. Ọ bụ ihe na-eweta ọnwụ, “n’ihi na a sị na unu na-adị ndụ dị ka anụ ahụ si chọọ, unu gaje ịnwụ.”​—⁠Ndị Rom 8:13.

Izere Mmụọ nke Ụwa nke A

5. Olee otú otu Onyeàmà si jiri amamihe mee ihe n’oge ọdachi ahụ mere na Bhopal?

5 N’oge ọdachi ahụ na Bhopal, ụda opi saịrini na ajọ ísì nke gas ahụ na-egbu egbu kpọtere otu Onyeàmà Jehova n’ụra. N’egbughị oge ọ bụla ọ kpọtere ndị ezinụlọ ya ma kpọpụ ha ngwa ngwa n’okporo ámá. N’ikwụsị nke nta iji mara ebe ikuku ahụ na-eche ihu, ọ gbalịsiri ike isi n’etiti ìgwè mmadụ ahụ nọ n’ọgba aghara gafere ma duje ezinụlọ ya n’elu otu ugwu dị ná mpụga obodo ahụ. N’ebe ahụ ha nwere ike iji ikuku ọma, nke dị ọcha sitere n’ọdọ mmiri dị nso mejupụta akpa ume ha.

6. Ebee ka anyị pụrụ ịga iji gbanarị mmụọ nke ụwa?

6 È nwere ebe e buliri elu anyị pụrụ ịga maka nchebe site ‘n’ikuku’ na-egbu egbu nke ụwa nke a? Bible na-asị na e nwere. N’ilepụ anya gaa n’ụbọchị anyị, Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile: n’ihi na Zaịọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jerusalem pụta.” (Aịsaịa 2:​2, 3) Ebe e buliri elu nke ofufe dị ọcha, “ugwu nke ụlọ Jehova” ahụ e buliri elu, bụ ebe e nwere nanị ya na mbara ụwa a nke nnwere onwe pụọ ná mmụọ na-akpachi ume, nke na-egbu egbu nke ụwa nke a. Ọ bụ n’ebe ahụ ka mmụọ Jehova na-eru n’enweghị mgbochi n’etiti ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi.

7. Olee otú e siworo zọpụta ọtụtụ ndị site na mmụọ nke ụwa?

7 Ọtụtụ ndị na-ekurubu mmụọ nke ụwa nke a na-enwe ahụ efe yiri ahụmahụ nke Onyeàmà ahụ nọ na Bhopal. Mgbe o kwusịrị banyere “ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye” na-ekuru ikuku, ma ọ bụ mmụọ, nke ụwa nke a, Pọl onyeozi sịrị: “Ndị anyị onwe anyị nile bikwara obi n’etiti ha n’oge gara aga n’ime agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ anyị, na-eme ihe nile anụ ahụ anyị na echiche uche anyị chọrọ, bụrụkwa ụmụ nke iwe dị ka e si mụọ anyị, dị ka ndị fọdụrụ bụkwa:​—⁠ma Chineke, ebe ọ bụ ọgaranya n’ebere, n’ihi oké ịhụnanya Ya ọ hụrụ anyị, O mere ka anyị na Kraịst dịkọọ ndụ.” (Ndị Efesọs 2:​3-⁠5) Ndị na-ekuru nanị ikuku na-egbu egbu nke usoro ihe nke a nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, site n’enyemaka Jehova, ọtụtụ nde taa na-agbaba n’ebe ime mmụọ ahụ dị elu ma na-agbanarị ọnọdụ ahụ na-egbu egbu.

Ngọsipụta nke “Mmụọ nke Ụwa”

8, 9. (a) Gịnị na-egosi na anyị aghaghị ịnọ ná nche mgbe nile megide mmụọ nke ụwa? (b) Olee otú mmụọ Setan pụrụ isi merụọ anyị?

8 Ikuku na-eweta ọnwụ nke Setan ka na-erugharị gburugburu anyị. Anyị aghaghị ịnọ na nche ma ghara ịkpafu mgbe ọ bụla gbadaa ala, baghachi n’ụwa, ma eleghị anya bụrụ ndị a tọchiri akpịrị ime n’ụzọ ime mmụọ. Nke a na-achọ ịnọ na nche mgbe nile. (Luk 21:36; 1 Ndị Kọrint 16:13) Tụlee, dị ka ihe atụ, eziokwu nke a. Ndị Kraịst nile maara ụkpụrụ omume nile nke Jehova nke ọma, ha agaghịkwa ekwe ma ọlị na omume ndị na-adịghị ọcha dị ka ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye, ịkwa iko, na ndina ụdị onwe bụ ihe ndị a na-anakwere. Ma, kwa afọ a na-achụpụ ihe dị ka 40,000 mmadụ site ná nzukọ Jehova. N’ihi gịnị? N’ọtụtụ ọnọdụ n’ihi otu omume ndị a na-adịghị ọcha. Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee?

9 N’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. Anụ ahụ adịghị ike, anyị aghaghịkwa ịlụso ọchịchọ ọjọọ ndị na-ebilite n’obi anyị ọgụ mgbe mgbe. (Eklisiastis 7:20; Jeremaịa 17:9) Otú ọ dị, ọchịchọ ọjọọ ndị ahụ bụ́ ndị mmụọ nke ụwa na-agba ume. Ọtụtụ ndị n’ụwa a adịghị ahụ ihe ọ bụla dị njọ n’omume rụrụ arụ, echiche nke onye mere otú masịrị ya bụkwa akụkụ nke ọnọdụ uche nke usoro ihe Setan. Ọ bụrụ na anyị ekpughepụ onwe anyị nye echiche dị otú ahụ, e nwere nnọọ ohere dị ukwuu nke na anyị ga-amalite iche echiche dị ka ụwa. N’oge na-adịghị anya, echiche ndị na-adịghị ọcha dị otú ahụ pụrụ ịmịpụta ọchịchọ ndị dị njọ bụ́ ndị ga-emesịa duba ná mmehie dị oké njọ. (Jemes 1:​14, 15) Anyị ga-esiworị n’ugwu ofufe dị ọcha nke Jehova kpafuo banye n’ebe ala ala e merụrụ emerụ nke ụwa Setan. Ọ dịghị onye ji ọchịchọ obi onwe ya nọgide ebe ahụ nke ga-enweta ndụ ebighị ebi.​—⁠Ndị Efesọs 5:​3-5, 7.

10. Gịnị bụ otu ngosipụta nke ikuku Setan, n’ihi gịnịkwa ka ndị Kraịst kwesịrị iji zere ya?

10 Mmụọ nke ụwa na-apụta ìhè gburugburu anyị. Dị ka ihe atụ, e nwere àgwà nke akwanyeghị ùgwù, nke ịkwa emo, nke ọtụtụ ndị ji eche ndụ ihu. N’ịbụ ndị ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ ma ọ bụ ndị na-erughị ihe a chọrọ na ndị ndú okpukpe na-eme omume rụrụ arụ, ndị dị anyaukwu, mere ka ha nwee nkụda mmụọ, ha na-ekwu okwu n’enweghị nsọpụrụ banyere ọbụna ihe ndị dị mkpa. Ndị Kraịst na-eguzogide àgwà nke a. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe omume ime ihe ọchị nke dị mma, anyị na-ezere iwebata mmụọ ịkwa emo nke enweghị nkwanye ùgwù n’ọgbakọ. Okwu ọnụ nke onye Kraịst na-egosi egwu Jehova na ịdị ọcha nke obi. (Jemes 3:​10, 11; tụlee Ilu 6:14.) Ma anyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị meworo okenye, okwu anyị kwesịrị ịbụ ihe “dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ, ka [anyị] wee mata otú [anyị] na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.”​—⁠Ndị Kọlọsi 4:6.

11. (a) Gịnị bụ akụkụ nke abụọ nke mmụọ nke ụwa? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji dị iche n’ebe ndị na-egosipụta akụkụ nke a nọ?

11 Ọchịchọ ọzọ a na-ahụkarị nke na-egosipụta mmụọ nke ụwa nke a bụ ịkpọasị. Mkpọrọmasị na esemokwu ọkpụtọrọkpụ dị iche iche ndị dabeere n’ọdịiche agbụrụ, ebo, mba, na ọbụna ndịrịta iche nke ndị mmadụ kewasịrị ụwa. Lee nnọọ ka ihe si aka mma n’ebe mmụọ Chineke na-arụ ọrụ! Pọl onyeozi dere, sị: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Burunụ ụzọ na-eche ihe ọma n’ihu mmadụ nile. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru. Ma ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, na-azụ ya; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, gị mee ka ọ ṅụọ mmiri: n’ihi na n’ime nke a ị ga-agụkwasị icheku na-ere ọkụ n’isi ya. Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”​—⁠Ndị Rom 12:​17-⁠21.

12. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji ezere ịhụ ihe onwunwe n’anya?

12 Mmụọ nke ụwa a na-akwalitekwa ịhụ ihe onwunwe n’anya. N’ịbụ ndị ụwa azụmahịa gbara ume, ọtụtụ ndị abụrụwo ndị tinyebigara uche ókè n’inweta ihe ndị kasị gbaa ọhụrụ, ákwà kasị gbaa ọhụrụ, ụdị ụgbọ ala kasị gbaa ọhụrụ. Ha abụrụwo ohu nye “agụụ ihe ọjọọ nke anya.” (1 Jọn 2:16) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-eji otú ụlọ ha ma ọ bụ ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ ha hà na-atụ ihe ịga nke ọma ha ná ndụ ọ̀tụ̀tụ̀. Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekuru ikuku ime mmụọ nke dị ọcha n’elu ugwu Jehova e buliri elu nke ofufe dị ọcha, na-eguzogide ọnọdụ uche nke a. Ha matara na mkpebi siri ike ịchụso ihe onwunwe pụrụ iweta ịla n’iyi. (1 Timoti 6:​9, 10) Jisọs chetaara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.”​—⁠Luk 12:15.

13. Olee ngosipụta ụfọdụ ndị ọzọ nke mmụọ nke ụwa nke a?

13 E nwere ngosipụta ndị ọzọ nke “ikuku” ọjọọ nke ụwa a. Otu bụ mmụọ nke nnupụisi. (2 Timoti 3:​1-⁠3) Ị̀ rịbawo ama na ọtụtụ ndị adịkwaghị ekwenyere ndị isi? Ị̀ hụtawo n’ebe ị na-arụ ọrụ omume ahụ gbasara ebe nile nke arụghị ọrụ ma ọ bụghị ma e nwere onye na-ele anya n’ezie? Mmadụ ole ka ị maara bụ́ ndị mebiworo iwu​—⁠ma eleghị anya ghọọ aghụghọ n’ụtụ isi ha ma ọ bụ zuru ihe n’ebe ọrụ? Ọ bụrụ na ị ka na-aga akwụkwọ, è mewo ka i nwee nkụda aka n’ịgbalị ókè nile i nwere ike n’ihi na ụmụ klasị ibe gị na-eleda ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’agụmakwụkwọ anya? Ihe ndị a nile bụ ngosipụta nke mmụọ nke ụwa nke ndị Kraịst na-aghaghị iguzogide.

Ụzọ Isi Guzogide Mmụọ nke Ụwa A

14. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst dị iche n’ebe ndị na-abụghị ndị Kraịst nọ?

