-
‘Enwere M Olileanya n’Ebe Chineke Nọ’Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Disemba
-
-
15. Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “mkpụrụ mbụ”?
15 Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe. Mbilite n’ọnwụ ya kacha nke ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe mkpa. (Ọrụ 26:23) Ma, ọ bụghị naanị ya ka e kwere nkwa na a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe. Jizọs kwere ndịozi ya nkwa na ha ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Luk 22:28-30) Ma, ha ga-ebu ụzọ nwụọ tupu a kpọlite ha n’ọnwụ ịga eluigwe. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha abụrụ mmụọ ka Jizọs. Pọl kwuru, sị: “E siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” O kwukwara na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa, ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya.”—1 Kọr. 15:20, 23.
16. Olee ihe mere ka anyị ghọta mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe?
16 Ihe Pọl kwuru mere ka anyị ghọta mgbe a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe. Ọ ga-abụ ‘n’oge ọnụnọ Kraịst.’ Ọtụtụ afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova ejirila Baịbụl na-eme ka ndị mmadụ ghọta na “ọnụnọ” Kraịst malitere n’afọ 1914, nakwa na mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a dị ezigbo nso.
17, 18. Gịnị ga-eme ụfọdụ ndị e tere mmanụ n’oge ọnụnọ Kraịst?
17 Baịbụl mere ka mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-aga eluigwe dokwuo anya. Ọ sịrị: “Anyị achọghịkwa ka unu ghara ịma ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ . . . N’ihi na ọ bụrụ na okwukwe anyị bụ na Jizọs nwụrụ, sikwa n’ọnwụ bilie, otú ahụkwa, Chineke ga-akpọlite ndị dara n’ụra ọnwụ . . . ka ha soro Jizọs . . . Anyị ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ ruo n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị, agaghị ebu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị; n’ihi na Onyenwe anyị ga-esi n’eluigwe rịdata. Ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù, . . . Ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie. E mesịa, anyị onwe anyị bụ́ ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ, a ga-eburu anyị na ha gaa n’ígwé ojii izute Onyenwe anyị na mbara igwe; otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọ mgbe niile.”—1 Tesa. 4:13-17.
18 Mbilite n’ọnwụ nke mbụ ga-amalite obere oge “ọnụnọ” Kraịst malitere. Ndị e tere mmanụ dị ndụ n’oge oké mkpagbu ga-aga “izute Onyenwe anyị na mbara igwe.” (Mat. 24:31) Ndị ga-aga ‘izute ya’ ‘agaghị ada n’ụra ọnwụ.’ Nke a pụtara na ha agaghị anọ n’ụra ọnwụ ruo ogologo oge. Kama, ha nwụọ ‘a ga-agbanwe ha niile, n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ.’—1 Kọr. 15:51, 52.
-
-
‘Enwere M Olileanya n’Ebe Chineke Nọ’Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Disemba
-
-
20. Olee ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na a ga-ahazi mbilite n’ọnwụ ahazi?
20 Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị ahụ ga-aga eluigwe n’ọnwụ, “onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya.” (1 Kọr. 15:23) N’ihi ya, obi kwesịkwara isi anyị ike na a ga-ahazi mbilite n’ọnwụ nke ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ahazi. Nke ahụ nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: À ga-akpọlite ndị nwụrụ n’oge na-adịghị anya obere oge Kraịst ga-amalite Ọchịchị Puku Afọ ya, ndị nke ha ma ha anabata ha? À ga-ebu ụzọ kpọlite ndị ohu Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị ma nke a na-akọ n’ịhazi ihe, ka ha nye aka hazie ndị Chineke n’ụwa ọhụrụ? Gịnị ga-eme ndị na-efetụbeghị Jehova? Olee mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Oleekwa ebe ọ ga-abụ? E nwere ọtụtụ ajụjụ anyị nwere ike ịna-ajụ.Ma, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị ahụ ugbu a. Ọ ga-akacha mma ka anyị chere ma hụ ihe Jehova ga-eme. Obi siri anyị ike na ihe Jehova ga-eme, ga-atọ anyị obi ụtọ.
-