-
Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere JehovaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
6. (a) Gịnị mere Pọl ji kwuo na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ibe anyị so n’ozi anyị na-ejere Chineke? (b) Olee otú anyị si agbatara ụmụnna anyị n’ụwa niile ọsọ enyemaka taa? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Mgbe Ọdachi Mere!”)
6 Pọl nyeere Ndị Kọrịnt aka ka ha ghọta na ịgbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka so n’ozi ha na-ejere Jehova. O kwuru na ihe mere Ndị Kraịst ji agbatara ibe ha ọsọ enyemaka bụ n’ihi na ha “na-erube isi n’ozi ọma banyere Kraịst.” (2 Kọr. 9:13) N’ihi ya, ihe mere Ndị Kraịst ji na-enyere ibe ha aka bụ na ha chọrọ ime ihe Kraịst na-akụziri ha. Pọl kwukwara na ihe ọma Ndị Kraịst na-emere ibe ha bụ n’ihi “oké obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (2 Kọr. 9:14; 1 Pet. 4:10) Ọ bụ ya mere e ji kwuo ihe e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1975 banyere ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. E kwuru, sị: “Obi kwesịrị isi anyị ike na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-eme Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, obi ụtọ.” N’eziokwu, ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke.—Rom 12:1, 7; 2 Kọr. 8:7; Hib. 13:16.
-
-
Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So n’Ozi Anyị Na-ejere JehovaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
7, 8. Gịnị bụ ihe mbụ mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?
7 Olee ihe anyị bu n’obi na-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Pọl zara ajụjụ a n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrịnt. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15.) Ná 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl kwuru ihe atọ mere anyị ji arụ “ọrụ a nke ijere ọha mmadụ ozi,” ma ọ bụ, ihe mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Ka anyị leba ha anya otu otu.
8 Nke mbụ bụ na ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka na-eme ka e too Jehova. Ị̀ chọpụtara na ná 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl gwara ụmụnna ya gbasara Jehova Chineke ọtụtụ ugboro. Ọ gwara ha gbasara ‘ịna-enye Chineke ekele,’ gwakwa ha gbasara “ọtụtụ okwu ekele a na-enye Chineke.” (Amaokwu nke 11, na nke 12) O kwuru gbasara otú ọsọ enyemaka Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha si eme ka a “na-enye Chineke otuto,” nakwa ka a na-eto Chineke maka ‘oké obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.’ (Amaokwu nke 13, na nke 14) Ihe ikpeazụ Pọl kwuru gbasara ọsọ enyemaka a Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha bụ: “Ekele dịrị Chineke.”—Amaokwu nke 15; 1 Pita 4:11.
-