Taịtọs—“Onye Mụ na Ya Na-arụkọrọ Unu Ọrụ”
NSOGBU bilitere mgbe ụfọdụ n’ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ. A ghaghị idozi ha, nke a chọkwara obi ike na nrubeisi. Otu nwoke nke chere ihe karịrị otu ihe ịma aka dị otú ahụ ihu n’ụzọ gara nke ọma bụ Taịtọs. Dị ka onye so Pọl onyeozi kere òkè n’ọrụ ahụ, o tinyere mgbalị siri ike iji nyere ndị ọzọ aka ime ihe n’ụzọ nke Jehova. Ya mere, Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Kọrint na Taịtọs bụ ‘onye ya na ya na-arụkọrọ ha ọrụ.’—2 Ndị Kọrint 8:23.
Ònye bụ Taịtọs? Òkè dị aṅaa ka o keere n’idozi nsogbu? Oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụle àgwà ya?
Okwu Banyere Obibi Úgwù
Taịtọs bụ onye Gris a na-ebighị úgwù. (Ndị Galetia 2:3)a Ebe ọ bụ na Pọl na-akpọ ya “ezi nwa nke m dị ka okwukwe anyị kwekọrọ si dị,” Taịtọs pụrụ ịbụworị otu n’ime ụmụ ime mmụọ nke onyeozi ahụ. (Taịtọs 1:4; tụlee 1 Timoti 1:2.) Taịtọs so Pọl, Banabas, na ndị ọzọ si Antiọk, Siria, mgbe ha jere Jerusalem n’ihe dị ka 49 O.A. ịtụle okwu banyere obibi úgwù.—Ọrụ 15:1, 2; Ndị Galetia 2:1.
A tụwo aro na ebe ọ bụ na a na-atụle ihe banyere ntọghata nke ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù na Jerusalem, a kpọọrọ Taịtọs jee iji gosi na ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu pụrụ inweta ihu ọma Chineke ma hà biri úgwù ma ọ bụ na ha ebighị. Ụfọdụ ndị òtù ọgbakọ ahụ dị na Jerusalem bụ́ ndị bụworo ndị Farisii tupu ha anakwere Iso Ụzọ Kraịst rụrụ ụka na iwu ji ndị Jentaịl a tọghatara atọghata ibi úgwù na idebe Iwu ahụ, ma e guzogidere arụmụka a. Ịrụgide Taịtọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ ibi úgwù gaara abụ ịgọnahụ na nzọpụta na-adabere n’ebere na-erughịrị mmadụ nke Jehova na n’inwe okwukwe na Jisọs Kraịst kama ịdabere n’ọrụ Iwu. Ọ gaara abụkwa ịjụ ihe àmà na-egosi na ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, anatawo mmụọ nsọ Chineke.—Ọrụ 15:5-12.
E Zigara Ya Kọrint
Mgbe e doziri okwu obibi úgwù ahụ, e nyere Pọl na Banabas ikike zuru ezu ikwusara ndị mba ọzọ ọzi ọma. N’otu mgbe ahụ, ha gbalịkwara iburu ndị ogbenye n’uche. (Ndị Galetia 2:9, 10) N’ezie, mgbe Taịtọs pụtaghachiri n’ihe ndekọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ ihe dị ka afọ isii mgbe e mesịrị, ọ nọ na Kọrint dị ka onye nnọchiteanya Pọl n’ịhazi nnakọta ụtụ maka ndị nsọ. Otú ọ dị, ka Taịtọs na-arụ ọrụ a, ọ hụrụ onwe ya n’ọnọdụ ọzọ jupụtara n’esemokwu.
Nderịta akwụkwọ Pọl na ndị Kọrint na-ekpughe na o buru ụzọ deere ha akwụkwọ ka ha na “ndị na-akwa iko ghara imekọ ihe.” Ọ ghaghị ịgwa ha ka ha wepụ onye na-akwa iko na-enweghị nchegharị n’etiti ha. Ee, Pọl degaara ha akwụkwọ ozi siri ike, “were ọtụtụ anya mmiri” na-eme otú ahụ. (1 Ndị Kọrint 5:9-13; 2 Ndị Kọrint 2:4) Ka ọ dị mgbe ahụ, e zigara Taịtọs Kọrint iji nye aka n’ụtụ a na-atụkọta ebe ahụ maka ndị Kraịst bụ́ ndị Judia nọ ná mkpa. Ikekwe, e zigakwara ya ịhụ mmeghachi omume ndị Kọrint nye akwụkwọ ozi Pọl.—2 Ndị Kọrint 8:1-6.
Olee otú ndị Kọrint ga-esi meghachi omume na ndụmọdụ Pọl? N’ịchọsi ike ịmata, ọ pụrụ ịbụ na Pọl zigara Taịtọs site n’Efesọs gabiga Oké Osimiri Aegean gaa Kọrint, na-enye ya ntụziaka iwetaghachi ozi ngwa ngwa o kwere omume. Ọ bụrụ na a rụzuru ọrụ dị otú ahụ tupu a kwụsị ime njem ụgbọ mmiri n’ihi oge oyi (n’ihe dị ka etiti ọnwa November), Taịtọs pụrụ iji ụgbọ mmiri jee Troas ma ọ bụ si ụzọ ala ahụ dị anya karị nke gafere Hellespont. Ikekwe Pọl bịaruru n’ebe ahụ e kwekọrịtara izute na Troas n’oge, ebe ọ bụ na ọgba aghara ahụ ndị ọkpụ ụ́zụ́ ọlaọcha kpalitere mere ka ọ hapụ Efesọs ngwa ngwa karịa ka a tụrụ anya ya. Mgbe o cheresịrị n’obi erughị ala na Troas, Pọl ghọtara na Taịtọs agajeghị iji ụgbọ mmiri abịa. N’ihi ya, Pọl malitere njem n’ike n’ike n’ụzọ ala ahụ n’olileanya na ọ ga-ezute ya n’ụzọ. O rutehaala Europe, Pọl ga-esi ụzọ Via Egnatia, o mesịkwara zute Taịtọs na Masedonia. N’ụzọ nyere Pọl oké ahụ efe na ọṅụ, ozi si Kọrint dị mma. Ọgbakọ ahụ emeghachiwo omume n’ụzọ dị mma nye ndụmọdụ onyeozi ahụ.—2 Ndị Kọrint 2:12, 13; 7:5-7.
Ọ bụ ezie na Pọl enwewo nchegbu banyere ụdị nnabata onye nnọchiteanya ya gaje inweta, Chineke nyeere Taịtọs aka ịrụzu ọrụ ya. E jiriwo “egwu na ịma jijiji” nabata Taịtọs. (2 Ndị Kọrint 7:8-15) N’iji okwu nke onye ọkọwa okwu bụ́ W. D. Thomas mee ihe: “Anyị pụrụ iwere ya na n’emeghị ka nkatọ Pọl katọrọ ha ghara ịkpụ ọkụ n’ọnụ, [Taịtọs] jiri nkà na akọ rịọ ndị Kọrint arịrịọ; na-emesi ha obi ike na Pọl, n’ikwu okwu dị ka o si kwuo, bu nanị ọdịmma ime mmụọ ha n’uche.” Ka ọ na-eme nke ahụ, Taịtọs ahụwo ndị Kraịst bụ́ ndị Kọrint n’anya n’ihi mmụọ nrubeisi na mgbanwe ndị bara uru ha mere. Àgwà ha nke kwesịrị ịja mma abụrụwo isi iyi nke agbamume nye ya.
Gịnị banyere akụkụ nke ọzọ nke ozi Taịtọs gara na Kọrint—ịhazi ụtụ a nakọtara maka ndị nsọ nọ na Judia? Taịtọs anọwokwa na-arụ ọrụ na nke ahụ, dị ka a pụrụ ikwubi site n’ihe ọmụma dị ná 2 Ndị Kọrint. Ikekwe e dere akwụkwọ ozi ahụ na Masedonia n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 55 O.A., ngwa ngwa Taịtọs na Pọl zutesịrị. Pọl dere na a na-ezigaghachi Taịtọs ugbu a, bụ́ onye malitere ịnakọta ụtụ ahụ, tinyere ndị inyeaka abụọ a na-akpọghị aha iji rụzuo ya. N’ịbụ onye nwere ezi mmasị n’ebe ndị Kọrint nọ, Taịtọs dị nnọọ njikere ịgaghachi. Ka Taịtọs na-agaghachi Kọrint, o yiri ka o ji akwụkwọ ozi nke abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl degaara ndị Kọrint.—2 Ndị Kọrint 8:6, 17, 18, 22.
Ọ bụghị nanị na Taịtọs bụ onye na-ahazi ihe nke ọma kama ọ bụkwa ụdị nwoke nke a pụrụ inye ọrụ ndị chọrọ ezi uche n’ọnọdụ ndị siri ike. O nwere obi ike, tozuo okè, ma na-eguzosi ike. Ihe àmà na-egosi na Pọl gụrụ Taịtọs n’onye nwere ike iche ihe ịma aka ndị ahụ dịnụ ihu bụ́ nke “ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi” nke Kọrint welitere. (2 Ndị Kọrint 11:5) A kwadoro echiche a banyere Taịtọs n’ebe ọzọ ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ, n’ọrụ ọzọ siri ike e kenyere ya.
N’àgwàetiti Krit
O yiri ka n’ihe dị ka n’agbata 61 na 64 O.A., Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ ozi, bụ́ onye na-eje ozi mgbe ahụ n’àgwàetiti Mediterranean nke Krit. Pọl ahapụwo ya ebe ahụ iji “dozie ihe fọdụrụ” na iji “dookwa mmadụ ndị okenye n’obodo nile ọ bụla.” N’ozuzu, a ma ndị Krit ama dị ka “ndị ụgha . . . , anụ ọhịa jọrọ njọ, ndị afọ nri na-adịghị arụ ọrụ.” Ya mere, na Krit, a ga-achọkwa ka Taịtọs jiri obi ike na nguzosi ike mee ihe. (Taịtọs 1:5, 10-12) Nke ahụ bụ nnọọ ọrụ chọrọ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, n’ihi o yiri ka ọ ga-akpụzi ọdịnihu nke Iso Ụzọ Kraịst n’àgwàetiti ahụ. N’ike mmụọ nsọ, Pọl nyeere Taịtọs aka site n’ikwu kpọmkwem ihe ndị ọ ga-elepụ anya maka ya ná ndị ga-abụ ndị nlekọta. A ka na-atụle iru eru ndị ahụ ma a bịa n’ihe banyere nhọpụta nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.
Akwụkwọ Nsọ egosighị mgbe Taịtọs hapụrụ Krit. Ọ nọrọ ebe ahụ ruo ogologo oge zuru ezu nke Pọl ịgwa ya ka o nye Zinas na Apọlọs ihe ndị na-akpa ha, bụ́ ndị na-akwụsịtụ n’ebe ahụ mgbe ha na-eme njem n’oge a na-akaghị aka. Ma Taịtọs agaghị anọ n’àgwàetiti ahụ ruo nnọọ ogologo oge. Pọl na-eme atụmatụ iziga Atemas ma ọ bụ Tikikọs n’ebe ahụ, mgbe ahụ Taịtọs gajekwa izute onyeozi ahụ na Naịkọpọlis, nke yiri ka ọ bụ obodo ukwu a ma ama nke nwe aha ahụ dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Gris.—Taịtọs 3:12, 13.
Site n’izo aka ikpeazụ dị mkpirikpi Bible zoro n’ebe Taịtọs nọ, anyị na-amụta na ikekwe n’ihe dị ka 65 O.A., Pọl zigara ya ọrụ n’ebe ọzọkwa. Ọrụ ahụ mere ka o jee Dalmesia, bụ́ ókèala dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Adriatic dị na Croatia nke oge a. (2 Timoti 4:10) A gwaghị anyị ihe Taịtọs gaje ime ebe ahụ, ma a tụwo aro na a na-eziga ya ịchịkwa ihe omume ọgbakọ na ịrụ ọrụ ozi ala ọzọ. Ọ bụrụ otú ahụ, Taịtọs ga na-eje ozi n’ọnọdụ yiri nke o ji jee ozi na Krit.
Lee ka anyị si nwee ekele maka ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta tozuru okè dị ka Taịtọs! Nghọta doro anya ha nwere banyere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ na ntinye ha ji obi ike na-etinye ha n’ọrụ na-enye aka ime ka e chebe ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ. Ka anyị ṅomie okwukwe ha ma gosi na anyị dị ka Taịtọs site n’ịkwalite ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị.—Ndị Hibru 13:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị Galetia 2:3 na-akọwa Taịtọs dị ka onye Gris (Helʹlen). Nke a pụrụ ịpụta na o sitere n’usoro ọmụmụ ndị Gris. Otú ọ dị, a na-azọrọ na ndị edemede ụfọdụ bụ́ ndị Gris ji ụdị ụbara nke okwu Grik ahụ bụ́ (Helʹle.nes) mee ihe n’izo aka n’ebe ndị na-abụghị ndị Gris nọ bụ́ ndị na-asụ Grik, marakwa ọdịbendị ha. O kwere omume na Taịtọs bụ onye Gris n’echiche ahụ.
[Foto dị na peeji nke 31]
Taịtọs bụ onye ọrụ nwere obi ike nke so rụọ ọrụ maka ọdịmma ndị Kraịst nọ na Kọrint na n’ebe ndị ọzọ