Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla
    Ụlọ Nche—1999 | Febụwarị 15
    • 9. Ihe atụ ịdọ aka ná ntị ndị dị aṅaa ka Bible na-enye banyere ụmụ mmadụ ndị na-achọ ọdịmma nke onwe ha?

      9 Ịhụnanya “[adịghị] achọ ihe nke aka ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5) Onye na-ahụ n’anya adịghị eji aghụghọ achịkwa ndị ọzọ iji nweta ihe ọ na-achọ. Bible nwere ihe atụ ịdọ aka ná ntị n’okwu a. Iji maa atụ: Anyị na-agụ banyere Delaịla, Jezebel, na Atalaịa—ndị inyom ji aghụghọ chịkwaa ndị ọzọ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. (Ndị Ikpe 16:16; 1 Ndị Eze 21:25; 2 Ihe E Mere 22:10-12) Onye ọzọkwa bụ nwa Eze Devid bụ́ Absalọm. Ọ na-agakwuru ndị bịara Jerusalem maka ikpe ma jiri akọ gwa ha na ụlọikpe eze enweghị ezi mmasị ná nsogbu ha. Mgbe ahụ ọ na-ekwu hoo haa na ihe ụlọikpe ahụ chọrọ n’ezie bụ nwoke nwere obiọma dị ka ya! (2 Samuel 15:2-4) N’ezie, Absalọm enweghị mmasị n’ahụ ndị a na-emegbu emegbu, kama nanị n’onwe ya. N’ije ozi dị ka eze họpụtara onwe ya, ọ rafuru ọtụtụ ndị. Ma ka oge na-aga, e meriri Absalọm ajọ mmeri. Mgbe ọ nwụrụ, e leghịdị ya anya dị ka onye e kwesịrị ili n’ụzọ dị mma.—2 Samuel 18:6-17.

      10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ?

      10 Nke a bụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị Kraịst taa. Ma ànyị bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, anyị pụrụ inwe ike nrụgide ebumpụta ụwa. Ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe inweta ihe anyị na-achọ, dị ka a pụrụ ikwu ya, site n’ekweghị ka ndị ọzọ tinye ọnụ ná mkparịta ụka ma ọ bụ site n’ime ka ike gwụ ndị nwere echiche dị iche. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-ahụ n’anya n’ezie, anyị ga na-ele anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ. (Ndị Filipaị 2:2-4) Anyị agaghị na-erigbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-akwalite echiche ndị a na-enyo enyo n’ihi amamihe anyị ma ọ bụ ọnọdụ anyị ná nzukọ Chineke, dị ka a ga-asị na echiche anyị agwụla ndị bụ ọkpọka. Kama nke ahụ, anyị ga-echeta ilu Bible bụ́: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.

  • Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla
    Ụlọ Nche—1999 | Febụwarị 15
    • 11. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya nke dị ma obiọma ma nke na-eme ihe dị mma n’anya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị adịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume?

      11 Pọl dekwara na ịhụnanya nwere “obiọma” nakwa na ọ “dịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Ee, ịhụnanya agaghị ekwe ka anyị mee ihe n’ụzọ enweghị nsọpụrụ, nke jọgburu onwe ya, ma ọ bụ n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. Kama nke ahụ, anyị ga-echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Dị ka ihe atụ, onye na-ahụ n’anya ga-ezere ime ihe ndị ga-enye akọ na uche ndị ọzọ nsogbu. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 8:13.) Ịhụnanya “[adịghị] aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume, ma ọ na-eso eziokwu ṅụrịkọọ ọṅụ.” (1 Ndị Kọrint 13:6) Ọ bụrụ na anyị hụrụ iwu Jehova n’anya, anyị agaghị agbachi omume rụrụ arụ nkịtị ma ọ bụ na-enweta obi ụtọ n’ihe ndị Chineke kpọrọ asị. (Abụ Ọma 119:97) Ịhụnanya ga-enyere anyị aka ịchọta ọṅụ n’ihe ndị na-ewuli elu kama ịbụ n’ihe ndị na-akwada akwada.—Ndị Rom 15:2; 1 Ndị Kọrint 10:23, 24; 14:26.

      12, 13. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe mmadụ mejọrọ anyị? (b) Hota ihe atụ ndị dị na Bible iji gosi na ọbụna iwe ziri ezi pụrụ ime ka anyị mee omume n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya.

      12 Pọl na-ede na “oké iwe adịghị ewe” ịhụnanya (“ọ dịghị ewe iwe ngwa ngwa,” Phillips). (1 Ndị Kọrint 13:5) N’eziokwu, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị anyị bụ́ mmadụ na-ezughị okè inwe obi ilu ma ọ bụ iwetụ iwe mgbe mmadụ mejọrọ anyị. Otú ọ dị, ọ ga-adị njọ iburu iwe n’obi ruo ogologo oge ma ọ bụ ịnọgide ná mkpasu iwe. (Abụ Ọma 4:4; Ndị Efesọs 4:26) Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, ọbụna iwe ziri ezi pụrụ ime ka anyị mee ihe n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, anyị pụkwara ịza ajụjụ n’ihu Jehova maka nke a.—Jenesis 34:1-31; 49:5-7; Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 20:10-12; Abụ Ọma 106:32, 33.

      13 Ụfọdụ ekwewo ka ezughị okè ndị ọzọ metụta mkpebi ha ịga nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi. N’oge gara aga, ọtụtụ n’ime ndị a gbasiri mgba ike maka okwukwe ahụ, ikekwe na-atachi obi ná mmegide ezinụlọ, akaje sitere n’aka ndị ọrụ ibe ha, na ihe ndị yiri ha. Ha tachiri obi n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ n’ihi na ha lere ha anya dị ka ule nke iguzosi ike n’ezi ihe, ha zikwara ezi. Ma gịnị na-eme mgbe onye Kraịst ibe ha kwuru ma ọ bụ mee ihe n’egosighị ịhụnanya? Nke a ọ̀ bụghịkwa ule nke iguzosi ike n’ezi ihe? N’ezie ọ bụ, n’ihi na ọ bụrụ na anyị anọgide ná mkpasu iwe, anyị pụrụ ‘inye ekwensu ụzọ.’—Ndị Efesọs 4:27.

      14, 15. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịgụ ihe ọjọọ e mere gị’? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova n’ịgbaghara mmehie?

      14 N’inwe ezi ihe kpatara ya, Pọl na-agbakwụnye na ịhụnanya “[adịghị] agụ ihe ọjọọ e mere ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5) N’ebe a o ji okwu e ji eme ihe n’ime ndekọ ego mee ihe, ihe àmà na-egosi na ọ bụ iji nye echiche nke àgwà idetu mmejọ ahụ n’akwụkwọ ndekọ ihe ka e wee ghara ichezọ ya. Ọ̀ bụ ihe ịhụnanya dị na ya idetu n’uche anyị n’ụzọ na-adịgide adịgide okwu ọjọọ ma ọ bụ mkpasu iwe ahụ, dị ka a ga-asị na ọ ga-adị anyị mkpa izo aka na ya n’ọdịnihu? Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Jehova adịghị enyocha anyị n’ụzọ enweghị obi ebere dị otú ahụ! (Abụ Ọma 130:3) Ee, mgbe anyị gosiri nchegharị, ọ na-ehichapụ njehie anyị.—Ọrụ 3:19.

      15 Anyị pụrụ iṅomi Jehova n’akụkụ a. Anyị ekwesịghị iwe iwe ngwa ngwa gabiga ókè mgbe o yiri ka mmadụ ò mejọrọ anyị. Ọ bụrụ na anyị na-adị ngwa n’iwe iwe, anyị pụrụ ịdị na-akpasu onwe anyị iwe n’ụzọ kakwu mie emie karịa otú onye ahụ kpasuru anyị iwe pụrụ ime. (Eklisiastis 7:9, 22) Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa icheta na ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka a ghọgbuo ya, ma anyị ekwesịghịkwa ịdị na-enyo ebumnobi ụmụnna anyị enyo n’ụzọ na-adịghị mkpa. N’ebe ọ bụla o kwere mee, ka anyị were ya na ibe anyị ebughị ihe ọjọọ n’obi.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya