Nọgidenụ Na-arụpụta Nzọpụta nke Onwe Unu!
“Ndị m hụrụ n’anya, . . . werenụ egwu na ịma jijiji rụpụta karị nzọpụta nke onwe unu nke ukwuu.”—NDỊ FILIPAỊ 2:12.
1, 2. Echiche ndị dị aṅaa na-ewu ewu dugaworo ụfọdụ ndị iche na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-emeli banyere ihe ndụ ha mesịrị bụrụ?
“À MỤRỤ gị otú ahụ?” Na nso nso a, e dekwasịrị ajụjụ ahụ n’ihu otu magazin na-ewu ewu. N’okpuru isi akụkọ ahụ ka e nwere okwu ndị bụ́: “Àgwà, ọdịdị, ọbụna nhọrọ ná ndụ. Ihe ọmụmụ ndị ọhụrụ na-egosi na ọ daberekarịsịrị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa gị.” Nzọrọ ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ụfọdụ na-eche na ha pụrụ ime ihe dị nta n’ịchịkwa ndụ ha.
2 Ndị ọzọ na-atụ ụjọ na ọzụzụ na-erijughị afọ nke nne na nna ha ma ọ bụ nkụzi na-erijughị afọ nke onye nkụzi ha etinyewo ha ná ndụ enweghị obi ụtọ. Ha pụrụ iche na ha bụ ndị a kaworo aka imeghachi ndahie nke nne na nna ha, ime ihe kasị njọ batara ha n’uche, ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova—ná nkenke, ime nhọrọ ndị dị njọ. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Bible na-akụzi? E nwere n’ezie ndị okpukpe bụ́ ndị na-esi ọnwụ na Bible na-akụzi ihe yiri nke a, ozizi nke akara aka. Dị ka ozizi a si kwuo, Chineke ebuworị ụzọ kaa ihe omume ọ bụla ná ndụ gị aka ogologo oge gara aga.
3. Ozi dị aṅaa na-agba ume ka Bible nwere banyere ikike anyị ikpebi ihe ọdịnihu anyị ga-abụ?
3 Echiche ndị a dịgasị iche nwere otu ihe ha na-ekwu: I nwere nhọrọ dị nta, ihe dị nta ị ga-eme banyere otú ndụ gị ga-adị. Nke ahụ bụ ozi na-akụda mmụọ, ọ́ bụghị ya? nkụda mmụọ na-etinyekwa ihe ná nsogbu ahụ. Ilu 24:10 na-asị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Otú ọ dị, a na-agba anyị ume ịmụta, na dị ka Bible si kwuo, anyị pụrụ ‘ịrụpụta nzọpụta nke onwe anyị.’ (Ndị Filipaị 2:12) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka obi ike anyị siwanye ike n’ozizi ọma a nke Akwụkwọ Nsọ?
Ọrụ ‘Iwu Ụlọ’ Anyị Na-arụ n’Ime Onwe Anyị
4. Ọ bụ ezie na 1 Ndị Kọrint 3:10-15 na-ekwu banyere iji ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ụlọ, gịnị ka nke a na-adịghị enye echiche ya?
4 Tụlee ihe atụ Pọl onyeozi nke a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 3:10-15. N’ebe ahụ, ọ na-ekwu banyere ọrụ ndị Kraịst nke iwu ụlọ, a pụkwara iji ụkpụrụ dị n’ihe atụ ya mee ihe n’ebe ozi anyị na-eje n’ime onwe anyị na n’ime ndị ọzọ. Ọ̀ na-enye echiche na ma onye na-eso ụzọ ò mesịrị họrọ ijere Jehova ozi ma nọgide ná nhọrọ ahụ ma ọ bụ na o meghị otú ahụ dị kpam kpam n’isi ndị ahụ ziri ya ihe ma nye ya ọzụzụ? Ee e. Pọl nọ na-emesi ike mkpa ọ dị onye ozizi ahụ ịrụ ọrụ iwu ụlọ kasị mma dị ka o kwere mee. Ma dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu ụzọ, ọ dịghị ekwu na onye ahụ a na-amụrụ ihe ma ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ enweghị nhọrọ n’okwu ahụ. N’eziokwu, ihe atụ Pọl na-elekwasị anya n’ọrụ anyị na-arụ n’ime ndị ọzọ, ọ bụghị mwulite nke onwe anyị. Nke a doro anya n’ihi na Pọl na-ekwu banyere ọrụ iwu ụlọ na-erijughị afọ dị ka nke a na-ebibi, ebe a na-azọpụta onye ahụ na-ewu ụlọ n’onwe ya. Ka o sina dị, Bible na-eji otu atụmatụ okwu ahụ eme ihe mgbe ụfọdụ n’ebe ọrụ anyị na-arụ n’ime onwe anyị dị.
5. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-egosi na ndị Kraịst aghaghị ịrụ ọrụ ‘iwu ụlọ’ n’ime onwe ha?
5 Dị ka ihe atụ, tụlee Jud 20, 21: “Unu onwe unu, ndị m hụrụ n’anya, n’iwuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime Mmụọ Nsọ, debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke.” N’ebe a Jud ji otu okwu Grik ahụ e ji mee ihe maka ‘iwu ụlọ’ nke Pọl ji mee ihe ná 1 Ndị Kọrint isi nke 3, ma ihe ọ na-ekwu yiri ka ọ bụ na anyị na-ewuli onwe anyị elu n’elu ntọala nke okwukwe anyị. Luk, n’idekọ ihe atụ Jisọs banyere nwoke tọrọ ntọala ụlọ ya n’elu oké nkume, jiri otu okwu Grik ahụ e ji mee ihe maka “ntọala” mee ihe bụ́ nke Pọl ji mee ihe n’ihe atụ ya banyere iwu ụlọ nke ndị Kraịst. (Luk 6:48, 49) Ọzọkwa, Pọl ji ihe atụ nke ịbụ ndị e wukwasịrị n’elu “ntọala” mee ihe mgbe ọ na-agba ndị Kraịst ibe ya ume inwe ọganihu ime mmụọ. Ee, Okwu Chineke na-akụzi na anyị na-arụ ọrụ ‘iwu ụlọ’ n’ime onwe anyị.—Ndị Efesọs 3:15-19; Ndị Kọlọsi 1:23; 2:7.
6. (a) Nye ihe atụ otú onye ọ bụla na-eso ụzọ ndị Kraịst si bụrụ ihe si n’ọrụ iwu ụlọ a gbakọrọ aka rụọ pụta. (b) Ibu ọrụ dị aṅaa ka onye nke ọ bụla na-eso ụzọ nwere?
6 Iwulite onye Kraịst ọ̀ bụ ọrụ otu onye? Weredị ya na i kpebiri iwu ụlọ. I jekwuru onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ iji nweta ụkpụrụ. Ọ bụ ezie na ị chọrọ ịrụ ihe dị ukwuu n’ọrụ ahụ n’onwe gị, ị na-ego onye ọrụ iso gị rụọ ọrụ na inye gị ndụmọdụ banyere usoro ndị kasị mma. Ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala siri ike, nyere gị aka ịghọta ụkpụrụ ahụ, tụọrọ gị aro ngwá ọrụ ndị kasị mma ị ga-azụta, ọbụnakwa kụziere gị ihe dị ukwuu banyere iwu ụlọ, o yikarịrị ka ị ga-ekweta na ọ rụwo ọrụ dị mma. Ma gịnị ma ọ bụrụ na i leghara ndụmọdụ ya anya, zụta ngwá ọrụ ndị na-adịghị mma ma ọ bụ ndị bụ́ adịgboroja, ọbụnakwa mee ihe dị iche n’ihe onye ahụ na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ tụpụtara? N’ezie ị gaghị ata onye ọrụ ngo ahụ ma ọ bụ onye ahụ na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ ụta ma ọ bụrụ na ụlọ ahụ adakasịa! N’otu aka ahụ, onye ọ bụla na-eso ụzọ ndị Kraịst bụ ihe si n’ọrụ iwu ụlọ a gbakọrọ aka wuo, pụta. Jehova bụ onyeisi na-atụpụta ụkpụrụ ya. Ọ na-akwado onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye, dị ka otu n’ime “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” na-ezi ma na-ewulite onye a na-amụrụ ihe. (1 Ndị Kọrint 3:9) Ma onye ahụ a na-amụrụ ihe na-etinyekwa aka. N’ikpeazụ, ọ bụ ya ga-aza ajụjụ maka ụzọ ndụ ya. (Ndị Rom 14:12) Ọ bụrụ na ọ chọrọ inwe ezi àgwà ndị Kraịst, ọ ghaghị ịrụsi ọrụ ike iji nweta ha, iwulite ha n’ime onwe ya.—2 Pita 1:5-8.
7. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị Kraịst na-eche ihu, gịnị pụkwara ịkasi ha obi?
7 Nke a ọ̀ pụtaziri na ihe nketa mkpụrụ ndụ, gburugburu ebe obibi, na nkà nke ndị ozizi anyị bụ ihe na-abaghị n’ihe? Ọ dịghị ma ọlị. Okwu Chineke na-ekweta na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a dị mkpa ma na-akpa ike. Ọtụtụ ọchịchọ ndị na-adịghị mma, nke na-akpata mmehie dị n’ọbara, ha pụkwara isi ike ịlụso ọgụ. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12; 7:21-23) Ọzụzụ ndị nne na nna na gburugburu ebe obibi pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ebe ndị na-eto eto nọ—n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. (Ilu 22:6; Ndị Kọlọsi 3:21) Jisọs katọrọ ndị ndú okpukpe ndị Juu maka mmetụta dị njọ ozizi ha nwere n’ebe ndị ọzọ nọ. (Matiu 23:13, 15) Taa, ihe ndị dị otú ahụ nọ n’ọrụ n’ebe anyị nile nọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị Chineke na-eche ihe ịma aka ihu n’ihi oge ndị siri ike ha nwere mgbe ha bụ nwata. Ndị a chọrọ obiọma na mmetụta ọmịiko anyị. Ha pụkwara inweta nkasi obi site n’ozi Bible na a kaghị ha akara imeghachi ndahie ndị mụrụ ha mere ma ọ bụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Tụlee otú ndị eze ụfọdụ nke Juda oge ochie si eme ihe atụ nke a.
Ndị Eze Juda—Ha Mere Nhọrọ nke Ha
8. Ihe nlereanya ọjọọ dị aṅaa ka Jotam nwere ná nna ya, ma nhọrọ dị aṅaa ka o mere?
8 Ụzaịa ghọrọ eze Juda mgbe ọ ka bụ nwatakịrị dị afọ 16 ma chịa ruo afọ 52. N’ihe dị ukwuu n’oge ndị a, o ‘mere ihe ziri ezi n’anya Jehova, dị ka ihe nile si dị nke Amazaịa nna ya mere.’ (2 Ndị Eze 15:3) Jehova ji mmeri dị ịtụnanya n’agha gọzie ya. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ihe ịga nke ọma Ụzaịa buwere ya isi. Ọ malitere ịdị mpako ma nupu isi megide Jehova site n’isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe nchụàjà dị n’ụlọukwu, bụ́ ọrụ dịịrị nanị ndị nchụàjà. A baara Ụzaịa mba ma nanị ihe o mere bụ inwe oké ọnụma. Mgbe ahụ e wedara ya n’ala—tie ya ekpenta ma manye ya ibi ndụ ya fọdụrụnụ ná nnọpụ iche. (2 Ihe E Mere 26:16-23) Olee otú nwa ya bụ́ Jotam si meghachi omume nye ihe a nile? Nwa okorobịa ahụ pụrụ ịbụworị onye nna ya metụtara n’ụzọ dị mfe, ọ pụkwara iwewo iwe megide mgbazi Jehova. Ndị obodo ya n’ozuzu ha pụrụ imetụtawo ya n’ụzọ dị njọ ebe ọ bụ na ha nọ na-eme omume okpukpe ndị na-adịghị mma. (2 Ndị Eze 15:4) Ma Jotam mere nhọrọ nke ya. ‘O mere ihe ziri ezi n’anya Jehova.’—2 Ihe E Mere 27:2.
9. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime mmetụta ọma ndị Ehaz nwere, ma olee ihe ndụ ya mesịrị bụrụ?
9 Jotam chịrị ruo afọ 16, nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’oge ahụ nile. N’ihi ya, nwa ya bụ́ Ehaz nwere ihe nlereanya magburu onwe ya nke nna kwesịrị ntụkwasị obi. Ehaz nwekwara mmetụta ndị ọzọ dị mma. A gọziri ya ịdị ndụ mgbe ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Aịsaịa, Hosea, na Maịka nọ na-ebu amụma n’ala ahụ. Ma, o mere nhọrọ ọjọọ. “O meghị ihe ziri ezi n’anya Jehova, dị ka Devid nna ya.” O mere ihe oyiyi nke Beal ma fee ha ofufe, o surekwara ọbụna ụfọdụ n’ime ụmụ ya n’ọkụ ịchụ àjà nye chi ndị ọgọ mmụọ. N’agbanyeghị mmetụta ndị kasị mma, ọ dara ọdịda dị njọ dị ka eze na dị ka ohu Jehova.—2 Ihe E Mere 28:1-4.
10. Ụdị nna dị aṅaa ka Ehaz bụ, ma nhọrọ dị aṅaa ka nwa ya bụ́ Hezekaịa mere?
10 Ọ bụrụ na e lee ya anya site n’ofufe dị ọcha, o siri ike icheta nna ka Ehaz njọ. Otú ọ dị, nwa ya bụ́ Hezekaịa apụghị ịhọrọ onye ga-abụ nna ya! Ụmụ ndị ikom ahụ Ehaz gburu n’ịchụrụ Beal àjà yikarịrị ka ha bụ ụmụnne Hezekaịa. Nzulite a dị egwu ò mere ka Hezekaịa bụrụ onye a kara akara ibi ndụ nke ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova? N’ụzọ dị iche, Hezekaịa ghọrọ otu n’ime ole na ole ndị bụ́ n’ezie eze ukwu na Juda—nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, maara ihe, nke a hụkwara n’anya nke ukwuu. “Jehova nọnyekwaara ya.” (2 Ndị Eze 18:3-7) N’ezie, e nwere ihe mere a ga-eji kwere na ọ bụ Hezekaịa sitere n’ike mmụọ nsọ dee Abụ Ọma nke 119 mgbe ọ ka bụ nwa eze na-eto eto. Ọ bụrụ otú ahụ, o sighị ike ịhụ ihe mere ọ ga-ejiworị dee okwu ndị a: “Mkpụrụ obi m atụpụwo dị ka mmiri site n’iru újú.” (Abụ Ọma 119:28) N’agbanyeghị nsogbu ya ndị na-akpata iru újú, Hezekaịa kwere ka Okwu Jehova duzie ya ná ndụ. Abụ Ọma 119:105 na-asị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” Ee, Hezekaịa mere nhọrọ nke ya—ezi nhọrọ.
11. (a) N’agbanyeghị mmetụta ọma nke nna ya, olee ókè nnupụisi Manase nupụụrụ Jehova ruru? (b) Nhọrọ dị aṅaa ka Manase mere ka ọ na-eru ná ngwụsị nke ndụ ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?
11 Otú ọ dị, n’ụzọ megidere ibe ya, site n’otu n’ime ndị eze kasị mma nke Juda ka e si nweta otu n’ime ndị kasị nnọọ njọ. Nwa Hezekaịa bụ́ Manase kwalitere ikpere arụsị, mgbaasị, na oké ime ihe ike ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ụdị ya. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na “Jehova wee gwa Manase okwu, gwakwa ndị ya,” ikekwe site n’ọnụ ndị amụma. (2 Ihe E Mere 33:10) Dị ka ọdịnala ndị Juu si kwuo, Manase meghachiri omume site n’ime ka a kwọwaa Aịsaịa. (Tụlee Ndị Hibru 11:37.) Ma nke ahụ ọ bụ eziokwu ma ma ọ bụ ụgha, Manase aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke Chineke. N’ezie, o surere ụfọdụ n’ime ụmụ nke ya n’ọkụ ná ndụ dị ka àjà, dị nnọọ ka nna nna ya bụ́ Ehaz meworo. Ma, nwoke ọjọọ a, n’agbanyeghị ule ndị kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge agadi, chegharịrị ma gbanwee ụzọ ya. (2 Ihe E Mere 33:1-6, 11-20) Ihe atụ ya na-ezi anyị na ọ pụtachaghị na onye meworo nhọrọ ndị dị njọ nke ukwuu apụghị ịbụ onye a gbapụtara. Ọ pụrụ ịgbanwe.
12. Nhọrọ ndị dị aṅaa megidere ibe ha ka Emọn na nwa ya bụ́ Josaịa mere banyere ijere Jehova ozi?
12 Nwa Manase bụ́ Emọn pụrụ ịmụtaworị ihe dị ukwuu site ná nchegharị nke nna ya. Ma o mere nhọrọ ndị na-adịghị mma. N’ezie Emọn “mere ka ikpe maa ya hie nne” ruo mgbe e gburu ya n’ikpeazụ. Nwa ya bụ́ Josaịa bụ ọdịiche na-enye ume ọhụrụ. Ihe àmà na-egosi na Josaịa họọrọ ịmụta ihe site n’ihe mere nna nna ya. Ọ malitere ịchị mgbe ọ dị nanị afọ asatọ. Mgbe ọ dị nanị afọ 16, ọ malitere ịchọ Jehova ma mesịa bụrụ eze kwesịrị ntụkwasị obi, bụ ezi ihe nlereanya. (2 Ihe E Mere 33:20–34:5) O mere nhọrọ—nhọrọ ziri ezi.
13. (a) Gịnị ka anyị na-amụta site ná ndị eze Judia anyị tụleworo? (b) Olee ókè inye ọzụzụ nke nne na nna dịruru ná mkpa?
13 Ntụle a dị mkpirikpi nke ndị eze Judia asaa na-enye ihe mmụta dị ike. N’ọnọdụ ụfọdụ, eze ndị kasị njọ nwere ụmụ kasị mma, n’aka nke ọzọkwa, eze ndị kasị mma nwere ụmụ kasị njọ. (Tụlee Eklisiastis 2:18-21.) Nke a adịghị ebelata ịdị mkpa nke inye ọzụzụ nke nne na nna. N’ezie ndị nne na nna na-azụ ụmụ ha dị ka ụzọ Jehova si dị na-enye ụmụ ha ohere kasị mma kwere mee ịghọ ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ma, ụfọdụ ụmụaka, n’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma nke nne na nna na-ekwesị ntụkwasị obi, na-ahọrọ ịgbaso ụzọ ọjọọ. Ụmụaka ndị ọzọ, n’agbanyeghị mmetụta nne na nna kasị njọ, na-ahọrọ ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi. Site ná ngọzi ya, ha na-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ha. Ị̀ na-eche, mgbe ụfọdụ, nke ọ ga-abụ n’ọnọdụ gị? Tụlezie ụfọdụ mmesi obi ike Jehova nyere n’onwe ya na ị pụrụ ime nhọrọ ziri ezi!
Jehova Nwere Obi Ike n’Ebe Ị Nọ!
14. Olee otú anyị si mara na Jehova na-aghọta erughị eru anyị?
14 Jehova na-ahụ ihe nile. Ilu 15:3 na-asị: “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ ezi mmadụ nche.” Eze Devid kwuru banyere Jehova, sị: “Anya Gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka-ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ Gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ, nke a kpụrụ kwa ụbọchị, mgbe ọ dịghị otu ihe dị n’ime ha.” (Abụ Ọma 139:16) Ya mere Jehova maara ọchịchọ ndị na-adịghị mma ị na-alụso ọgụ—ma ì ketara ha eketa ma hà bịara n’ihi mmetụta ndị ọzọ ị na-apụghị ịchịkwa. Ọ na-aghọta kpọmkwem otú ihe ndị a siworo metụta gị. Ọ na-aghọta erughị eru gị ọbụna karịa ka gị onwe gị na-aghọta. Ọ dịkwa ebere. Ọ dịghị atụ anya ma ọlị ka anyị mee karịa ihe anyị pụrụ nnọọ ime.—Abụ Ọma 103:13, 14.
15. (a) Gịnị bụ otu isi iyi nke ngụgụ obi maka ndị ndị ọzọ ma ụma mejọọ? (b) Jehova na-eme ka onye ọ bụla n’ime anyị nwee ùgwù site n’inye anyị ibu ọrụ dị aṅaa?
15 N’aka nke ọzọ, Jehova adịghị ele anyị anya dị ka ndị na-enweghị ihe ha pụrụ ime banyere ọnọdụ ha. Ọ bụrụ na anyị enwewo ahụmahụ ndị dị njọ n’oge gara aga, a pụrụ ịgụgụ anyị obi site n’eziokwu bụ́ na Jehova na-akpọ omume ndị dị otú ahụ na-emerụ ahụ bụ́ ndị a ma ụma mee, asị. (Abụ Ọma 11:5; Ndị Rom 12:19) Ma ọ̀ ga-echebe anyị pụọ n’ihe ndị na-esi na ya apụta ma ọ bụrụ na anyị atụgharịa ma mara ụma mee nhọrọ ndị na-adịghị mma? Ọ dịghị ma ọlị. Okwu ya na-asị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) Jehova na-eji ibu ọrụ nke ime ezi ihe na ijere ya ozi eme ka ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi nwee ùgwù. Ọ bụ dị ka Mosis gwara mba Israel: “Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.” (Deuterọnọmi 30:19) Jehova nwere obi ike na anyị onwe anyị kwa pụrụ ime ezi nhọrọ. Olee otú anyị si mara nke ahụ?
16. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma ‘n’ịrụpụta nzọpụta nke onwe anyị’?
16 Rịba ama ihe Pọl onyeozi dere: “Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, . . . werenụ egwu na ịma jijiji rụpụta karị nzọpụta nke onwe unu nke ukwuu; n’ihi na ọ bụ Chineke Onye na-arụsi ọrụ ike n’ime unu ịchọ achọ unu na ịrụsi ọrụ ike unu, n’ihi na ọ dị Ya ezi mma.” (Ndị Filipaị 2:12, 13) Okwu Grik mbụ a sụgharịrị ịbụ “rụpụta” n’ebe a pụtara imecha ihe. Ya mere ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị a kara akara ịda ada ma ọ bụ ịda mbà. Jehova Chineke aghaghị inwe obi ike na anyị pụrụ ịrụcha ọrụ ahụ o nyeworo anyị ịrụ—ọrụ na-eduga ná nzọpụta anyị—ma ọ́ bụghị ya, ọ gaaraghị eme ka e site n’ike mmụọ nsọ dee okwu dị otú ahụ. Ma olee otú anyị ga-esi nwee ihe ịga nke ọma? Ọ dịghị n’ikike anyị. Ọ bụrụ na anyị siri ike n’ụzọ zuru ezu n’ime onwe anyị, “egwu na ịma jijiji” agaraghị adị mkpa. Kama, Jehova ‘na-arụsi ọrụ ike n’ime anyị,’ mmụọ nsọ ya na-arụ ọrụ n’uche na n’obi anyị, na-enyere anyị aka ‘ịchọ achọ na ịrụsi ọrụ ike.’ N’inwe enyemaka ịhụnanya ahụ, è nwere ihe mere na anyị ekwesịghị ime ezi nhọrọ ná ndụ ma na-adị ndụ kwekọrọ na ha? Ee e!—Luk 11:13.
17. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ime n’ime onwe anyị, oleekwa otú Jehova si enyere anyị aka ime otú ahụ?
17 Anyị ga-enwe ihe mgbochi ndị anyị ga-emeri—ma eleghị anya ogologo ndụ nke àgwà ọjọọ na mmetụta ndị na-emerụ ahụ ndị pụrụ ịgbagọ echiche anyị. Ka o sina dị, site n’enyemaka nke mmụọ Jehova, anyị pụrụ imeri ndị a! Dị ka Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint, Okwu Chineke nwere ike zuru ezu ịkwada ọbụna “ebe e wusiri ike.” (2 Ndị Kọrint 10:4) N’ezie, Jehova pụrụ inyere anyị aka ime mgbanwe dị ukwuu n’ime onwe anyị. Okwu ya na-agba anyị ume ‘ịtụpụ mmadụ ochie’ na ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:22-24) Mmụọ Jehova ọ̀ pụrụ inyere anyị aka n’ezie ime mgbanwe ndị dị otú ahụ? Eenụ! Mmụọ Chineke na-amịpụta mkpụrụ n’ime anyị—àgwà ndị mara mma, bụ́ ndị dị oké ọnụ ahịa nke anyị nile chọrọ ịzụlite. Nke mbụ n’ime ndị a bụ ịhụnanya.—Ndị Galetia 5:22, 23.
18. Nhọrọ dị aṅaa ka mmadụ ọ bụla nke na-eche echiche nwere ike ime, ginikwa ka nke a kwesiri inyere anyị aka ikpebisi ike ime?
18 N’ebe a ka eziokwu dị ukwuu nke na-atọhapụ n’agbụ dị. Jehova Chineke nwere ikike a na-akparaghị ókè maka ịhụnanya, e kekwara anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26; 1 Jọn 4:8) Ya mere anyị pụrụ ịhọrọ ịhụ Jehova n’anya. Ịhụnanya ahụkwa—ọ bụghị ndụ mbụ anyị, ọ bụghị ntụpọ ndị anyị nwetaworo, ọ bụghị ọchịchọ anyị ketara eketa nke ime ihe na-ezighị ezi—bụ isi ihe na-ekpebi ọdịnihu anyị. Ịhụ Jehova Chineke n’anya bụ ihe dị Adam na Iv mkpa iji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’Iden. Ịhụnanya dị otú ahụ bụ ihe dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa iji lanarị Amagedọn ma gafee ule ikpeazụ ahụ ná ngwụsị nke Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. (Mkpughe 7:14; 20:5, 7-10) Onye ọ bụla n’ime anyị, n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya, pụrụ ịzụlite ịhụnanya dị otú ahụ. (Matiu 22:37; 1 Ndị Kọrint 13:13) Ka anyị kpebisie ike ịhụ Jehova n’anya na iwukwasị ihe n’elu ịhụnanya ahụ ruo mgbe nile ebighị ebi.
Gịnị Ka I Chere?
◻ Echiche ndị dị aṅaa na-ewu ewu na-emegide ozizi dị mma nke Bible banyere ibu ọrụ dịịrị mmadụ?
◻ Olee ọrụ iwu ụlọ nke onye Kraịst ọ bụla na-aghaghị ịrụ n’ime onwe ya?
◻ Olee otú ihe atụ banyere ndị eze Juda si egosi na onye ọ bụla na-eme nhọrọ nke ya?
◻ Olee otú Jehova si emesi anyị obi ike na anyị pụrụ ime ezi nhọrọ ná ndụ, n’agbanyeghị mmetụta ndị na-adịghị mma gbara anyị gburugburu?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe nketa mkpụrụ ndụ ọ̀ na-ekpebi ọdịnihu gị?
[Foto dị na peeji nke 17]
N’agbanyeghị ihe nlereanya ọjọọ nke nna ya, Eze Josaịa họọrọ ijere Chineke ozi