-
Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze ChinekeAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
10 Ihe nke mbụ mere anyị ji eji obi anyị dum enye onyinye bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime “ihe dị mma n’anya ya.” (1 Jọn 3:22) Obi na-atọ Jehova ụtọ ma onye na-efe ya jiri obi ya dum nye ya onyinye. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst banyere otú ha ga-esi na-enye onyinye. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:7.) Ezigbo Onye Kraịst anaghị enye onyinye n’ihi na a manyere ya amanye ma ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ na ndị ọzọ na-eme otú ahụ. Kama, ihe mere o ji enye onyinye bụ n’ihi na ‘o kpebiela n’obi ya’ na ya ga-enye onyinye.c Ihe nke ahụ pụtara bụ na ọ na-enye onyinye mgbe o chebachaara mkpa e nwere echiche, chebakwara otú o nwere ike isi nye aka. Jehova hụrụ onye na-eme otú a n’anya, n’ihi na “Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ: “Chineke hụrụ ndị inye ihe na-atọ ụtọ n’anya.”
-
-
Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze ChinekeAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
c Otu onye na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na okwu Grik bụ́ ‘ikpebi’ pụtara “ibu ụzọ kpebie ihe a ga-eme.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na a na-enwe obi ụtọ n’inye ihe, onye chọrọ inye ihe kwesịkwara ibu ụzọ kpebie ihe ọ ga-enye.”—1 Kọr. 16:2.
-