Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Ịtụle Onwe Anyị’ n’Oge Ememe Ncheta
    Ụlọ Nche—1990 | Febụwarị 15
    • 3 “Onyenwe anyị Jisọs n’abalị ahụ nke a raara ya nye n’aka mmadụ, ọ naara ógbè achịcha, keleekwa, wee nyawaa ha, sị, Nke a [pụtara, NW] ahụ m, nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m. Mgbe ha risịrị nri anyasị, ọ narakwa iko otú ahụ, sị, Iko a [pụtara, NW] ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m: na-emenụ nke a, mgbe ọ bụla unu ga-aṅụ ya, ka unu wee na-echeta m. N’ihi na mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa.”—1 Ndị Kọrint 11:23-26.a

  • ‘Ịtụle Onwe Anyị’ n’Oge Ememe Ncheta
    Ụlọ Nche—1990 | Febụwarị 15
    • 3 “Onyenwe anyị Jisọs n’abalị ahụ nke a raara ya nye n’aka mmadụ, ọ naara ógbè achịcha, keleekwa, wee nyawaa ha, sị, Nke a [pụtara, NW] ahụ m, nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m. Mgbe ha risịrị nri anyasị, ọ narakwa iko otú ahụ, sị, Iko a [pụtara, NW] ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m: na-emenụ nke a, mgbe ọ bụla unu ga-aṅụ ya, ka unu wee na-echeta m. N’ihi na mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa.”—1 Ndị Kọrint 11:23-26.a

  • ‘Ịtụle Onwe Anyị’ n’Oge Ememe Ncheta
    Ụlọ Nche—1990 | Febụwarị 15
    • ‘Nke a Pụtara Ahụ M’

      5, 6. (a) Gịnị ka Jisọs jiri ógbè achịcha ahụ mee? (b) Ụdị achịcha dị aṅaa ka o jiri mee ihe?

      5 Anyị agụwo ihe Pọl “natara n’aka Onyenwe anyị” n’ihe banyere Ememe Ncheta ahụ. E nwekwara ihe ndekọ nke mmadụ atọ ndị dere Oziọma ahụ, nke otu n’ime ha nọ mgbe Jisọs Kraịst guzobere ememe nke a. (1 Ndị Korint 11:23; Matiu 26:26-29; Mak 14:22-25; Luk 22:19, 20) Ihe ndekọ ndị a na-ekwu na Jisọs bu ụzọ were ógbè achịcha, kpee ekpere, wee nyawaa ma kesaa ya. Gịnị bụ ógbè achịcha ahụ? N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ọ̀ bụ gịnị ka a na-eji eme ihe taa? Gịnị ka ọ pụtara, ma ọ bụ nọchie anya ya?

      6 Ụfọdụ n’ime ihe ndị e nwere n’ebe ahụ bụ ihe ndị sitere n’oriri Ememe Ngabiga ndị Juu ahụ, nke otu n’ime ha bụ achịcha na-ekoghị eko, bụ nke Moses kpọrọ ‘achịcha ekoghị eko, bụ́ achịcha mweda n’ala.’ (Deuterọnọmi 16:3; Ọpụpụ 12:8) A na-eji ntụ ọka wheat na-eme achịcha nke a n’etinyeghị ya ihe iko achịcha, nnú, ma ọ bụ ihe ụtọ dị iche iche. Ebe ọ bụ ihe na-ekoghị eko (Hibru, mats-tsah’), ọ na-adị mbadamba, na-agbajikwa agbaji; ọ ga-adị mkpa ịnyawasị ya anyawasi ka o wee kwe oriri.—Mak 6:41; 8:6; Ọrụ 27:35.

      7. Gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eji emere achịcha n’oge Ememe Ncheta ahụ?

      7 Jisọs jiri achịcha na-ekoghị eko mee ihe ná Nri Anyasị Onyenwe Anyị, otú ahụ ka Ndịàmà na-emekwa taa. Matzoth nkịtị nke ndị Juu na-emezu nzube nke a ma ọ bụrụ na e tinyeghị ya ihe dị iche iche dị ka malt, yabasị, ma ọ bụ àkwá. (Matzoth nke ihe ndị ahụ dị n’ime ya agaghị ekwekọ nnọọ ekwekọ ná nkọwa ahụ bụ “achịcha mweda n’ala.”) Ma ọ bụkwanụ ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịgwa otu onye ka o meta achịcha na-ekoghị eko site ná ngwakọta nke ntụ ọka wheat na mmiri. Ọ bụrụ na e nweghị ntụ ọka wheat, a pụrụ imeta achịcha na-ekoghị eko site ná ntụ ọka barley, osikapa, ọka nkịtị, ma ọ bụ ụdị mkpụrụ ọkụkụ ndị ọzọ. A na-agbatị ngwakọta ntụ ọka ahụ ka ọ dị mbadamba, wee sie ya n’elu ebe isi ihe nke e tere mmanụ nke nta.

      8. N’ihi gịnị ka achịcha na-ekoghị eko ji bụrụ ihe nnọchianya kwesịri ekwesi, gịnịkwa ka ikere òkè na ya na-egosipụta? (Ndị Hibru 10:5-7; 1 Pita 4:1)

      8 Achịcha dị otú ahụ kwesịrị ekwesị n’ihi na o nweghị ihe iko achịcha (yeast) ọ bụla dị n’ime ya, bụ́ nke Bible ji mee ihe ịnọchite anya mmetọ ma ọ bụ mmehie. Pọl nyere ndụmọdụ nke a banyere nwoke nke na-akpa àgwà rụrụ arụ nọ n’ime ọgbakọ: ‘lhe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum. Sachapụnụ ihe iko achịcha ochie, ka unu wee ghara inwe ihe iko achịcha. A chụwo àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst. Ka anyị na-eme ememe ahụ, ọ bụghị n’ihe iko achịcha ochie nke obi ọjọọ na ajọ ọrụ, kama n’achịcha ekoghị eko nke bụ ịdị ọcha na eziokwu.’ (1 Ndị Kọrint 5:6-8; tụlee Matiu 13:33; 16:6, 12.) Achịcha na-ekoghị eko bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị maka anụ ahụ mmadụ nke Jisọs, n’ihi na ọ bụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) N’ebe ahụ a na-egosipụta Jisọs n’anụ ahụ mmadụ ya zuru okè mgbe ọ gwara ndị ozi ya, sị: “Naranụ ma rie [achịcha] nke a, ọ pụtara anụ ahụ m.” (Matiu 26:26, A New Translation of the Bible, nke James Moffatt) Ikere òkè n’achịcha ahụ pụtara na mmadụ kwenyere n’abamuru nke àjà Jisọs chụrụ n’ihi ya, na-anakwerekwa ya. Ma, o metụtara ihe karịrị nke ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya