-
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ndị Lụrụ Di na Nwunye na Ndị Na-alụghị?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
5. Saa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ
Ịhọrọ onye ị ga-alụ bụ otu n’ime ihe kacha mkpa i nwere ike ikpebi ná ndụ. Gụọnụ Matiu 19:4-6, 9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe mere na ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwunye ekwesịghị ịdị Onye Kraịst ọkụ ọkụ?
Baịbụl ga-enyere gị aka ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ na-akpakwa ezigbo àgwà. Ihe kacha mkpa ị ga-agba mbọ mee bụ ịchọpụta ma onye ị chọrọ ịlụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya.b Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 7:39 na 2 Ndị Kọrịnt 6:14. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ihe mere anyị ji kwesị ịlụ naanị Onye Kraịst ibe anyị?
Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma anyị lụọ onye na-ahụghị ya n’anya?
Ọ bụrụ na e jiri yok kekọta anụ abụọ na-abụghị otu ụdị anụ, ha abụọ ga-ata ahụhụ. Ọ dị ka mgbe Onye Kraịst gara lụrụ onye na-abụghị Onye Kraịst, ya na ọtụtụ nsogbu ga na-alụ
-