Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
    • 3. (a) Olee otú Jizọs si lee ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere n’oge ya anya? (b) Olee ihe mere a ga-eji kwuo na ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ bụ ndị nnọchiteanya? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

      3 Kama itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya, Jizọs lekwasịrị anya n’ikwusa banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe nke ọ ga-abụ Eze ya n’ọdịnihu. (Daniel 7:13, 14; Luk 4:43; 17:20, 21) Ya mere, mgbe Jizọs nọ n’ihu onye Rom bụ́ Gọvanọ Pọntiọs Paịlet, ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ṅomiri ihe nlereanya ya site n’ịkwadosi Kraịst na Alaeze ya ike, sitekwa n’ikwusara ụwa Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Pọl onyeozi dere, si: “Ya mere, anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị. Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ, sị: ‘Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.’”a—2 Ndị Kọrịnt 5:20.

      4. Olee otú ezi Ndị Kraịst niile sirila gosi na ha na-akwadosi Alaeze Chineke ike? (Gụọ igbe dị na peeji nke 52.)

      4 Ebe ọ bụ na ndị nnọchiteanya na-anọchite anya ọchịchị mba ọzọ ma ọ bụ obodo ọzọ, ha anaghị etinye aka n’ihe a na-eme n’obodo ebe ha na-eje ozi; ha na-anọpụ iche. Otú ọ dị, ndị nnọchiteanya na-akwado ọchịchị obodo nke ha na-anọchite anya ya. Otú ahụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ na-eme, bụ́ ndị ‘ikike ha nwere dị ka ndị amaala dị n’eluigwe.’ (Ndị Filipaị 3:20) N’eziokwu, n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha ji na-ekwusa Alaeze Chineke, ha enyerela ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” nke Kraịst aka ‘ka ha na Chineke dị ná mma.’ (Jọn 10:16; Matiu 25:31-40) E nwere ike ikwu na atụrụ ọzọ ahụ bụ ndị ozi Kraịst n’ịkwado ụmụnna Jizọs e tere mmanụ. Dị ka otu ìgwè atụrụ dị n’otu nke na-ekwusa Alaeze Mesaya ahụ, ìgwè abụọ ahụ anaghị etinye aka ma otu ma otu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa.—Aịzaya 2:2-4.

  • Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
    • a Kemgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A., Kraịst bụ Eze na-achị ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ dị n’ụwa. (Ndị Kọlọsi 1:13) N’afọ 1914, e nyere Kraịst ikike ịchị “alaeze nke ụwa.” Ya mere, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụkwa ndị nnọchiteanya nke Alaeze Mesaya ahụ ugbu a.—Mkpughe 11:15.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya