‘Na-ekpenụ Ekpere n’Ihi Ibe Unu’
JEHOVA bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ na-anụ ekpere nke ndị ahụ ji obi ha dum rara onwe ha nye ya na-ekpe mgbe nile, anyị pụkwara ijide n’aka na ọ na-ege ntị mgbe ha na-ekpe ekpere n’ihi ibe ha.
Ma n’ihi gịnị ka a ga-eji kpee ekpere otu onye n’ihi ibe ya? Banyere gịnị ka e kwesịrị ikpe ekpere ndị dị otú ahụ? Oleekwa àgwà Chineke ndị a na-eme ka ha pụtawanye ìhè mgbe anyị na-ekpere ibe anyị ekpere?
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kpee Ekpere Otu Onye n’ihi Ibe Ya?
Akwụkwọ nsọ na-agba ndị Jehova ume ikpe ekpere n’ihi ibe ha. Ekpere o kpere n’ihi ndị ọzọ so n’arịrịọ ndị Pọl onyeozi rịọrọ Chineke. (Ndị Kọlọsi 1:3; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:11) Ọzọkwa, Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: ‘Na-ekpenụ ekpere n’ihi ibe unu.’—Jemes 5:16.
Ekpere a na-ekpere ndị ohu Chineke ndị ọzọ na-adị irè. E gosiri nke a na Jemes 5:13-18, ebe a gbara onye Kraịst nke nọ n’ọrịa ime mmụọ ume ime ka ndị okenye ọgbakọ ‘kpee ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ n’aha Jehova.’ Ịnụ ekpere ha pụrụ iwusi onye nọ ná mkpagbu ike, meekwa ka o kwere na Chineke ga-azakwa ekpere nke ya onwe ya. (Abụ Ọma 23:5; 34:18) E wezụgakwa iso onye ahụ kpekọọ ekpere, ndị okenye na-agbalị iweghachite onye ahụ n’ahụ ike ime mmụọ site n’ikwupụta echiche ndị sitere n’Akwụkwọ nsọ, ndị yiri mmanụ nke na-eme ka ahụ dajụọ.
Jemes kwukwara, sị: “Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ga-emekwa ka o bilie.” Ee, o yikarịrị nnọọ ka “ekpere nke okwukwe” nke ndị okenye ahụ ga-enyere onye ahụ nọ n’ọrịa ime mmụọ aka. Karịsịa, Chineke “ga-emekwa ka o bilie” bịaghachi n’ahụ ike ime mmụọ ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ịbụ onye Akwụkwọ nsọ nyeere aka. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọrịa ime mmụọ ahụ bịara n’ihi mmehie dị oké njọ? Ee, ọ bụrụ na onye ahụ nwere nchegharị, Jehova ga-agbaghara ya.
Jemes sịrị, “Ya mere, na-ekwupụtanụ mmehie nile unu gwarịta ibe unu, na-ekpekwa ekpere n’ihi ibe unu, ka e wee mee ka ahụ dị unu ike. Arịrịọ nke onye ezi omume dị ike nke ukwuu n’ịrụsi ọrụ ike ya. Elaịja . . . [kpere ekpere] ka mmiri ghara izo; mmiri ezoghịkwa n’ala afọ atọ na ọnwa isii. O wee kpee ekpere ọzọ; eluigwe wee nye mmiri ozuzo; ala wee mịa mkpụrụ.” (1 Ndị Eze 17:1-7; 18:1, 42-45) E nwere ike nke dị n’ime ekpere onye ezi omume, bụ́ nke kwekọrọ n’uche Chineke.—1 Jọn 5:14, 15.
Kpee Ekpere Banyere Gịnị?
A pụrụ ikpe ekpere n’ihi onye kwere ekwe ibe anyị banyere ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara ndị ọzọ ka ha kpee ekpere ka ya nwee ike ikwusa ozi ọma ahụ. (Ndị Efesọs 6:17-20) Gịnị ma a sị na anyị maara na mmadụ na-eche ọnwụnwa ihu? Anyị pụrụ ikpe ekpere ka ‘ọ ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla,’ ka Chineke gharakwa ịgbakụta ya azụ nye ọnwụnwa ahụ kama ka ọ napụta ya site n’aka ajọ onye ahụ, Setan bụ Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 13:7; Matiu 6:13) Ọ bụrụkwa na mmadụ na-arịa ọrịa nkịtị, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka o nye ya obi ike dị mkpa iji nwee ntachi obi n’ọrịa ya.—Abụ Ọma 41:1-3.
O kwesịrị ekwesị mgbe nile ikpe ekpere n’ihi ndị na-efe Jehova ndị a na-akpagbu. Pọl na ndị ya na ha so nwetara mkpagbu siri oké ike, ọ gwakwara ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “Unu onwe unu pụkwara inye aka site n’arịrịọ unu na-arịọ n’ihi anyị, ka ọtụtụ ndị wee nwee ike inye ekele n’ihi anyị n’ihi ihe e jiworo obi ọma nye anyị site n’ekpere nke ọtụtụ ndị.” (2 Ndị Kọrint 1:8-11, NW; 2 Ndị Kọrint 11:23-27) Ọbụna ma a si na anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị pụrụ ikpe ekpere n’ihi ụmụnna ndị ọzọ a na-akpagbu, na-echeta mgbe nile na Jehova na-anụ “ekpere ndị ezi omume.”—Ilu 15:29.
Karịsịa, anyị kwesịrị ikpe ekpere n’ihi ụmụnna anyị ndị nwere ibu ọrụ dị ukwuu n’ime nzukọ Jehova. Nke a gụnyere ndị ahụ na-eduzi nzukọ ahụ, na-akwadebekwa nri ime mmụọ nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ekesa. (Matiu 24:45-47) Dị ka ihe atụ, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kwesịrị ka a na-ekpe ekpere n’ihi ha, anyị pụkwara ikpe ekpere ka Chineke nye ha “mmụọ nke amamihe.”—Ndị Efesọs 1:16, 17.
A Na-eme Ka Àgwà Ndị Kraịst Dịwanye Mma
Site n’ikpe ekpere n’ihi ndị kwere ekwe ibe anyị, anyị na-egosi na anyị na-echegbukwa onwe anyị banyere ndị ọzọ, n’adịghị achọ ọdịmma nke onwe anyị nanị, na-ahụkwa n’anya. Nchegbu ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị n’ihi ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị kwekọrọ n’isi ihe ahụ Pọl mere ka ọ pụta ìhè nke bụ na ịhụnanya ‘adịghị achọ ọdịmma nke aka ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Ikpe ekpere n’ihi ndị ọzọ bụ otu ụzọ anyị na-esi ‘elekwasị anya, ọ bụghị n’ọdịmma onwe onye nanị n’ihe nke aka anyị, kamakwa n’ọdịmma onwe onye n’ihe nke ndị ọzọ.’ (Ndị Filipaị 2:4) Mgbe anyị mere ka ọdịmma ime mmụọ nke dị ọzọ bụrụ ihe anyị na-echegbu onwe anyị banyere ya site n’ekpere, anyị na-ahụtakwa na anyị na-abịa ha nso karị n’ịhụnanya ụmụnna nke bụ ihe e ji amara ndị na-eso ụzọ Jisọs.—Jọn 13:34, 35.
A Na-ewulite àgwà nke inwe mmetụta banyere ndị ọzọ n’ebe ndị ahụ anyị na-ekpe ekpere n’ihi ha nọ. (1 Pita 3:8) Anyị na-enwe ọmịiko n’ihi ha, na-ekere òkè n’ọdịmma na mkpagbu ha nile. N’ahụ mmadụ, ọ bụrụ na e merụọ ahụ n’aka, aka nke ọzọ na-elekọta ya, na-agbalị ibelata ahụhụ nke mmerụ ahụ ahụ kpatara. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 12:12, 26.) N’otu aka ahụ, ikpe ekpere n’ihi ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ndị na-ata ahụhụ na-ewulite ọmịiko anyị nwere n’ebe ha nọ, na-enyekwara anyị aka ibu ha n’uche. Ọ bụụrụ anyị mfu ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ihota ndị Kraịst ibe anyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ekpere, n’ihi na Chineke na Kraịst adịghị agbakụta ha azụ.—1 Pita 5:6, 7.
A na-emeziwanye àgwà dị iche iche nke Chineke mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ihi ndị ọzọ. Anyị na-aghọwanye ndị nwere nghọta na ndidi n’ebe ha nọ. A na-efopụ obi ilu ọ bụla anyị pụrụ inwe, na-enye ohere maka echiche ndị na-ewuli elu ndị na-eme ka anyị bụrụ ndị na-ahụ n’anya, na-enwekwa ọṅụ. Ikpe ekpere n’ihi ndị ọzọ na-akwalitekwa udo na ịdị n’otu n’etiti ndị Jehova.—2 Ndị Kọrint 9:13, 14.
Nọgide Na-ekpe Ekpere n’Ihi Ndị Ọzọ
Dị ka Pọl, anyị pụrụ ịgwa ndị ọzọ ka ha na-ekpe ekpere n’ihi anyị. E wezụgakwa iso anyị kpekọọ ekpere, ndị enyi anyị pụrụ ikpeku Chineke ekpere n’onwe ha n’ihi anyị, na-akpọtụ anyị aha, na-ehota nsogbu anyị na-enwe, na-arịọkwa ka o nyere anyị aka. Enyemaka ga-abịakwa n’ihi na “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 2:9.
Ndịàmà Jehova ndị na-akpọtụ anyị aha n’ekpere ha na-echekwa ọnwụnwa dị iche iche ihu—ma eleghị anya ndị dị njọ karịa nke anyị onwe anyị. Ma n’agbanyeghị nke a, ha na-eburu nchegbu anyị nile jekwuru Eze Mgbe Ebighị Ebi ahụ, ma eleghị anya na-ebepụta anya mmiri n’ihi anyị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:4; 2 Timoti 1:3, 4.) Lee nnọọ ka anyị kwesịrị isi nwee obi ekele maka nke a! Ya mere, n’igosi obi ekele anyị, nakwa n’ihi ihe ndị ọzọ anyị ka tụlesịrị ugbu a, ka anyị na-ekpe ekpere n’ihi ibe anyị.