-
“Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”Ụlọ Nche—1990 | Nọvemba 15
-
-
“Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
“Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.”—1 NDỊ KỌRINT 13:13.
1. Gịnị ka otu onye ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ kwuworo banyere ịhụnanya?
OTU n’ime ndị ọkà mmụta n’ihe banyere ụmụ mmadụ a kasị mara amara n’ụwa kwuru n’otu mgbe gara aga, sị: “Anyị na-aghọta na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme nke ụdị anyị na nke kasị mkpa n’ihe ndị bụ isi dị echiche mmadụ mkpa bụ ịhụnanya. Ọ nọ n’etiti mkpa nile nke ụmụ mmadụ dị nnọọ ka anyanwụ anyị na-eguzo n’etiti usoro mbara igwe nke anyị, na-enwe ala mbara igwe dị iche iche ndị na-agba ya gburugburu. . . . Nwata nke a na-ahụghị n’anya dịwaga nnọọ iche n’ihe banyere usoro mmiri ọgwụ ndị dị ya n’ahụ, n’usoro ịrụ ọrụ nke anụ ahụ ya, nakwa n’usoro akparamagwa ya, n’ebe onye nke a hụworo n’anya dị. Ọbụna na onye nke mbụ ahụ na-eto uto n’ụzọ dị iche n’ebe onye nke abụọ dị. Ihe anyị maara ugbu a bu na a mụrụ mmadụ ịdị ndụ dị ka à ga-asị na ịdị ndụ na ịhụnanya bụ otu ihe. N’eziokwu, nke a abụghị ihe ọhụrụ. Nke a bụ nkwado nye Ozizi Elu Ugwu ahụ.”
2. (a) Olee ụzọ Pọl onyeozi si gosi ịdị mkpa nke ịhụnanya? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị ka a tụlee ha ugbu a?
2 Ee, dị ka nwoke nke a nke nwere amamihe ụwa kwetara, eziokwu nke a banyere ịdị mkpa nke ịhụnanya nye ọdịmma ụmụ mmadụ abụghị ihe ọhụrụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ nanị ugbu a ka ndị nwere amamihe ụwa na-aghọta nke ahụ, ma a hụrụ ya n’ime Okwu Chineke ihe karịrị narị afọ 19 gara aga. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji nwee ike ide, sị: “Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 13:13) Ị̀ maara ihe mere ịhụnanya ji dị elu karịa okwukwe na olileanya? N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya bụ nke kachasị elu n’àgwà nile nke Chineke nakwa ná mkpụrụ nke mmụọ ya?
-
-
“Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”Ụlọ Nche—1990 | Nọvemba 15
-
-
7. Gịnị bụ ọdịdị nke aga’pe, oleekwa ụzọ e siworo gosi ịhụnanya nke a?
7 Olee okwu Grik nke Pọl jiri mee ihe ná 1 Ndị Kọrint 13:13, ebe ọ kpọtụrụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya aha, wee sị na “nke kasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya”? N’ebe a, okwu e jiri mee ihe bụ aga’pe, bụ́ otu ụdị ahụ Jọn onyeozi jiri mee ihe mgbe ọ siri: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8, 16) Nke a bụ ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi ma ọ bụ na-achịkwa. Ọ pụrụ ịgụnye ma ọ bụ hapụ ịgụnye mmetụta ịhụnanya na inwe mmasị n’ebe mmadụ nọ, kama ọ bụ mkpali ma ọ bụ mmetụta nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị nke na-echegbu onwe ya banyere imere ndị ọzọ ihe ọma n’agụzighị iru eru nke onye na-anata ihe ọma ahụ ma ọ bụ abamuru ọ bụla ọ na-ewetara onye na-eme ya. Ụdị ịhụnanya nke a kpaliri Chineke inye ihe kasị dịrị oké ọnụ ahịa n’obi ya, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, “ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Dị nnọọ ka Pọl chetaara anyị: “Ọ dị ike na otu onye ga-anwụ n’ihi onye ezi omume: n’ihi na ma eleghị anya otu onye ga-enwe anya ike ọbụna ịnwụ n’ihi ezi mmadụ. Ma Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:7, 8) Ee, aga’pe na-emere ndị ọzọ ihe ọma n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ ma ọ bụ ihe ọ ga-efu onye na-egosi ịhụnanya ahụ.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Elu Karịa Okwukwe na Olileanya?
8. N’ihi gịnị ka aga’pe ji dị elu karịa okwukwe?
8 Ma n’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na ụdị ịhụnanya nke a (aga’pe) dị elu karịa okwukwe? O dere ná 1 Ndị Kọrint 13:2, sị: “A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere [na] m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla.” (Tụlee Matiu 17:20.) Ee, ọ bụrụ na anyị na-eme mgbalị anyị inweta ihe ọmụma na ito uto n’okwukwe ná nzube nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke a agaghị ewetara anyị abamuru ọ bụla site n’aka Chineke. N’otu aka ahụ, Jisọs gosiri na ụfọdụ ndị ‘ga-ebu amụma n’aha ya, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha ya, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ndị dị ike n’aha ya’ ma ha agaghị enweta nkwado ya.—Matiu 7:22, 23.
9. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji di elu karịa olileanya?
9 N’ihi gịnị ka ụdị ịhụnanya nke aga’pe ji dịkwa elu karịa olileanya? N’ihi na olileanya pụrụ ịbụ nke na-achọ nanị ọdịmma onwe onye, na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya karịsịa banyere abamuru ndị ga-abịara ya onwe ya, ebe ịhụnanya ‘na-adịghị achọ ihe nke aka ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Karịsịa, olileanya—dị ka nke ịdị ndụ gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ banye n’ime ụwa ọhụrụ—na-akwụsị mgbe e nwetara ihe a na-ele anya ya. (Matiu 24:21) Dị ka Pọl kwuru: “Ọ bụ n’olileanya ka a zọpụtara anyị: ma olileanya nke a na-ahụ anya abụghị olileanya: n’ihi na ihe mmadụ na-ahụ anya, gịnị mere o ji na-ele anya ya? Ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya ihe anyị na-ahụghị anya, anyị ji ntachi obi na-echesi ya ike.” (Ndị Rom 8:24, 25) Ịhụnanya n’onwe ya na-atachi obi n’ihe nile, ọ dịghị adakwa ada. (1 Ndị Kọrint 13:7, 8) Otú a, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị (aga’pe) dị elu karịa ma okwukwe ma olileanya.
-