Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
    • 6. (a) Gịnị mere Pọl ji kwuo na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ibe anyị so n’ozi anyị na-ejere Chineke? (b) Olee otú anyị si agbatara ụmụnna anyị n’ụwa niile ọsọ enyemaka taa? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Mgbe Ọdachi Mere!”)

      6 Pọl nyeere Ndị Kọrịnt aka ka ha ghọta na ịgbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka so n’ozi ha na-ejere Jehova. O kwuru na ihe mere Ndị Kraịst ji agbatara ibe ha ọsọ enyemaka bụ n’ihi na ha “na-erube isi n’ozi ọma banyere Kraịst.” (2 Kọr. 9:13) N’ihi ya, ihe mere Ndị Kraịst ji na-enyere ibe ha aka bụ na ha chọrọ ime ihe Kraịst na-akụziri ha. Pọl kwukwara na ihe ọma Ndị Kraịst na-emere ibe ha bụ n’ihi “oké obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (2 Kọr. 9:14; 1 Pet. 4:10) Ọ bụ ya mere e ji kwuo ihe e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1975 banyere ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. E kwuru, sị: “Obi kwesịrị isi anyị ike na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-eme Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, obi ụtọ.” N’eziokwu, ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke.—Rom 12:1, 7; 2 Kọr. 8:7; Hib. 13:16.

  • Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
    • 7, 8. Gịnị bụ ihe mbụ mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

      7 Olee ihe anyị bu n’obi na-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Pọl zara ajụjụ a n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrịnt. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15.) Ná 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl kwuru ihe atọ mere anyị ji arụ “ọrụ a nke ijere ọha mmadụ ozi,” ma ọ bụ, ihe mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Ka anyị leba ha anya otu otu.

      8 Nke mbụ bụ na ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka na-eme ka e too Jehova. Ị̀ chọpụtara na ná 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl gwara ụmụnna ya gbasara Jehova Chineke ọtụtụ ugboro. Ọ gwara ha gbasara ‘ịna-enye Chineke ekele,’ gwakwa ha gbasara “ọtụtụ okwu ekele a na-enye Chineke.” (Amaokwu nke 11, na nke 12) O kwuru gbasara otú ọsọ enyemaka Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha si eme ka a “na-enye Chineke otuto,” nakwa ka a na-eto Chineke maka ‘oké obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.’ (Amaokwu nke 13, na nke 14) Ihe ikpeazụ Pọl kwuru gbasara ọsọ enyemaka a Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha bụ: “Ekele dịrị Chineke.”—Amaokwu nke 15; 1 Pita 4:11.

      9. Olee otú ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị si eme ka ụfọdụ ndị gbanwee otú ha si ele anyị anya? Kọọ otu ihe gosiri na nke ahụ bụ eziokwu.

      9 Ndị Chineke taa weere na ọsọ enyemaka ha na-agbatara ibe ha na-emekwa ka e nye Jehova otuto, nakwa ka a na-achọ ozizi ya mma. (1 Kọr. 10:31; Taị. 2:10) O doro anya na ọsọ enyemaka Ndịàmà Jehova na-agbatara ụmụnna ha na-emekarị ka ụfọdụ ndị kwụsị ịkpọ anyị na Jehova aha ọjọọ. Dị ka ihe atụ: E nwere otu nwaanyị bi n’otu obodo ajọ ifufe kpara mkpamkpa. Tupu ajọ ifufe a efee, o nwere akwụkwọ nwaanyị a kwo Ndịàmà Jehova mapawa n’ọnụ ụzọ ya. Ihe e dere na ya bụ: “Achọghị M Ka Ndịàmà Jehova Bịa n’Ụlọ M.” Mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, nwaanyị a nọ n’ụlọ ya otu ụbọchị hụ ebe ndị ọrụ enyemaka na-arụzi otu ụlọ ajọ ifufe ahụ mebiri. Ọ nọ na-ele otú ha si na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Mgbe ọ chọpụtara na ndị ọrụ a na-eme ka ụmụnne, ọ gara ebe ahụ ka ọ mara ndị ha bụ. Mgbe o rutere ebe ahụ, a gwa ya na ha bụ Ndịàmà Jehova, ya eju ya anya. Ihe dapụrụ ya n’ọnụ bụ: “Echeburu m na unu bụ ndị ọjọọ.” Gịnị ka nwaanyị a meziri? Ọ gara wepụ ihe ahụ o kwo Ndịàmà Jehova mapawa n’ọnụ ụzọ ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya