-
Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Disemba
-
-
12. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:18, 22, olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si dị iche ná ndị nke bu ya ụzọ?
12 Pọl ma na “e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst.” Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs pụrụ iche. Ọ dị iche na nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ tupu Jizọs, n’ihi na ndị ahụ mechakwara nwụọ ọzọ. Pọl sịrị na Jizọs bụ “mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” Olee otú Jizọs si bụrụ mkpụrụ mbụ? Ọ bụ ya bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya abụrụ mmụọ, ọ bụkwa ya bụ onye mbụ si n’ụwa gaa eluigwe.—1 Kọr. 15:20; Ọrụ 26:23; gụọ 1 Pita 3:18, 22.
-
-
Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’AkaỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Disemba
-
-
16. Olee ihe Pọl bu n’obi mgbe ọ kpọrọ Jizọs “mkpụrụ mbụ”?
16 Pọl kwuru na a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ ya abụrụ “mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” Cheta na a kpọlitere ndị ọzọ n’ọnwụ, dị ka Lazarọs, ha ebiri n’ụwa. Ma, Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya abụrụ mmụọ ma dịrị ndụ ebighị ebi. E nwere ike iji ya tụnyere mkpụrụ mbụ ndị Izrel na-ewe n’ubi ha ha na-eji achụrụ Chineke àjà. Ihe ọzọ bụ na mgbe Pọl kpọrọ Jizọs “mkpụrụ mbụ,” ihe ọ na-ekwu bụ na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ka Jizọs. A ga-emecha kpọlite ndịozi Jizọs na ndị ọzọ “ha na Kraịst dị n’otu” ha ebiri n’eluigwe ka Jizọs.
-