14 Otú ọ dị, olee ụzọ anyị ga-esi guzogide mmụọ nke ụwa ebe anyị bi kpọmkwem n’ime ụwa? Anyị ga-echeta na n’agbanyeghị ebe anyị nọ n’anụ ahụ, n’ụzọ ime mmụọ anyị abụghị akụkụ nke ụwa. (Jọn 17:​15, 16) Ihe mgbaru ọsọ anyị abụghị ihe mgbaru ọsọ ndị nke ụwa nke a. Otú anyị si ele ihe anya dị iche. Anyị bụ ndị mmụọ nsọ na-achị, na-ekwu okwu na-echekwa echiche “ọ bụghị n’okwu nke amamihe mmadụ na-ezi, kama n’okwu nke Mmụọ Nsọ na-ezi; anyị na-ewerekwa ihe nke Mmụọ Nsọ tụlee ihe nke Mmụọ Nsọ.”​—⁠1 Ndị Kọrint 2:13.

15. Olee otú anyị pụrụ isi guzogide mmụọ nke mmụọ?

15 Gịnị ka mmadụ pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ hụ onwe ya n’ebe gas na-egbu egbu metọrọ? Ọ pụrụ iyiri ihe na-egbochi gas nke a kwụnyere ihe na-eweta ikuku dị ọcha, ma ọ bụ ọ pụrụ iwezụga onwe ya n’ebe ahụ n’ụzọ nkịtị. Ụzọ isi zere ikuku Setan na-ejikọta ụzọ ime ihe ndị a. Ruo ókè o kwere mee, anyị ga-agbalị iwezụga onwe anyị n’ụzọ nkịtị pụọ n’ihe ọ bụla ga-eme ka mmụọ nke ụwa nwee ike inwe mmetụta n’echiche anyị. Otú a, anyị na-ezere mkparịta ọjọọ, anyị adịghịkwa ekpughepụ onwe anyị nye ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-akwalite ime ihe ike, omume rụrụ arụ, mgbaasị, nnupụisi, ma ọ bụ ọrụ ọ bụla ọzọ nke anụ ahụ. (Ndị Galetia 5:​19-⁠21) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị bi n’ime ụwa, anyị apụghị izere kpam kpam ịbụ ndị e kpughepụrụ nye ihe ndị a. Ya mere, anyị na-eme ihe n’amamihe ma ọ bụrụ na anyị akwụnye onwe anyị n’ebe a na-enweta ikuku ime mmụọ dị ọcha. Anyị ga-emejupụta akpa ume ime mmụọ anyị, dị ka a pụrụ ikwu ya, site n’ịbịachi nzukọ anya, ọmụmụ ihe onwe onye, ihe omume na mkpakọrịta ndị Kraịst, na ekpere. N’ụzọ dị otú a, ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ikuku Setan esibata n’akpa ume ime mmụọ anyị, mmụọ Chineke ga-ewusi anyị ike ịjụ ya.​—⁠Abụ Ọma 17:​1-⁠3; Ilu 9:9; 13:20; 19:20; 22:17.

16. Olee otú anyị si enye ihe àmà nke inwe mmụọ Chineke?

16 Mmụọ Chineke na-eme ka onye Kraịst ghọọ onye guzopụrụ nnọọ iche site ná ndị bụ akụkụ nke ụwa nke a. (Ndị Rom 12:​1, 2) Pọl sịrị: “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:​22, 23) Mmụọ Chineke na-enyekwa onye Kraịst nghọta dị omimi karị nke ihe dị iche iche. Pọl sịrị: “Ọ dịghị onye maara ihe nke Chineke ma ọ bụ Mmụọ nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:11) N’echiche chịkọtara ihe dum, “ihe nke Chineke” gụnyere eziokwu ndị dị ka àjà mgbapụta ahụ, Alaeze Chineke n’okpuru Jisọs Kraịst, olileanya nke ndụ ebighị ebi, na mwepụ nke ụwa ọjọọ nke a nke dị nso. Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ndị Kraịst maara ma na-anakwere ihe ndị a dị ka eziokwu, nke a na-emekwa ka ụzọ ha si ele ndụ anya dị iche na nke ndị ụwa. Afọ juru ha n’ọṅụ ha na-enweta n’ijere Jehova ozi ugbu a, n’olileanya nke ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi na-abịa.

17. Ònye guzobere ihe atụ nlereanya kasị mma n’iguzogide mmụọ nke ụwa, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

17 Jisọs bụ ihe atụ nlereanya kasị mma nye ndị na-eguzogide mmụọ nke ụwa nke a. Ngwa ngwa e mesịrị Jisọs baptism, Setan nwara ịkpara ya pụọ n’ijere Jehova ozi site n’iche ya ọnwụnwa atọ n’ihu. (Matiu 4:​1-⁠11) Nke ikpeazụ gụnyere ohere nke na Jisọs pụrụ inweta ịchịisi nke ụwa dum dị ka ihe nrite maka nanị otu ihe omume ofufe nye Setan. Jisọs pụrụ icheworị sị: ‘Ọ dị mma, m ga-akpọ isiala, mgbe m nwetasịkwara ịchịisi nke ụwa, m ga-echegharị ma laghachi n’ife Jehova. Dị ka onye isi ụwa, m ga-anọ n’ọnọdụ ka mma nke ukwuu ịbara ihe a kpọrọ mmadụ uru karịa ka m na-abara ya ugbu a dị ka ọkwá nkà si Nazaret.’ Jisọs echeghị otú ahụ. Ọ dị njikere ichere ruo mgbe Jehova nyere ya ịchịisi ụwa. (Abụ Ọma 2:8) N’oge ahụ, nakwa n’oge nile ọzọ ná ndụ ya, o guzogidere mmetụta na-egbu egbu nke ikuku Setan. Otú a, o meriri ụwa nke a e metọrọ emetọ n’ụzọ ime mmụọ.​—⁠Jọn 16:33.

18. Olee otú anyị iguzogide mmụọ nke ụwa si ewetara Chineke otuto?

18 Pita onyeozi sịrị na anyị kwesịrị ịgbasochi nzọụkwụ Jisọs anya. (1 Pita 2:21) Olee ihe atụ ka mma anyị pụrụ inwe? Ná mgbe ikpeazụ ndị a, nke mmụọ nke ụwa na-akpa ike na ya, ụmụ mmadụ na-emiwanye emi n’omume ọjọọ. Lee nnọọ ihe ịtụnanya ọ bụ na n’etiti ụwa dị otú a, ebe e buliri elu nke ofufe Jehova na-eguzopụ iche n’ịdị ọcha na enweghị mmerụ! (Maịka 4:​1, 2) N’ezie, a na-ahụta ike nke mmụọ Chineke n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ na-enuga n’ebe ofufe Chineke, na-eguzogide mmụọ nke ụwa nke a jupụtara ebe nile ma na-ewetara Jehova nsọpụrụ na otuto! (1 Pita 2:​11, 12) Ka anyị nile kpebisie ike ịnọgide n’ebe ahụ e buliri elu ruo mgbe Eze e tere mmanụ nke Jehova wepụsịrị ụwa ọjọọ nke a ma tụba Setan Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abyss. (Mkpughe 19:19–20:3) Mgbe ahụ, mmụọ nke ụwa nke a agaghị adịkwa ọzọ. Lee nnọọ oge a gọziri agọzi nke ahụ ga-abụ!

Ị Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị bụ mmụọ nke ụwa?

◻ Mmetụta dị aṅaa ka mmụọ nke ụwa na-enwe n’ahụ ndị mmadụ n’otu n’otu?

◻ Olee ngosipụta ụfọdụ nke mmụọ nke ụwa, oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ya?

◻ Olee otú anyị si egosipụta na anyị nwere mmụọ Chineke?

◻ Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịara ndị na-eguzogide mmụọ nke ụwa?

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Mmụọ nke ụwa sitere n’aka Setan

Iji zere mmụọ nke ụwa, gbalaga n’ebe e buliri elu nke ofufe Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya