Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 6/15 p. 32
  • “Ogbugbu Mma nke Enyi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ogbugbu Mma nke Enyi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 6/15 p. 32

“Ogbugbu Mma nke Enyi”

PỌL onyeozi hụrụ mkpa ọ dị ịgwa ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ na Galetia okwu mgbazi ụfọdụ. Ikekwe iji zere ịkpasu onye ọ bụla iwe, ọ jụrụ, sị: “Ya mere, àghọwo m onye iro unu, n’ihi na ana m agwa unu eziokwu?”—Ndị Galetia 4:16.

Pọl aghọbeghị onye iro ha n’ihi ‘ikwu eziokwu.’ N’ezie, ọ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible bụ́: “Ihe kwesịrị ntụkwasị obi ka ogbugbu mma nke enyi bụ.” (Ilu 27:6, King James Version) Ọ maara na ọ ga-emetụta ùgwù onwe onye nke onye ahụ hiere ụzọ. Ma, ọ maara na ịghara inye onye mmehie mgbazi dị ya mkpa pụrụ ime ka Jehova Chineke ghara igosipụta ịhụnanya ya n’ebe onye ahụ nọ. (Ndị Hibru 12:5-7) N’ihi ya, dị ka enyi kwesịrị ntụkwasị obi nke bu ọdịmma na-adịte aka nke ọgbakọ ahụ n’obi, Pọl alaghị azụ n’inye ndụmọdụ na-agbazi agbazi.

Taa, Ndịàmà Jehova na-arụzu ọrụ e nyere ha ‘ịga mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile Jisọs Kraịst nyere n’iwu.’ N’ime otú ahụ, ndị Kraịst a nwere obi eziokwu adịghị ezochi eziokwu Bible bụ́ ndị na-ekpughe ma na-akatọ nkwenkwe na-ezighị ezi na àgwà na-ekwesịrịghị ndị Kraịst. (Matiu 15:9; 23:9; 28:19, 20; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Kama ịghọ ndị iro a ga-ajụ ajụ, ha na-egosipụta ụdị mmasị e ji amata ndị bụ́ ezi ndị enyi.

Ọbụ abụ ahụ ji nghọta Chineke ji ike mmụọ nsọ nye ya dee, sị: “Ka onye ezi omume tigbuo m, ọ ga-abụ ebere; ya baakwara m mba, ọ ga-abụ mmanụ isi; ekwela ka isi m sị, Ee e.”—Abụ Ọma 141:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya