Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ugbu A Bụ Ụbọchị Nzọpụta!
    Ụlọ Nche—1998 | Disemba 15
    • 12. Ozi dị mkpa dị aṅaa ka ndị nnọchianya na ndị ozi Jehova na-eje?

      12 Iji nweta nzọpụta, anyị aghaghị ime ihe kwekọrọ n’okwu Pọl: “Ma, dị ka ndị anyị na Ya [Jehova] na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu, (n’ihi na Ọ na-asị, N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka M nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta).” (2 Ndị Kọrint 6:1, 2) Ndị nnọchianya e tere mmanụ nke Jehova na ndị ozi ya, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, adịghị anara amara Nna ha nke eluigwe n’efu. (Jọn 10:16) Site n’àgwà ziri ezi na ozi ịnụ ọkụ n’obi ha ‘n’oge a a na-anara mmadụ nke ọma,’ ha na-achọ ihu ọma Chineke, na-emekwa ka ndị bi n’ụwa mara na ugbu a bụ “ụbọchị nzọpụta.”

      13. Gịnị bụ isi ihe dị n’Aịsaịa 49:8, oleekwa otú o si mezuo ná nke mbụ ya?

      13 Pọl na-ehota Aịsaịa 49:8, bụ́ nke na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Na mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ ka M zaworo gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyewooro gị aka: M ga-echebekwa gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe nketa nile tọgbọrọ n’efu.” Amụma a bu ụzọ mezuo mgbe a tọhapụrụ ndị Israel ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ha mesịakwa laghachi n’ala ha tọgbọrọ n’efu.—Aịsaịa 49:3, 9.

      14. Olee otú Aịsaịa 49:8 si mezuo n’ebe Jisọs nọ?

      14 Ná mmezu ọzọ nke amụma Aịsaịa, Jehova nyere “ohu” ya bụ́ Jisọs dị ka “ìhè nke mba nile, ịbụ nzọpụta [Chineke] ruo nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 49:6, 8; tụlee Aịsaịa 42:1-4, 6, 7; Matiu 12:18-21.) O doro anya na “mgbe ihe mmadụ na-atọ [Chineke] ụtọ,” ma ọ bụ “oge a na-anara mmadụ nke ọma,” na-ezo aka n’ebe Jisọs nọ mgbe ọ nọ n’ụwa. O kpere ekpere, Chineke ‘zakwara’ ya. Nke ahụ ghọrọ “ụbọchị nzọpụta” nye Jisọs n’ihi na ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè, sikwa otú a “ghọọrọ ndị nile na-aṅa Ya ntị Onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.”—Ndị Hibru 5:7, 9; Jọn 12:27, 28.

      15. Site ole mgbe ka ụmụ Israel ime mmụọ ghọrọ ndị na-aghaghị igosi na ha ruru eru maka amara Chineke, ọ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa?

      15 Pọl ji Aịsaịa 49:8 eme ihe n’ebe ndị Kraịst e tere mmanụ nọ, na-arịọ ha ka ha ghara “ịnara amara Chineke n’efu” site n’ịghara ịchọ ihu ọma ya ‘n’oge a na-anara mmadụ nke ọma’ na “ụbọchị nzọpụta” nke ọ na-enye. Pọl na-agbakwụnye, sị: “Lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” (2 Ndị Kọrint 6:2) Kemgbe Pentikọst 33 O.A., ụmụ Israel ime mmụọ agbalịwo igosi na ha ruru eru inweta amara Chineke ka “oge a na-anara mmadụ nke ọma” wee bụrụ “ụbọchị nzọpụta” nye ha.

  • Ugbu A Bụ Ụbọchị Nzọpụta!
    Ụlọ Nche—1998 | Disemba 15
    • Tụkwasị Obi ná Nzọpụta nke Jehova

      20. (a) Gịnị na-agụsi Pọl ike, n’ihi gịnịkwa ka oge na-ejighị fọdụ? (b) Gịnị na-aka ụbọchị nzọpụta nke anyị na-ebi n’ime ya ugbu a akara?

      20 Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi nke abụọ ya nye ndị Kọrint n’ihe dị ka afọ 55 O.A., nanị ihe dị ka afọ 15 fọdụụrụ usoro ihe ndị Juu. Onyeozi ahụ ji obi ya chọọ ka ndị Juu na ndị Jentaịl ghọọ ndị ha na Chineke dị n’otu site na Kraịst. Mgbe ahụ bụ ụbọchị nzọpụta, oge afọdụghịkwa. Anyị anọwo n’ebi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe, nke yiri nke oge ahụ kemgbe 1914. Ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ nke na-aga n’ihu ugbu a na-aka ugbu a akara dị ka ụbọchị nzọpụta.

      21. (a) Olee isiokwu dịịrị afọ a họpụtaworo maka 1999? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme n’ụbọchị nzọpụta a?

      21 Ọ dị ndị nke mba nile mkpa ịnụ banyere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta site n’aka Jisọs Kraịst. Oge afọdụghịzi. Pọl dere, sị: “Lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” Okwu ndị ahụ nke 2 Ndị Kọrint 6:2 ga-abụ isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka 1999. Lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị, n’ihi na anyị na-eche ihe dị njọ nke ukwuu karịa mbibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya, ihu! Mbibi nke usoro ihe a nile, nke na-emetụta onye ọ bụla nọ n’ụwa, dị nnọọ n’ihu. Ugbu a—ọ bụghị echi—bụ oge ime ihe. Ọ bụrụ na anyị kwetara na Jehova nwe nzọpụta, ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụrụkwa na anyị ji ndụ ebighị ebi kpọrọ ihe, anyị agaghị anara amara Chineke n’efu. Site n’ọchịchọ si n’obi ịsọpụrụ Jehova, anyị ga-egosi site n’okwu ọnụ na omume na ihe anyị na-ekwu si anyị n’obi n’ezie mgbe anyị na-eti mkpu, sị: “Lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya