Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Ndị Kraịst n’Inwere Onwe
“Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.”—2 NDỊ KỌRINT 3:17.
1. Ònye ka Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye, n’ihi gịnịkwa ka ha ji eji ụlọ ọrụ iwu kwadoro na-eme ihe?
NDỊÀMÀ JEHOVA kweere na okpukpe ha ga-adịru ebighị ebi. Ya mere ha na-atụ anya ijere Chineke ozi “n’ime mmụọ na eziokwu” ruo mgbe nile ebighị ebi. (Jọn 4:23, 24) Dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, ndị Kraịst a emewo nraranye a na-akparaghị ókè nye Jehova Chineke ma kpebisie ike ibi ndụ kwekọrọ na ya. Iji mezuo nke ahụ, ha na-adabere n’Okwu Chineke nakwa na mmụọ nsọ ya. Ka ha ji obi ha nile na-achụso ụzọ nke nraranye ndị Kraịst ha n’inwe onwe nke Chineke nyere, Ndịàmà na-egosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ọrụ “ndị na-achị isi” nke gọọmenti, jirikwa ụzọ ndị iwu kwadoro na ndokwa dị iche iche na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ndị Rom 13:1; Jemes 1:25) Dị ka ihe atụ, Ndịàmà na-eji Watch Tower Society eme ihe dị ka ngwá ọrụ iwu kwadoro—otu n’ime ọtụtụ dị n’ala dị iche iche—iji nyere ha aka ịrụzu ọrụ ha nke inyere ndị mmadụ ibe ha aka, karịsịa n’ụzọ ime mmụọ. Ma Ndịàmà raara onwe ha nye Chineke, ọ bụghị nye ụlọ ọrụ iwu ọ bụla, nrara ha raara onwe ha nye Jehova ga-adịrukwa ebighị ebi.
2. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji enwe ekele maka Watch Tower Society na ụlọ ọrụ iwu kwadoro ndị yiri ya?
2 Dị ka ndị na-eje ozi raara onwe ya nye Chineke, ọ bụ iwu na Ndịàmà Jehova ga-agbaso ntụziaka Jisọs ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ, na-ezi ha ihe.’ (Matiu 24:19, 20) Ọrụ a ga-aga n’ihu ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe a, n’ihi na Jisọs sịkwara: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:3, 14) Kwa afọ, ebe obibi akwụkwọ nke Watch Tower Society na ụlọ ọrụ ndị ọzọ yiri ya iwu kwadoro na-ewepụtara Ndịàmà Jehova ọtụtụ nde Bible, akwụkwọ, broshuọ, na magazin maka iji ha eme ihe n’ọrụ nkwusa ha zuru ụwa ọnụ. Ya mere ụlọ ọrụ ndị a iwu kwadoro bara oké uru n’inyere ndị na-ejere Chineke ozi raara onwe ha nye aka ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye ya.
3. N’echiche dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ejibu okwu bụ́ “Society” eme ihe?
3 Mmadụ pụrụ ịrụ ụka na ụzọ Ndịàmà na-esi ekwu banyere Watch Tower Society—ma ọ bụ ọtụtụ mgbe nanị “Society”—na-egosi na ha weere ya dị ka ihe karịrị ngwá ọrụ iwu kwadoro. Ọ̀ bụ na ha adịghị ewere ya dị ka okwuchaa o bie n’okwu metụtara ofufe? Akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom mere ka isi ihe a doo anya site n’ịkọwa: “Mgbe Ụlọ Nche [June 1, 1938] zoro aka n’ebe ‘Society’ dị, nke a pụtara, ọ bụghị nanị ngwá ọrụ iwu kwadoro, kama ìgwè ndị Kraịst e tere mmanụ nke guzobeworo òtù ahụ iwu kwadoro ma jiri ya na-eme ihe.”a Ya mere okwu ahụ nọchiri anya “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Ọ bụ n’echiche a ka Ndịàmà n’ozuzu ha jiri okwu ahụ bụ́ “Society” mee ihe. N’ezie, ngwá ọrụ iwu kwadoro na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” abụghị okwu ndị a pụrụ ịgbanwerịta agbanwerịta. A na-ahọpụta ndị nduzi nke Watch Tower Society site ná ntụli aka, ma, ọ bụ mmụọ nsọ na-ahọpụta Ndịàmà mejupụtara ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.’
4. (a) Olee otú ọtụtụ Ndịàmà na-esi ekwu okwu iji zere nghọtahie? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ezi nguzo n’ihe banyere okwu e ji eme ihe?
4 Iji zere nghọtahie, Ndịàmà Jehova na-agbalị ilezi anya otú ha na-esi ekwupụta echiche ha. Kama ịsị, “Society na-ezi,” ọtụtụ Ndịàmà na-ahọrọ iji okwu ndị dị ka, “Bible na-asị” ma ọ bụ, “M na-aghọta na Bible na-ezi” na-eme ihe. N’ụzọ dị otú a ha na-emesi ike mkpebi onwe onye nke Onyeàmà ọ bụla meworo n’ịnakwere ozizi Bible nakwa izere inye echiche na-ezighị ezi na n’ụzọ ụfọdụ Ndịàmà aghaghị ịgbaso nduzi nke otu ịrọ òtù okpukpe. Otú ọ dị, aro banyere okwu e ji eme ihe ekwesịtụghị ịghọ ihe a ga-esere okwu. E kwuwerị, okwu e ji eme ihe dị mkpa nanị ruo n’ókè nke na ọ na-egbochi nghọtahie. A chọrọ nguzozi ndị Kraịst. Bible na-adọ anyị aka ná ntị ‘ịghara ise okwu banyere okwu efu.’ (2 Timoti 2:14, 15) Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa ụkpụrụ a: “Ọ bụrụ na unu ejighị ire kwuo okwu dị mfe ịghọta, à ga-esi aṅaa mara ihe a na-ekwu?”—1 Ndị Kọrint 14:9.
Mmụọ Chineke Na-ebelata Mkpa Maka Ụkpụrụ Nduzi
5. Olee otú a ga-esi aghọta 1 Ndị Kọrint 10:23?
5 “Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile bara uru,” ka Pọl onyeozi kwuru. Ọ gbakwụnyere: “Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile na-ewuli mmadụ elu dị ka ụlọ.” (1 Ndị Kọrint 10:23) O doro anya na Pọl ebughị n’uche na o ziri ezi n’iwu ime ihe ndị Okwu Chineke katọrọ hoo haa. E jiri ha tụnyere ihe dị ka iwu 600 e nyere Israel oge ochie, e nwere nnọọ iwu ole na ole doro anya ndị na-achịkwa ndụ ndị Kraịst. N’ihi ya, a hapụụrụ akọ na uche mmadụ ọtụtụ okwu. Onye rarawooro onwe ya nye Jehova na-enweta nnwere onwe nke na-esite ná nduzi mmụọ Chineke. Ebe o meworo eziokwu ahụ nke ya, onye Kraịst na-agbaso akọ na uche ya e ji Bible zụọ ma na-adabere ná nduzi Chineke site na mmụọ nsọ. Nke a na-enyere onye Kraịst raara onwe ya nye aka ikpebi ihe ‘ga-ewuli elu’ ma ‘baa uru’ maka ya onwe ya na ndị ọzọ. Ọ na-aghọta na mkpebi ndị ọ na-eme ga-emetụta mmekọrịta ya na Chineke, bụ́ onye ọ raara onwe ya nye.
6. Ná nzukọ ndị Kraịst, olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị emewo eziokwu ahụ nke anyị?
6 Onyeàmà na-egosi na ya emewo eziokwu ahụ nke ya site n’ịza ajụjụ ná nzukọ ndị Kraịst. Na mbụ, ọ pụrụ ịgụpụtaghachi ihe e kwuru na mbipụta a na-amụ. Otú ọ dị, ka oge na-aga ọ ga-enwe ọganihu ruo n’ókè nke iji okwu nke aka ya kwupụta ozizi Bible. Ọ na-esi otú a na-enye ihe àmà na ọ na-azụlite ikike iche echiche ya, ọ bụghị nanị ikwughachi ihe ndị ọzọ kwuworo. Ichepụta echiche n’okwu nke onwe ya na ikwupụta okwu ziri ezi nke eziokwu n’ụzọ si n’ala ala obi ga-eme ya obi ụtọ ma na-egosi na o kwetara n’uche ya.—Eklisiastis 12:10; tụlee Ndị Rom 14:5b.
7. Mkpebi ndị dị aṅaa ka ndị ohu Jehova meworo ná nnwere onwe?
7 Ịhụnanya maka Chineke na ndị mmadụ ibe ha na-akwali Ndịàmà Jehova. (Matiu 22:36-40) N’eziokwu, ihe nkekọ nke ịhụnanya yiri nke Kraịst na-ejikọ ha ọnụ dị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (Ndị Kọlọsi 3:14; 1 Pita 5:9) Ma dị ka onye nweere onwe ya ime nhọrọ, onye nke ọ bụla ekpebiwo n’onwe ya ikwupụta ozi ọma nke Alaeze Chineke, ịnọgide na-anọpụ iche ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịjụ ọbara, izere ụdị ntụrụndụ ụfọdụ, nakwa ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Ndị a abụghị mkpebi ndị a manyere ha ime. Ha bụ mkpebi ndị dabara n’ụzọ ndụ nke ndị gaje ịbụ Ndịàmà ji ọchịchọ ha họrọ tupu ha eweredị nzọụkwụ nke nraranye ndị Kraịst.
À Ga-aza Òtù Na-achị Isi Ajụjụ?
8. Olee ajụjụ ọ dị mkpa ka e mee ka o doo anya?
8 Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ezi ndị Kraịst adịghị ejere Chineke ozi ná mmanye. Ọ na-asị: “Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ: ma ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ma olee otú a pụrụ isi mee ka eziokwu a kwekọọ n’echiche nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ya na Òtù Na-achị Isi ya?—Matiu 24:45-47.
9, 10. (a) Olee otú ụkpụrụ ịbụisi si emetụta ọgbakọ ndị Kraịst? (b) Olee ihe ịgbaso ụkpụrụ ịbụisi mere ka ọ dị mkpa n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ?
9 Iji zaa ajụjụ a, anyị aghaghị iburu n’uche ụkpụrụ ịbụisi nke Akwụkwọ Nsọ. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ná Ndị Efesọs 5:21-24, a kọwara Kraịst dị ka “isi nzụkọ Ya,” onye ọ nọ “n’okpuru” ya. Ndịàmà Jehova na-aghọta na ụmụnna ime mmụọ Jisọs mejupụtara ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. (Ndị Hibru 2:10-13) A họpụtawo òtù ohu a kwesịrị ntụkwasị obi inye ndị Chineke ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ N’oge ọgwụgwụ a, Kraịst ahọpụtawo ohu a ịbụ “onye isi ihe nile o nwere.” Ya mere ọnọdụ ohu a kwesịrị ka onye ọ bụla na-azọrọ ịbụ onye Kraịst na-akwanyere ya ùgwù.
10 Nzube nke ịbụisi bụ ichekwa ịdị n’otu na ịhụ na ‘e mere ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.’ (1 Ndị Kọrint 14:40) Iji mezuo nke a na narị afọ mbụ, a họọrọ ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ sitere n’òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche ịnọchite anya ìgwè ahụ nile. Dị ka ihe ndị merenụ ka oge na-agafe na-egosi, nlekọta nke òtù na-achị isi a nke narị afọ mbụ nwere nkwado na ngọzi Jehova. Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji obi ụtọ nakwere ndokwa ahụ. Ee, n’ezie ha nabatara ma nwee ekele maka ezi ihe ndị ọ rụpụtara.—Ọrụ 15:1-32.
11. Olee otú e kwesịrị isi ewere Òtù Na-achị Isi nke oge a?
11 Uru nke ụdị ndokwa ahụ ka dịkwa. N’oge a, ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ ndị Kraịst iri e tere mmanụ, ndị nwechara ọtụtụ iri afọ nke ahụmahụ ndị Kraịst. Ha na-enye Ndịàmà Jehova ntụzi ime mmụọ, dị ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ mere. (Ọrụ 16:4) Dị ka ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà ji obi ụtọ na-elegara ụmụnna a tozuru okè nke Òtù Na-achị Isi anya maka ntụzi na nduzi dabeere na Bible n’ihe metụtara ofufe. Ọ bụ ezie na ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụ ndị na-ejere Jehova na Kraịst ozi, dị ka ndị Kraịst ibe ha bụ, Bible na-atụziri anyị, sị: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghị[rị] unu uru.”—Ndị Hibru 13:17.
12. Ònye ka onye Kraịst ọ bụla na-aghaghị ịza ajụjụ?
12 Ọnọdụ nlekọta nke Akwụkwọ Nsọ nyere Òtù Na-achị Isi ọ̀ pụtara na onye nke ọ bụla n’ime Ndịàmà Jehova aghaghị ịza ajụjụ maka ọrụ ya nye ya? O kwekọghị n’okwu Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom: “Gị onwe gị, gịnị mere ị na-ekpe nwanna gị ikpe? ma ọ bụ gị onwe gịkwa, gịnị mere ị na-akpọ nwanna gị ihe efu? n’ihi na anyị nile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke . . . Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.”—Ndị Rom 14:10-12.
13. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eji enye akụkọ ọrụ nkwusa ha?
13 Otú ọ dị, ọ́ bụghị eziokwu na a na-atụ anya ka Ndịàmà n’otu n’otu nye akụkọ ọrụ nkwusa ha? Ee, ma a kọwara nzube nke a n’ụzọ doro anya n’otu akwụkwọ nta Ndịàmà, bụ́ nke na-asị: “Ndị mbụ soro ụzọ Jisọs Kraịst nwere mmasị n’akụkọ ọganihu dị iche iche n’ọrụ nkwusa ahụ. (Mak 6:30) Ka ọrụ ahụ na-aga n’ihu, a chịkọtara akụkọ ọnụ ọgụgụ dị iche iche ya na akụkọ nke ahụmahụ ndị gbara ọkpụrụkpụ nke ndị na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ. . . . (Ọrụ 2:5-11, 41, 47; 6:7; 1:15; 4:4) . . . Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume nye ndị ọrụ ndị Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ịnụ akụkọ nke ihe a na-arụzu! . . . N’otu aka ahụ, nzukọ Jehova nke oge a na-agba mbọ idebe ihe ndekọ zuru ezu nke ọrụ a na-arụ ná mmezu nke Matiu 24:14.”
14, 15. (a) Olee otú 2 Ndị Kọrint 1:24 si na-emetụta Òtù Na-achị Isi? (b) Ná ndabere dị aṅaa ka onye Kraịst ọ bụla na-aghaghị ime mkpebi onwe onye, n’ịghọta eziokwu dị aṅaa?
14 Òtù Na-achị Isi bụ ndokwa ịhụnanya na ihe nlereanya nke okwukwe kwesịrị nṅomi. (Ndị Filipaị 3:17; Ndị Hibru 13:7) Site na ha ịrapara na ịgbaso Kraịst dị ka ihe nlereanya, ha pụrụ ikwughachi okwu Pọl: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị sooro unu na-arụta ọṅụ unu: n’ihi na unu ji okwukwe unu guzo.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Site n’ikiri ihe na-emenụ, Òtù Na-achị Isi na-adọrọ uche gaa n’uru nke ịṅa ntị ná ndụmọdụ Bible, na-atụ aro banyere itinye iwu na ụkpụrụ Bible n’ọrụ, na-adọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị zoro ezo, ma na-enye ‘ndị so ha na-arụ ọrụ’ agbamume dị ha mkpa. O si otú a na-arụzu ọrụ nlekọta ndị Kraịst ya, na-enyere ha aka ijigide ọṅụ ha, na-ewulikwa ha elu n’okwukwe ka ha wee nwee ike iguzosi ike.—1 Ndị Kọrint 4:1, 2; Taịtọs 1:7-9.
15 Ọ bụrụ na Onyeàmà emee mkpebi ndị dabeere ná ndụmọdụ Bible nke Òtù Na-achị Isi nyere, ọ na-eme otú ahụ n’ọchịchọ onwe ya n’ihi na ọmụmụ ihe Bible onwe onye ya emewo ka o kweta na nke a bụ ụzọ kwesịrị ekwesị. Okwu Chineke na-enwe mmetụta n’ahụ Onyeàmà nke ọ bụla itinye ezi ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nke Òtù Na-achị Isi na-enye n’ọrụ, na-aghọtazu na mkpebi ndị ọ na-eme ga-emetụta mmekọrịta onwe onye ya na Chineke, bụ́ onye ọ raara onwe ya nye.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Ụmụ Akwụkwọ na Ndị Soja
16. Ọ bụ ezie na mkpebi metụtara àgwà bụ okwu dịịrị onwe onye, n’ihi gịnị ka e ji achụpụ ụfọdụ?
16 Ma ọ bụrụ na mkpebi banyere àgwà bụ okwu dịịrị onwe onye, n’ihi gịnị ka e ji achụpụ Ndịàmà Jehova ụfọdụ? Ọ dịghị onye na-ekpebi n’onwe ya na omume nke otu onye chọrọ nchụpụ. Kama, Akwụkwọ Nsọ chọrọ ka e mee nke a nanị mgbe onye òtù ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ n’enweghị nchegharị, dị ka ndị ahụ a kọwara ná Ndị Kọrint nke Mbụ isi nke 5. Ya mere, ọ bụ ezie na a pụrụ ịchụpụ onye Kraịst n’ihi ịkwa iko, nke a na-eme nanị ma ọ bụrụ na onye ahụ ajụ ịnabata enyemaka ime mmụọ nke ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya. (1 Ndị Kọrint 5:1-5, 9-13) Ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova na-agbaso omume ndị Kraịst a. The Encyclopedia of Religion na-asị: “Òtù ọ bụla na-azọrọ ikike nke ichebe onwe ya pụọ ná ndị òtù ya na-adịghị ekwekọ ekwekọ bụ́ ndị pụrụ iyi ọdịmma ha egwu. N’ọnọdụ okpukpe e mewo ka ikike a sie ike site n’ikwenye na mgbochi ahụ [nke nchụpụ] na-emetụta nguzo mmadụ n’ebe Chineke nọ.”
17, 18. Olee otú a pụrụ isi mee ihe atụ ikwesị ekwesị nke nchụpụ site na (a) usoro ụlọ akwụkwọ? (b) òtù ndị agha?
17 Ndịàmà Jehova bụ ndị na-amụ Bible. (Joshua 1:8; Abụ Ọma 1:2; Ọrụ 17:11) A pụrụ iji usoro ihe omume nke mmụta Bible Òtù Na-achị Isi na-enye tụnyere usoro ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ nke bọọdụ agụmakwụkwọ wepụtara. Ọ bụ ezie na bọọdụ ahụ n’onwe ya abụghị ebe e si nweta ihe ọmụma ahụ a na-akụzi, ọ na-esetịpụ usoro ihe ọmụmụ, kpebie ụzọ e si ezi ihe, ma wepụta ntụzi ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụwaa isi ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ahụ ụlọ akwụkwọ ahụ chọrọ, na-eme ka ihe na-esiri ụmụ akwụkwọ ibe ya ike, ma ọ bụ na-ewetara ụlọ akwụkwọ ahụ ihe ihere, a pụrụ ịchụpụ ya. Ndị isi ụlọ akwụkwọ nwere ikike ime ihe maka abamuru nke ụmụ akwụkwọ ahụ n’ozuzu ha.
18 E wezụga ịbụ ụmụ akwụkwọ, Ndịàmà Jehova bụ ndị soja nke Jisọs Kraịst, ndị a tụziiri ka ha “na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike.” (1 Timoti 6:12; 2 Timoti 2:3) Dị ka o kwesịrị ịdị, àgwà na-ekwesịghị onye soja bụ́ onye Kraịst, nke a nọgidere na-eme, pụrụ iweta ọjụjụ Chineke. Dị ka onye e nyeworo nnwere onwe ime nhọrọ, onye soja bụ́ onye Kraịst pụrụ ikpebi ihe dị ka ọ chọrọ, ma ọ ghaghị iji isi ya buru ihe mkpebi ya ga-akpata. Pọl na-atụgharị uche, sị: “Ọ dịghị onye agha ọ bụla na-atụhị onwe ya n’ihe nke ibi obi a mgbe ọ na-ebu agha; ka o wee mee ihe ga-atọ onye dere aha ya n’akwụkwọ dị ka onye agha. Ma ọ bụrụkwa na onye ọ bụla na-agba mgba, e kpughị ya okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị mgba otú ọ dị n’iwu.” (2 Timoti 2:4, 5) Ndị Kraịst tozuru okè, gụnyere ndị so n’Òtù Na-achị Isi, na-anọgide na-adịrị Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs Kraịst kpam kpam, na-edebe “iwu” ndị ahụ ka ha wee nwee ike irite ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; Mkpughe 2:10.
19. Ebe anyị nyochaworo eziokwu banyere nraranye ndị Kraịst, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?
19 Ọ̀ bụ na eziokwu ndị ahụ adịghị eme ka o doo anya na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-ejere Chineke ozi, ọ bụghị ndị ohu mmadụ? Dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ́ ndị na-anụ ụtọ nnwere onwe nke Kraịst ji n’ihi ya mee ka ha pụọ n’ohu, ha na-ekwe ka mmụọ Chineke na Okwu ya na-eduzi ndụ ha ka ha na-eje ozi n’ịdị n’otu ha na ụmụnna ha n’ọgbakọ Chineke. (Abụ Ọma 133:1) Ihe ndị na-agba akaebe nke a kwesịrị iwepụ obi abụọ ọ bụla banyere ebe ike ha sitere. N’isoro ọbụ abụ ahụ, ha pụrụ ịbụ, sị: “Jehova bụ ike m na ọta m; Ya ka obi m tụkwasịworo obi, e nyewokwara m aka: obi m wee na-awụli elu n’ọṅụ; m ga-esitekwa n’abụ m kelee Ya.”—Abụ Ọma 28:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1993.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú Watch Tower Society na ụlọ ọrụ iwu kwadoro ndị yiri ya si na-enyere Ndịàmà Jehova aka?
◻ Olee otú ndị Kraịst na-esi erite uru site n’ọrụ nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova na-eji enye akụkọ ọrụ nkwusa ha?
◻ N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ịchụpụ onye Kraịst raara onwe ya nye kwesịrị ekwesị?
[Foto dị na peeji nke 19]
Òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ chebere ịdị n’otu nke ozizi
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova na-anụ ụtọ nnwere onwe ahụ nke Kraịst ji maka ya meee ka ha nwere onwe ha