-
Lee Anya Gabiga Ihe Ndị Ị Na-ahụ!Ụlọ Nche—1996 | Febụwarị 15
-
-
N’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ndị ahụ na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi guzosiri ike. N’inwe okwukwe siri ike na Chineke, ha pụrụ ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Ike agwụghị anyị n’obi; kama a sị na ọ bụ ezie na mmadụ elu ahụ anyị na-ere ure, ma a na-eme ka mmadụ ime anyị bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị.” Otú ọ dị, gịnị kpatara ndịghachi ọhụrụ a kwa ụbọchị? Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi na mkpagbu anyị nke dị mfe, nke dị na nwa oge a, na-arụpụtara anyị ebube nke ukwuu hie nne kachasị ihe nile, bụ́ ebube nke dị arọ dịkwa ebighị ebi; ebe anyị na-adịghị ele ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.”—2 Ndị Kọrint 4:16-18.
-
-
Lee Anya Gabiga Ihe Ndị Ị Na-ahụ!Ụlọ Nche—1996 | Febụwarị 15
-
-
Were Mkpagbu Ndị Dị Ugbu A Dị Ka Ihe Na-adịru Nwa Oge!
Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị, kwa ụbọchị anyị na-ahụ ihe ndị ọ ga-aka masị anyị ka anyị ghara ịhụ. Ọ bụrụ na anyị elee otu nle anya n’enyo, anyị ga-ahụrịrị ntụpọ nke anụ ahụ ndị anyị na-enweghị mmasị na ha, ihe ndị na-egosi ezughị okè nke anụ ahụ. Mgbe anyị nyobara anya n’enyo nke Okwu Chineke, anyị na-ahụ ntụpọ ime mmụọ dị iche iche ma n’ime onwe anyị ma n’ime ndị ọzọ. (Jemes 1:22-25) Mgbe anyị lebakwara anya n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị ma ọ bụ n’ihe nkiri telivishọn, a na-adọrọ uche anyị gaa n’akụkọ dị iche iche nke ikpe na-ezighị ezi, mmekpọ ọnụ, na ọdachi, ha na-ewutekwa anyị.
Setan ga-achọ ịkpatara anyị obi nkoropụ n’ihi ihe ndị anyị na-ahụ ma ọ bụ ghọọ ndị a dọpụrụ uche ha wee malite ịzọjọgharị ụkwụ n’okwukwe. Ànyị pụrụ isi aṅaa gbochie nke a ime? Anyị ga-agbasorịrị ihe nlereanya Jisọs Kraịst setịpụrụ, dị ka Pita onyeozi tụrụ aro ya mgbe ọ sịrị: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) N’akụkụ nile nke ndụ ndị Kraịst, Jisọs bụ ihe nlereanya zuru okè.
N’izo aka n’ebe Jisọs nọ dị ka ihe ilereanya anyị, Pita kwuru kpọmkwem na Jisọs hụrụ ahụhụ. N’ezie, Jisọs hụrụ ahụhụ dị ukwuu mgbe ọ nọ n’elu ala. Dị ka “onye ọkà” Jehova nke nọ ya mgbe e kere ihe a kpọrọ mmadụ, ọ maara kpọmkwem ihe Chineke zubere ka mmadụ bụrụ. (Ilu 8:30, 31) Ma ugbu a ọ hụrụ n’onwe ya ihe mmehie na ezughị okè meworo ka ha ghọọ. Kwa ụbọchị ọ hụrụ ma gbasoo ezughị okè na adịghị ike ndị mmadụ mgba. Ọ ghaghị ịbụworo ya ule siri ike.—Matiu 9:36; Mak 6:34.
E wezụga mkpagbu nke ndị ọzọ, Jisọs nwetakwara nke ya. (Ndị Hibru 5:7, 8) Ma site n’ọhụhụ ụzọ ime mmụọ zuru okè, o lere anya gabiga ha iji hụ nkwụghachi ụgwọ nke ịbụ onye e buliri gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’ihi ụzọ nguzosi ike n’ezi ihe ya. Mgbe ahụ dị ka Eze Mesaịa, ọ ga-enwe ihe ùgwù nke ịdọpụta ihe a kpọrọ mmadụ nọ ná nsogbu site n’ọnọdụ ya e wedara n’ala baghachi n’izu okè ahụ nke Jehova zubere na mbụ. Ilekwasị anya ya n’olileanya ọdịnihu ndị a anya na-adịghị ahụ nyeere ya aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Chineke n’agbanyeghị mkpagbu ndị ọ hụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Pọl mesịrị dee, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 12:2.
Jisọs adịghị mgbe o kwere ka ihe isi ike nile na ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ule kpatara ya obi nkoropụ, ghọọ onye a dọpụrụ uche ya, ma ọ bụ zọjọgharịa ụkwụ n’okwukwe ya. Dị ka ndị na-eso ụzọ ya, anyị ga-agbasorịrị ihe nlereanya ya magburu onwe ya n’ụzọ chiri anya.—Matiu 16:24.
-