Ị̀ Bụ Arụsị Nke Onwe Gị?
N’amaghi ama, ụfọdụ ndị na-eme onwe ha arụsi. Bible kowara ná Ndị Efesọs 5:5, si: “N’ihi na nke a ka unu matara nke ọma, na ọ dịghị onye ọ bula nke bụ onye na-akwa iko, ma o bụ onye na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anyaukwu, nke isi ya bụ onye na-ekpere arụsị, nwere ihe nketa n’alaeze nke Kraịst na Chineke.” (Ndị Kọlọsi 3:5; tụlee Ndị Galetia 5:19-21.) Ọchịchọ anụ ahụ pụrụ iweta nkewa n’etiti mmadụ na Chineke. Pọl kwuru banyere ndị di otú ahụ na “chi ha bụ afọ ha.” (Ndị Filipaị 3:18, 19) N’ikwu ya n’ụzọ ozọ, ha nwere “chi” ọzọ na-abụghị Jehova, na-edebe ọchịchọ anụ ahụ nke onwe ha n’ọnọdụ mbụ. Àgwà dị otú ahụ pụrụ ime ka mmadụ ghara inwe òkè n’Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ya mere, e nwere ezi ihe kpatara anyị ga-eji gee ntị n’okwu Pọl onyeozi, nke bụ: “N’ihi nke a, ndị m huru n’anya, gbanarịnu ikpere arụsi.”—1 Ndị Kọrint 10:14.