Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
    Ụlọ Nche—1991 | Disemba 15
    • N’ihi na mgbe Onye Kere ihe a kpọrọ mmadụ nyere nwanyị mbụ ahụ n’ọlụlụ di nye nwoke mbụ ahụ, Ọ họpụtara nwoke ahụ ịbụ isi nke nwunye ya na ụmụ ndị ha gaje ịmụta n’ọdịnihu. Nke a bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya. N’ìgwè ụmụ mmadụ ọ bụla a haziri ahazi, ọ dị mkpa ka e nwee onye ga na-edu ndú, na-emekwa mkpebi ikpeazụ nile. N’ihe banyere alụmdi na nwunye, Onye Okike ahụ nyere iwu na “di bụ isi nke nwunye.”—Ndị Efesọs 5:23.

  • Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
    Ụlọ Nche—1991 | Disemba 15
    • Ọ Bụghị Onye Ọchịchị Aka Ike

      Olee ụzọ onye bụ di kwesịrị isi jiri ikike ya mee ihe? Site n’ịgbaso ezi ihe nlereanya nke Ọkpara Chineke. Bịble na-asị: “Di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzụkọ ya, ebe ya onwe ya bụ onye nzọpụta nke ahụ. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzụkọ ya n’anya, rarakwa onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:23, 25) Ụzọ Jisọs Kraịst si eji ọbụbụisi ya eme ihe bụụrụ ọgbakọ ahụ ihe ngọzi. Ọ bụghị onye ọchịchị aka ike. O meghị ka ndị na-eso ụzọ ya nwee mmetụta nke ịbụ ndị a kpachigidere akpachigide na ndị a na-emegbu emegbu. Kama nke ahụ, o nwetara nkwanye ùgwù nke mmadụ nile site n’ụzọ ịhụnanya na ọmịiko o si mesoo ha ihe. Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ ndị bụ di ịgbaso ná mmeso ha na-emeso ndị nwunye ha!

      Ma, e nwere ndị bụ di ndị na-adịghị agbaso ezi ihe nlereanya nke a. Ha na-eji ọbụbụisi ahụ Chineke nyere ha eme ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma nke nanị onwe ha, kama ịbụ maka ọdịmma nke ndị nwunye ha. Ha na-achị ndị nwunye ha n’ụzọ ọchịchị aka ike, na-achọ ka ndị nwunye ha doo onwe ha n’okpuru ha n’akpaghị ókè ọ bụla, na-ajụkwa ọtụtụ mgbe ikwe ka ha meere onwe ha mkpebi ọ bụla. N’ụzọ kwere nghọta, ndị nwunye nke ndị di dị otú ahụ na-ebikarị ndụ na-enweghị obi ụtọ. Onye bụ di dị otú ahụ na-atakwa ahụhụ n’ihi na ọ dịghị enweta nkwanye ùgwù ịhụnanya nke nwunye ya.

      N’eziokwu, Chineke chọrọ ka onye bụ nwunye sọpụrụ ọnọdụ nke di ya dị ka isi ezinụlọ ahụ. Ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ di achọọ inweta nkwanye ùgwù ya nke sitere n’ala ala obi n’ebe ọ nọ dị ka mmadụ, ọ ghaghị ime ihe iji nweta ya, ụzọ kachasị mma isikwa mee nke ahụ bụ site n’iji ezi uche mee ihe na ịzụlite ezi àgwà dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke dị ka onye isi ezinụlọ ahụ.

      Ido Onwe Onye n’Okpuru Bụ nke A Kpaara Ókè

      Ikike onye bụ di nwere n’ahụ nwunye ya abụghị nke a na-akparaghị ókè. N’ụzọ ụfọdụ, a pụrụ iji ido onwe onye n’okpuru nke onye bụ nwunye tụnyere ido onwe onye n’okpuru nke onye Kraịst n’ebe onye ọchịchị ụwa nọ. Chineke nyere iwu na onye Kraịst aghaghị ‘ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi.’ (Ndị Rom 13:1) Ma ido onwe onye n’okpuru nke a aghaghị ịbụ nke a haziri mgbe nile site n’ihe e ji ụgwọ ya n’ebe Chineke nọ. Jisọs kwuru, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) Ọ bụrụ na Siza (ndị ọchịchị ụwa) achọọ ka e nye ya ihe bụ nke Chineke, anyị na-echeta ihe Pita onyeozi kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [“dị ka onye ọchịchị,” NW] karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

  • Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
    Ụlọ Nche—1991 | Disemba 15
    • Onye bụ di ga-enweta ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke nwunye ya mgbe ọ na-egosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke nke onye bụ isi ya, Jisọs Kraịst, onye nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha hụrịta ibe ha n’anya. (Jọn 13:34) Ọ bụ ezie na onye bụ di bụ onye pụrụ imehie ihe na onye na-ezughị okè, ọ bụrụ na o jiri ikike ya mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ọbụbụisi ka elu nke Kraịst, ọ na-eme ka ọ dịrị nwunye ya mfe karị inwe obi ụtọ inwe ya dị ka onye bụ isi. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụrụ na onye bụ nwunye azụlite àgwà ndị Kraịst nke imeru ihe n’ókè na ịhụnanya obi ebere, ọ gaghị abụrụ ya ihe siri ike ido onwe ya n’okpuru di ya.

  • Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
    Ụlọ Nche—1991 | Disemba 15
    • E kwesịrị ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ n’ime ọgbakọ. E kwesịkwara ịzụlite ha karịsịa n’etiti di na nwunye n’ime ezinụlọ ndị Kraịst. Onye bụ di pụrụ igosi mmetụta ịhụnanya na ịdị nwayọọ ya site n’ige ntị n’aro ndị nwunye ya tụrụ. O kwesịrị ịtụle ụzọ nwunye ya si ele ihe anya tupu o mee mkpebi ndị metụtara ezinụlọ ahụ. Ndị Kraịst bụ nwunye abụghị ndị bụ okpokoro isi efu. Ọtụtụ mgbe, ha pụrụ ịtụrụ ndị di ha aro ndị bara uru, dị ka Sera meere di ya, bụ́ Abraham. (Jenesis 21:12) N’aka nke ọzọ, onye Kraịst bụ nwunye agaghị na-achọ ihe n’aka di ya n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya. Ọ ga-egosipụta obi ọma na obi dị umeala ya site n’ịgbaso idu ndú ya, na-akwadokwa mkpebi ya nile, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịdị iche n’ihe ndị na-amasị ya mgbe ụfọdụ.

      Onye bụ di nke nwere ezi uche, dị ka okenye ọgbakọ nke nwere ezi uche, bụ onye a pụrụ ịbịakwute abịakwute na onye nwere obi ọma. Onye bụ nwunye nke na-ahụ n’anya na-emeghachi omume site n’inwe ọmịiko na ogologo ntachi obi, na-amata mgbalị nile nwoke ahụ na-eme iji buzuo ibu ọrụ ya nile n’agbanyeghị ezughị okè na ihe nrụgide nile nke ndụ. Mgbe di na nwunye zụlitere àgwà ndị dị otú ahụ, ido onwe onye n’okpuru n’alụmdi na nwunye agajeghị ịbụ ihe isi ike. Kama nke ahụ, ọ na-abụ ihe na-enye ọṅụ, ịnọ ná ntụkwasị obi, na afọ ojuju na-adịgide adịgide.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya