Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?
    Ụlọ Nche—2001 | Eprel 1
    • “Ka Ihe Wee Na-agara Gị nke Ọma”

      Pọl rụtụrụ aka n’uru ọzọ dị n’irube isi mgbe o dere, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:2, 3; Ọpụpụ 20:12) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmadụ irubere ndị mụrụ ya isi ga-esi baara ya uru?

      Iji malite, ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ndị mụrụ ụmụ ka tozuo okè ma nwee ahụmahụ karị? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ha amaghị ihe dị ukwuu banyere kọmputa ma ọ bụ ụfọdụ isiokwu ndị ọzọ a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ, ha maara ihe dị ukwuu banyere ibi ndụ na ịnagide nsogbu dị iche iche nke ndụ. N’aka nke ọzọ, ndị na-eto eto enweghị echiche guzoziri eguzozi ndị na-esite ná ntozu okè. N’ihi ya, ha na-emekarị mkpebi ọkụ ọkụ, na-adabakarị ná nrụgide na-ezighị ezi nke ndị ọgbọ, bụ́ nke na-aghọkarị ha ahịa. N’ụzọ ezi uche dị na ya, Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata.” Gịnị bụ ihe ngwọta ya? “Mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.”—Ilu 22:15.

      Abamuru nke nrubeisi gụnyere ihe karịrị nnọọ mmekọrịta nwa na onye mụrụ ya. Ka ọha mmadụ wee na-aga nke ọma ma na-arụpụta ihe, a ghaghị inwe nkwekọ, bụ́ nke n’aka nke ya, chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nrubeisi. Dị ka ihe atụ, n’alụmdi na nwunye, ọ bụ ịdị njikere ikwenye, ọ bụghị ịdị na-achọkarị ihe n’aka onye nke ọzọ ma ghara ichebara ihe ndị ruuru ndị ọzọ na mmetụta ha echiche, na-eweta udo, nkwekọ, na obi ụtọ. N’ebe ọrụ, irubere ndị were mmadụ n’ọrụ isi dị oké mkpa ka achụmnta ego ma ọ bụ mgbalị ọ bụla wee bụrụ nke ga-aga nke ọma. N’ihe metụtara iwu na iwu nchịkwa gọọmenti, ọ bụghị nanị na nrubeisi na-eme ka mmadụ ghara inweta ntaramahụhụ kamakwa ọ na-eweta ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe.—Ndị Rom 13:1-7; Ndị Efesọs 5:21-25; 6:5-8.

      Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enupụ isi megide ịbụisi na-aghọkarị ndị na-ekwesịghị ekwesị n’obodo. N’ụzọ dị iche, nrubeisi mmadụ mụtara n’oge ọ bụ nwata pụrụ ịdịru n’oge ndụ ya dum n’ụzọ na-akwụghachi ụgwọ. Lee uru ọ bara ịmụta nke a n’oge mmadụ bụ nwata!

  • Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?
    Ụlọ Nche—2001 | Eprel 1
    • Cheta na, dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, iwu ahụ e nyere ka a na-erubere ndị mụrụ ụmụ isi nwere nkwa abụọ, ya bụ, “ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” A na-achọta ebe e mesiri nkwa a ike n’Ilu 3:1, 2: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.” Ụgwọ ọrụ bụ́ isi dịịrị ndị na-erube isi bụ mmekọrịta onwe onye ha na Jehova nwere ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke udo.—Mkpughe 21:3, 4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya