-
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmekọahụ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
4. Ị ga-emerili ọnwụnwa
Ọnwụnwa bịara anyị ka anyị kwaa iko, gịnị nwere ike ime ka imeri ya siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mgbe nwanna a anyị lere na vidio chọpụtara na ihe ndị ọ na-eche na ihe ndị ọ na-eme nwere ike ime ka ọ gbawa n’èzí, gịnị ka o mere?
Ezigbo Ndị Kraịst nwedịrị ike iche ihe na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịnọgịde na-eche ihe na-adịghị mma? Gụọnụ Ndị Filipaị 4:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ụdị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eche?
Olee otú ịgụ Baịbụl na ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ?
-
-
Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Ị Na-ekwu Na-atọ Jehova Ụtọ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekwu okwu otú ga-agba ndị ọzọ ume?
Ihe ndị anyị na-akpụkarị n’ọnụ na-egosi otú anyị si ele ihe anya na ihe ndị dị anyị n’obi. (Luk 6:45) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na-eche ihe ndị dị mma, ya bụ, ihe ndị ziri ezi, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, na ihe ndị kwesịrị otuto. (Ndị Filipaị 4:8) Ihe ga-enyere anyị aka ịna-eche ihe ndị a bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ nakwa ụdị ndị anyị na-emete enyi. (Ilu 13:20) Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ ịna-eche ihe anyị chọrọ ikwu eche. Chee otú obi ga-adị ndị ọzọ n’ihi ihe i kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma okwu ndị ma ihe na-agwọ mmadụ.”—Ilu 12:18.
-