-
“Olee Otú A Ga-esi Kpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Disemba
-
-
3. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:30-32, gịnị ka olileanya Pọl nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ mere ka o mee?
3 Okwukwe Pọl nwere ná mbilite n’ọnwụ nyeere ya aka idi ọnwụnwa ndị bịaara ya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:30-32.) Ọ gwara ndị Kọrịnt, sị: “Kwa ụbọchị, ana m eche ọnwụ ihu.” O kwukwara, sị: “Mụ na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs.” O nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere ọgụ ya na anụ ọhịa nkịtị lụrụ n’ámá egwuregwu dị n’Efesọs. (2 Kọr. 1:8; 4:10; 11:23) O nwekwara ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị Juu na ndị ọzọ yiri “anụ ọhịa” kpagburu ya. (Ọrụ 19:26-34; 1 Kọr. 16:9) Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara Pọl. Ma, ọ ka nọkwa na-enwe olileanya na ihe ga-adịrị ya mma n’ọdịnihu.—2 Kọr. 4:16-18.
-
-
“Olee Otú A Ga-esi Kpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Disemba
-
-
5. Olee echiche na-ezighị ezi nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe olileanya ná mbilite n’ọnwụ?
5 Pọl dọrọ ụmụnna ya aka ná ntị gbasara echiche na-ezighị ezi ụfọdụ ndị nwere. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ‘ka anyị rie ma ṅụọ n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.’” E nwedịrị ndị nwere ụdị echiche a tupu oge Pọl. O nwere ike ịbụ na Pọl na-ekwu ihe dị n’Aịzaya 22:13, bụ́ ebe kwuru gbasara àgwà ụmụ Izrel na-akpa. Kama ime ka ha na Chineke dịrị ná mma, ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ. Echiche ha nwere bụ na ha kwesịrị ikpori ndụ ugbu a n’ihi na ọnwụ nwere ike ịbịa mgbe ọ bụla. Ọ bụkwa ụdị echiche a ka ọtụtụ ndị nwere taa. Ma, Baịbụl kwuru na echiche a kpataara ụmụ Izrel ọtụtụ nsogbu.—2 Ihe 36:15-20.
6. Ebe ọ bụ na anyị kweere ná mbilite n’ọnwụ, olee ụdị ndị anyị kwesịrị ịna-emeta enyi?
6 Ebe anyị ma na Jehova ga-akpolite ndị nwụrụ anwụ, o kwesịrị ime ka anyị mara ụdị ndị anyị na ha ga-abụ enyi. Ụmụnna nọ na Kọrịnt ekwedịghị iso ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ na-akpa. Ihe a na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị imeta ndị nwere echiche ka anyị rie taa nwụọ echi enyi. Iso ụdị ndị ahụ na-akpa nwere ike ime ka Onye Kraịst nwewe echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ kwụsị ịkpa ezi àgwà. O nwedịrị ike ime ka onye ahụ bido mewe mmehie. N’ihi ya, Pọl dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị: “Meenụ ka uche unu zuo okè n’ụzọ ezi omume, unu anọkwala na-eme mmehie.”—1 Kọr. 15:33, 34.
-