Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịkwụsị Ịmụ Baịbụl?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịkwụsị Ịmụ Baịbụl?

      Ịmụ Baịbụl bara uru. Ma, ọ naghị adịcha mfe mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịna-eche ma ọ̀ ga-adịkwara gị mfe ịmụrụ Baịbụl na-aga. Gịnị mere o ji bụrụ na mbọ ọ bụla ị gbara ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl efughị ọhịa? Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ ya n’agbanyeghị na ọ dịchaghị mfe?

      1. Gịnị mere ịmụ Baịbụl ji baa uru?

      Baịbụl sịrị na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Baịbụl bara uru n’ihi na o kwuru ihe Chineke na-eche gbasara gị, kwuokwa na Chineke hụrụ gị n’anya. Baịbụl na-akụziri gị ọtụtụ ihe ma na-eme ka ndụ gị ka mma. Ọ na-emekwa ka i nwee olileanya. Nke ka nke bụ na ọ ga-enyere gị aka ka ị bụrụ enyi Jehova. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ọ ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ.

      2. Gịnị mere ịmara uru Baịbụl bara ji dị mkpa?

      Eziokwu ndị dị na Baịbụl yiri akụ̀ bara ezigbo uru. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Ọ bụrụ na anyị ana-echeta mgbe niile na eziokwu dị na Baịbụl bara uru, anyị ga-agba mbọ na-amụ ihe mgbe niile, ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike.—Gụọ Ilu 2:4, 5.

      3. Olee otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?

      Ebe ọ bụ na Jehova, onye kere ihe niile na onye pụrụ ime ihe niile, bụ enyi gị, ọ chọrọ inyere gị aka ka ị mụta gbasara ya. O nwere ike ime ka ‘i nwee mmasị ime ihe, nyekwa gị ike i ji eme ya.’ (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ dị gị ka ị gaghị amụli ihe ma ọ bụ na ị gaghi emeli ihe ị mụtara, o nwere ike inyere gị aka. O nwere ike inyekwu gị ume ga-enyere gị aka ịna-amụ Baịbụl n’agbanyeghị mmegide ma ọ bụ ihe ọ bụla na-eme ka o siere gị ike ịmụ ya. Na-arịọ Jehova mgbe niile n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta ihe ga-eme ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl a sịgodị na ị naghị enwe ohere ma ọ bụ na ndị ọzọ na-enye gị nsogbu ka ị kwụsị ịmụ ya. Chọpụta otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị mụrụ ya na-aga.

      4. Mee ka ọmụmụ ihe gị bụrụ ihe kacha gị mkpa

      Mgbe ụfọdụ, mere nke a mere nke ọzọ nwere ike mee ka o yie ka anyị enweghịzi ohere anyị ga-eji na-amụ Baịbụl. Ma, gịnị nwere ike inyere anyị aka? Gụọnụ Ndị Filipaị 1:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ụfọdụ ihe ndị i chere “ka mkpa” ná ndụ?

      • Olee otú ị ga-esi gosi na Baịbụl ị na-amụ bụ ihe kacha gị mkpa?

      A. Foto atọ na-egosi ájá na okwute na mgbe ha juru na bọket. 1. Ikpo ájá na okwute dị iche iche. 2. Ebe ọ fọrọ obere ka ájá ju bọket. 3. Ebe e tinyejuru okwute n’elu ájá dị na bọket, okwute abụọ afọkwa n’ala. B. Foto atọ: 1. Ikpo ájá mbụ ahụ na okwute ndị ahụ. 2. Ebe ọ fọrọ obere ka okwute ndị ahụ ju bọket ahụ. 3. Ebe e kponyere ájá ahụ n’agbata okwute ndị ahụ dị na bọket, ya eju n’ọnụ. Ma, ájá dị n’ala nke na-abaghị na bọket ahụ dị obere.
      1. Ọ bụrụ na ị wụnye ájá na bọket ma tinyewe okwute na ya, okwute ndị ahụ agaghị aba

      2. Ma ọ bụrụ na i tinyechaa okwute ndị ahụ na bọket tupu wụnyewe ya ájá, ọ ga-afọ obere ka ájá ahụ niile banyechaa na ya. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ “ihe ndị ka mkpa” ka ị na-ebu ụzọ eme ná ndụ gị. Ị ga-emecha ha, nweekwa ohere ị ga-eji eme ihe ndị ọzọ

      Ịmụ Baịbụl ga-eme ka anyị mara Chineke ma na-efe ya, si otú ahụ gosi na anyị ma na ọ bụ ya kwesịrị ịna-eduzi anyị. Gụọnụ Matiu 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee uru anyị ga-erite ma anyị mee ka ịmụ Baịbụl buru ihe kacha anyị mkpa?

      5. Na-amụ Baịbụl ọ bụrụgodị na a na-emegide gị

      Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike ime ihe ga-eme ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl. Chọpụta otú udị ihe ahụ si mee Francesco. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Ndidi O Nwere Baara Ya Uru (5:22)

      Foto si na vidio bụ́ ‘Ndidi O Nwere Baara Ya Uru.’ Francesco si n’ebe ezigbo ndị enyi ya nọ na-apụ mgbe ọ gwachara ha na ya na ha agaghịzi na-akpa.
      • Na vidio a, gịnị ka ndị enyi Francesco na mama ya mere mgbe ọ gwara ha ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl?

      • Olee uru o ritere maka na ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl?

      Gụọnụ 2 Timoti 2:24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee otú obi dị ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị gbasara ihe ị na-amụ?

      • Olee ihe ebe a kwuru i kwesịrị ime ma e nwee onye obi na-adịghị mma maka na ị na-amụ Baịbụl? Maka gịnị?

      6. Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka

      Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, ime ihe dị ya mma ga na-agụkwu anyị agụụ. Ma, ọ ka nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme ma mewe ihe dị ya mma. Mgbe ọ bụla o siiri gị ike otú ahụ, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Jehova Na-enyere Anyị Aka Ịgbanwe (3:56)

      • Na vidio a, olee ihe ndị Jim kwụsịrị ime iji mee ihe dị Jehova mma?

      • Gịnị masịrị gị n’akụkọ ya?

      Gụọnụ Ndị Hibru 11:6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Gịnị ka Jehova ga-emere ndị “na-achọsi ya ike,” ya bụ, ndị na-agbasi mbọ ike ka ha mata ya, na-emekwa ihe dị ya mma?

      • Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ mbọ ị na-agba ịmụ Baịbụl?

      MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere i ji na-amụ Baịbụl.

      • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

      NCHỊKỌTA

      Ịmụ Baịbụl mgbe niile anaghị adịcha mfe, ma ịmụ ya nwere ike ime ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-akwụ gị ụgwọ ma ị tụkwasị ya obi mgbe niile.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Gịnị mere na i jighị eziokwu ndị dị na Baịbụl egwu egwu?

      • Ebe ọ bụ na ‘ị chọpụtala ihe ndị ka mkpa,’ gịnị ka i kwesịrị ime?

      • Gịnị mere i kwesịrị iji na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta ihe anọ nyeerela ọtụtụ ndị aka iji oge ha na-eme ihe bara uru.

      “Otú Ị Ga-esi Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru” (Teta!, Febụwarị 2014)

      Chọpụta otú Jehova si nyere otu nwaanyị aka mgbe di ya na-aghọtaghị ihe mere o ji kpebie ife Chineke.

      Jehova Na-enye Anyị Ike Ibu Ibu Anyị (5:05)

      Chọpụta uru otu nwoke ritere maka na nwunye ya tachiri obi.

      M Gara Mara Ihe Eziokwu Dị Ka Ya (6:30)

      Ndị mmadụ na-ekwu na Ndịàmà Jehova na-eme ka iro dịrị n’ezinụlọ. Ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu?

      “Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Ezinụlọ Ka Ha Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Udo?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

  • Nọgide Na-eme Ka Gị na Jehova Na-adị ná Mma
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 3. Olee otú Jehova ga-esi enyere gị aka ná mbọ ị na-agba ka gị na ya dịrị ná mma?

      Baịbụl kwuru, sị: “Chineke . . . ga-azụru unu n’isi. Ọ ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.” (1 Pita 5:10) A na-anwa anyị niile ime ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ. Ma, Jehova na-enye anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 139:23, 24) O kwere nkwa na ya ga-eme ka i nwee mmasị ịna-efe ya, nyekwa gị ike ị ga-eji na-efe ya nke ọma.​—Gụọ Ndị Filipaị 2:13.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya