Ọṅụ Na-echere Ndị Na-achọta Eziokwu Ahụ
N’OKPUKPU uko ụlọ ya, otu nwoke onye Finland chọtara akwụkwọ bụ́ The Divine Plan of the Ages. Ọ malitere ịgụ ya ozugbo, ná mkpirikpi oge kwa ọ gwara onwe ya sị, ‘Nke a bụ eziokwu ahụ; nke a bụ eziokwu ahụ.’ Mgbe o si n’okpukpu uko ụlọ ahụ rịdata, ọ gwara nwunye ya, “Achọtawo m ezi okpukpe ahụ.”
Ahụmahụ a pụrụ iche n’ụzọ nwoke a si chọta eziokwu ahụ, ma ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova pụrụ ịkọ mmeghachi omume yiri nke ahụ. Ha nile pụrụ ịgwa gị banyere ọṅụ ịchọta eziokwu ahụ na-eweta. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-eme ka nke a pụta ìhè.
Ezi Nkụzi Bible Na-eweta Ọṅụ
Margarita Königer tolitere na Munich, Germany, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ụlọ ndị a tụrụ bọmbụ na ndị na-agba ọkụ bụ ihe ndị a na-ahụkarị. Nwanne ya nwoke nwụrụ n’agha ahụ. Ka ọ na-aga ofufe nru chọọchị Katọlik, ọ nụrụ ka a na-ekpe ekpere maka ndị soja Germany na führer, bụ́ Hitler. Mgbe agha ahụ gasịrị, ọ natara ikike ịgụ akwụkwọ n’efu na mahadum na United States dị ka akụkụ nke usoro ihe omume mgbanwerịta ụmụ akwụkwọ. Ọ chọpụtara na ndị mmadụ na-emeso ya omume enyi, ya mere o juru ya anya ihe yiri ka ọ̀ bụ ya na-akwa ndị mmadụ aka, bụ́ ndị ọchịchọ ha site n’okike bụ ibi ndụ n’udo, gaa n’atụkwasịghị ibe ha obi na ịkpọ ha asị n’oge agha. Mgbe ọ laghachiri na Munich, o zutere Ndịàmà Jehova, sitekwa n’ọmụmụ Bible ya na ha, ọ chọtara azịza nye ajụjụ ya dị iche iche. Ọ na-ekwu, sị: “E gosiri m site na Bible na aka ndị ajọ mmụọ dị ya . . . Bible na-akpọ ha ‘ndị onwe ụwa,’ n’eziekwa, na-ekwu na Setan ‘na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.’ . . . N’iburu n’uche àgwà asọpụrụghị Chineke, nke jọgburu onwe ya nke mba na ndị dị iche iche, lee ka azịza nke a si bụrụ nke ezi uche dị na ya na nke na-eju afọ!”—Ndị Efesọs 6:12; Mkpughe 12:9.
Margarita na-aga n’ihu, sị: “O wetaara m ọṅụ dị ukwuu ịmụta banyere ndokwa Chineke maka ịgwọta nsogbu nile nke ụwa. Ee e, ọ gaghị abụ site ná nchepụta ma ọ bụ ịchịisi ọ bụla nke mmadụ, dị ka ndị nkụzi ụwa na-akwado. Kama nke ahụ, Bible na-egosi na gọọmenti ọhụrụ nke eluigwe ga-elekọta ihe ndị na-eme n’elu ụwa. . . . Jisọs Kraịst kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere sị: ‘Ka alaeze gị bịa.’ . . . Amalitere m ịhụ na alaeze a bụ gọọmenti n’ezie nakwa na nanị site na ya ka a ga-esi nweta ezigbo udo zuru ụwa ọnụ.” N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ, Margarita ejewo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ n’ihe dị ka mba ise nke Africa—na-etinye afọ 19 ndị ikpeazụ n’ịkpọsa eziokwu nye ndị dị obi umeala na Ouagadougou, Burkina Faso.
Ahụmahụ Margarita apụghị iche. Ọtụtụ ndị emeghachiwo omume n’ụzọ dị nnọọ mma otú ahụ mgbe ha chọpụtara na ndị ụkọchukwu Krisendọm n’akụkụ abụọ nke ndị na-eburịta agha na-ekpegara Chineke ekpere maka mmeri. Ndị nwere obi eziokwu na-ahụ ezi uche dị ná nkọwa Bible nke na aka Chineke adịghị n’agha ụmụ mmadụ kama na ndị a na-ebilite n’ihi na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Ndị a na-achọ eziokwu na-amụta na ezi ndị Kraịst agaghị ‘esite n’ụwa’ kama ha ga-anọpụ iche n’ihe omume ya nile. Ịmata na Ndịàmà Jehova ewerewo nguzo dị otú ahụ, obi na-esi ndị ọhụrụ a nwere mmasị ike na ha achọtawo eziokwu ahụ. Ndị dị otú ahụ na-eto eto n’olileanya na ọṅụ ka ha na-enweta ihe ọmụma ka elu banyere ihe mere Chineke jiworo kwere ka ajọ omume dịrị na ụzọ ọ ga-esi weta udo na ọnọdụ ezi omume n’elu ụwa n’isi nso site n’Alaeze ya.—1 Jọn 5:19; Jọn 17:16; Matiu 6:9, 10.
Ezi Ụkpụrụ Dị Iche Iche nke Bible Na-eweta Ọṅụ
Daniel Rosero onye Ecuador chere na ndụ enweghị isi, ya mere ọ malitere aṅụrụma. Chọọchị ọ na-aga kụziiri ya na nanị ihe ọ ga-atụ anya ya bụ ọnwụ na hell na-ere ọkụ. Ọ zaghachiri sị, “M gaje ịgba ọkụ, ya mere ka m ṅụba mmanya!” O nwere ezinụlọ nke mmadụ asatọ bụ́ ndị ọ na-adịghị egboro mkpa ha, ọ na-alụsokwa nwunye ya, bụ́ Delia, ọgụ mgbe nile. Ebe ihe nọ gbanwee bụ́ n’otu ụtụtụ Sunday mgbe Ndịàmà Jehova letara ha ma malite ọmụmụ Bible. Mgbe mbụ Daniel gara mgbakọ sekit Ndịàmà Jehova, ọ matara na ya achọtawo eziokwu ahụ. Ọ sịrị: “Nhazi ya riri m ọnụ. Ndị mmadụ, ndị bara ụba n’ọnụ ọgụgụ, na-emekọ ihe ọnụ. Ị pụrụ inwe mmetụta nke ịhụnanya dị n’ìgwè mmadụ ahụ. Ọ dịghị onye na-ese sịga. E nweghị okwu rere ure ọ bụla. . . . Echetara m iche sị, ‘Nke a bụ eziokwu ahụ!’ Ọ bụghị egwu nke ọnwụ ma ọ bụ egwu nke ọgwụgwụ ụwa bụ ihe kpaliri m. Ọ bụ ịdị ọcha nke nzukọ ahụ.”
Ezinụlọ Rosero dum ghọrọ Ndịàmà Jehova. Ndụ ezinụlọ ha na ọnọdụ akụ̀ na ụba ha kawanyere mma ka ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Delia Rosero na-asị: “Ị ma na ọ bụ eziokwu Bible kpatara ihe a dum. Ònye ma ebe ụmụ m gaara anọ ma è wezụga Okwu Chineke? E mewo ha asaa dum baptism, ha kwụsikwara ike. Eziokwu ahụ ewetaworo m ndụ dịwagara nnọọ ọhụrụ, obi ụtọ ọhụrụ.”
Ahụmahụ ezinụlọ Rosero apụghị iche. Ọtụtụ n’ụbọchị anyị na-enwe nsogbu dị iche iche. Otu ihe na-akpata ya bụ na a dịkwaghị akwanyere ụkpụrụ omume e nwere na Bible n’ozuzu ha ùgwù, dị ka ọgbọ ndị bu ụzọ mere. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’okpukpe nile agbasowo usoro nke a, ma ọ̀ bụ n’aha ikwe ibe nọrọ ma ọ bụ n’ihi na ha chere na site ná mgbanwe nke oge ndị a ụkpụrụ omume ndị ochie na-abụ ndị na-adịkwaghị irè. Ya mere, dị ka ndị ọzọ, a hapụrụ ezinụlọ Rosero ka ha na-asọgharị ìsì n’enweghị nduzi Bible. Otú ọ dị, mgbe ndị dị otú ahụ dị obi umeala bịara ghọta echiche Chineke banyere omume na ndụ ezinụlọ, n’egbughị oge ha na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ. Site n’akụkọ ha dị iche iche anyị pụrụ ịhụ ihe ọma ndị na-esite n’ime otú ahụ.
A Ghaghị Ịzụlite Ọṅụ
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na onye Kraịst na-anọ mgbe nile n’oké obi ụtọ. O doro anya na ihe isi ike ụmụ mmadụ n’ozuzu ha na-eche ihu, dị ka enweghị ọrụ, ọrịa, na ọnwụ, na-emetụtakwa ndị Kraịst. Ọ dịkwa ndị Kraịst mkpa ịnọgide na-alụ ọgụ megide ezughị okè na adịghị ike ndị nke ha. Ihe ndekọ Bible na-asị na Lọt ‘weere ọrụ nke ndị na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ’ n’obodo Sọdọm. Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi apụghị izere inwe mmetụta ndị yiri nke ahụ mgbe ha na-ahụ ka ajọ ọnọdụ dị iche iche na-eju ebe nile.—2 Pita 2:7, 8.
Otú ọ dị, ndị chọtaworo eziokwu ahụ nwere ọnọdụ ka mma. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mkpa na onye kwere ekwe na-eru újú n’ihi onye nwụrụ anwụ ‘ga-eru újú dị ka ndị fọdụrụnụ bụ́ ndị na-enweghị olileanya na-eme.’ Obi ilu ya agaghị abụ nke na-enweghị ngwụsị. Nke a bụ eziokwu banyere nsogbu ndị ọzọ kwa. Onye nke chọtaworo eziokwu maara na ihe isi ike ndị dị ugbu a bụ nanị na nwa oge. Olileanya na-eme ka ọ kara mfe ịnagide ihe isi ike dị iche iche. Ụzọ ndụ nke a haziri nke ọma na-enyekwa aka.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.
Pọl nyere ndị Kraịst agbamume a: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.” (Ndị Filipaị 4:4) Nke a na-egosi na ọ bụ ezie na ọṅụ dị n’ebe aka anyị nile pụrụ iru, ọ pụkwara ikwe omume na mmadụ enweghị ya. Nchekasị nile nke usoro ihe ochie a pụrụ ịghọ ihe mgbochi. Tinyere nke ahụ, Bible na-agwa anyị na ọ dị anyị mkpa ịzụlite ọṅụ, otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22) Ọ bụrụ na ị nọgide na-anara ihe ọmụma nke eziokwu ma na-echetara onwe gị ụba ihe ime mmụọ o wetaworo ma ka na-eweta, ọṅụ gị agaghị adalata. Ọ ga-esiwanye ike ka anyị na-eru nso n’oge mgbe Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla” n’anya ndị mmadụ na mgbe “iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ” na-agaghị adịkwa ọzọ.—Mkpughe 21:4.
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ọṅụ na ezi nhazi a na-enwe ná mgbakọ Ndịàmà Jehova na-amasị ọtụtụ ndị