Gameliel—Ọ Kụziiri Sọl nke Tasọs Ihe
ÌGWÈ mmadụ ahụ nọọrọ jụụ. Nanị ntakịrị oge tupu mgbe ahụ, ọ fọrọ nke nta ka ha gbuo Pọl onyeozi. Onye a makwaara dị ka Sọl nke Tasọs, ndị agha Rom anapụtawo ya, ugbu a kwa o chere ndị ahụ ihu site n’ebe e si arịgo ụlọ elu nke dịdewere ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem.
N’ifere ndị ahụ aka ka ha nọrọ jụụ, Pọl malitere ikwu okwu n’asụsụ Hibru, na-asị: “Ụmụnne m na ndị bụ nna m, nụrụnụ ngọpụ m n’ebe unu nọ ugbu a. . . . Mụ onwe m bụ onye Juu, nke a mụrụ na Tasọs nke Silisia, ma a zụpụtara m n’obodo a, n’ụkwụ Gameliel, e ziwo mụ ihe, dị ka e si edebezu iwu nke nna anyị hà, obi m na-anụ ọkụ nye Chineke, dị ka unu onwe unu nile dị taa.”—Ọrụ 22:1-3.
Ebe ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ, n’ihi gịnị ka Pọl ji malite ngọpụ ya site n’ikwu na Gameliel ziri ya ihe? Ònye bụ Gameliel, gịnịkwa ka ịbụ onye o ziri ihe gụnyere? Ọzụzụ a ò nwere mmetụta n’ahụ Sọl ọbụna mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi?
Ònye Bụ Gameliel?
Gameliel bụ onye Farisii a ma ama. Ọ bụ nwa nwa Hillel nke Okenye, bụ́ onye maliteworo otu n’ime ìgwè abụọ ndị bụ isi e nwere n’okpukpe ndị Juu nke ndị Farisii.a E weere ụzọ izi ihe nke Hillel dị ka nke dị nro karịa nke onye na-ama ya aka, bụ́ Shammai. Mgbe e bibisịrị ụlọ nsọ Jerusalem na 70 O.A., e nwere mmasị na Bet Hillel (Ezinụlọ Hillel) karịa na Bet Shammai (Ezinụlọ Shammai). Ezinụlọ Hillel ghọrọ okwu a nakweere e ji eme ihe n’okpukpe ndị Juu, ebe ọ bụ na ịrọ òtù ndị ọzọ nile pụrụ n’anya mgbe e bibiri ụlọ nsọ ahụ. Mkpebi nile nke Bet Hillel na-abụkarị ihe mgbakwasị ụkwụ maka iwu ndị Juu ndị dị na Mishnah, bụ́ nke ghọrọ ntọala nke Talmud, o dokwara anya na mmetụta Gameliel bụ isi ihe kpatara mmeri ya.
A na-akwanyere Gameliel ùgwù nke ukwuu nke na ọ bụ ya bụ onye mbụ a kpọrọ rabban, utu aha karịrị nke rabaị. N’ezie, Gameliel ghọrọ onye a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu nke na Mishnah na-ekwu banyere ya, sị: “Mgbe Rabban Gameliel nke okenye nwụrụ ebube nke Torah bịara ná njedebe, ịdị ọcha na ịdị nsọ [n’ụzọ nkịtị “nkewapụ”] kwụsịkwara ịdị.”—Sotah 9:15.
Onye Gameliel Ziri Ihe—N’ụzọ Dị Aṅaa?
Mgbe Pọl onyeozi gwara ìgwè mmadụ ahụ nọ na Jerusalem na ‘e ziri ya ihe n’ụkwụ Gameliel,’ gịnị ka o bu n’uche? Gịnị ka ịbụ onye na-eso ụzọ nke onye nkụzi dị ka Gameliel gụnyere?
Banyere ọzụzụ dị otú ahụ, Prọfesọ Dov Zlotnick nke Seminarị Nkà Mmụta Okpukpe Ndị Juu n’America na-ede, sị: “Izi ezi nke iwu ahụ a na-edeghị ede, n’ihi nke a ya ịbụ nke a pụrụ ịdabere na ya, dabeere n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kpam kpam ná mmekọrịta nke onye nkụzi na nwa akwụkwọ ya: nlezianya nke onye nkụzi ji eme ihe n’ịkụzi iwu ahụ na nzubesi ike nke nwa akwụkwọ ahụ ịmụta ya. . . . Ya mere, a na-agba ndị na-eso ụzọ ume ịnọdụ ala n’ụkwụ nke ndị ọkà mmụta ahụ . . . ‘na iji akpịrị ịkpọ nkụ ṅụọ okwu ha dị ka mmiri.’”—Avot 1:4, Mishnah.
N’akwụkwọ ya bụ́ A History of the Jewish People in the Time of Jesus Christ, Emil Schürer na-amụkwasị ìhè n’ụzọ izi ihe nke ndị nkụzi bụ́ ndị rabaị na narị afọ mbụ. Ọ na-ede, sị: “Ndị Rabaị a ma ama karị na-akpọkọtakarị gburugburu ha n’ọnụ ọgụgụ buru ibu, ndị ntorobịa agụụ ntụziaka na-agụsi ike, ná nzube nke ime ka ha mata nke ọma ‘iwu ahụ a na-edeghị ede’ nke nwere ọtụtụ ngalaba na nkọwa buru ibu. . . . Ihe mejupụtara ntụziaka ahụ bụ ịnọgide jiri ikike ncheta ihe na-eme ihe n’enweghị ike ọgwụgwụ. . . . Onye nkụzi ahụ na-eche ụfọdụ ajụjụ metụtara iwu n’ihu ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha mee mkpebi na ha, nyekwa ha ohere ịza ha ma ọ bụ zaa ha n’onwe ya. E nyekwara ụmụ akwụkwọ ahụ ohere ịjụ onye nkụzi ahụ ajụjụ.”
N’echiche ndị rabaị ahụ, ihe ụmụ akwụkwọ ahụ na-agba mgba ya karịrị nanị inweta akara ngafe n’ule. A dọrọ ndị na-amụ ihe n’okpuru ndị nkụzi dị otú ahụ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla chefuru otu mkpụrụ ihe n’ihe ọ mụtara—Akwụkwọ Nsọ na-agụrụ ya dị ka a ga-asị na ndụ ya dị ya n’aka.” (Avot 3:8) A na-enye nwa akwụkwọ nke yiri “olulu mmiri e tere plasta, nke otu mkpụrụ mmiri na-adịghị atapụ na ya” otuto kasị ukwuu. (Avot 2:8) Ọ bụ ụdị ọzụzụ dị otú ahụ ka Pọl, bụ́ onye e ji aha Hibru ya, bụ́ Sọl nke Tasọs, mara n’oge ahụ, nwetara site n’aka Gameliel.
Nzube nke Ozizi Gameliel
N’ikwekọ n’izi ihe ndị Farisii, Gameliel kwalitere okwukwe n’ime iwu ahụ a na-edeghị ede. O si otú a mesie ọdịnala nke ndị rabaị ike karịa Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ. (Matiu 15:3-9) Mishnah ahụ na-ehota Gameliel dị ka onye kwuru, sị: “Chọtara onwe gị onye nkụzi [onye rabaị] ma nwere onwe gị pụọ n’inwe obi abụọ, n’ihi na ị gaghị enye otu ụzọ n’ụzọ iri gafere agafe n’ihi ịkọ nkọ.” (Avot 1:16) Nke a pụtara na mgbe Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ekwughị kpọmkwem ihe a ga-eme, mmadụ agaghị eji echiche nke onwe ya mee ihe ma ọ bụ gbasoo akọ na uche ya iji mee mkpebi. Kama nke ahụ, ọ ga-achọta onye rabaị ruru eru onye ga-emere ya mkpebi ahụ. Dị ka Gameliel si kwuo, ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka mmadụ ga-esi zere ime mmehie.—Tụlee Ndị Rom 14:1-12.
Otú ọ dị, a maara Gameliel n’ọha maka àgwà ikwe ibe nọrọ, nke ịnabata echiche nke ndị ọzọ ná mkpebi ikpe ya n’iwu okpukpe. Dị ka ihe atụ, o gosiri nchebara echiche maka ụmụ nwanyị mgbe o nyere iwu na ya ‘ga-ekwe ka nwanyị lụgharịa di dabere n’akaebe nke otu onye àmà [maka ọnwụ di ya].’ (Yevamot 16:7, Mishnah) Ọzọkwa, iji chebe onye a gbara alụkwaghịm, Gameliel webatara ọtụtụ ihe mgbochi n’okwu banyere akwụkwọ ozi ịgba alụkwaghịm.
A na-ahụkwa mmụọ nke a ná mmeso Gameliel mesoro ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst n’oge mbụ. Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ na mgbe ndị ndú ndị Juu ndị ọzọ chọrọ igbu ndị ozi Jisọs bụ́ ndị ha jideworo n’ihi ime nkwusa, “otu onye biliri ná nnọkọ ikpe ahụ, bụ́ onye Farisii, aha ya bụ Gameliel, onye na-ezi iwu Mosis, onye ndị Juu nile na-asọpụrụ, o wee kwuo ka a kpọpụ mmadụ ahụ n’èzí nwa oge. O wee sị ha, Ndị ikom nke Israel, na-ezenụ onwe unu n’ihe banyere mmadụ ndị a, ihe unu gaje ime. . . . M sịkwa unu ugbu a, Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: . . . ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke ma eleghị anya.” A ṅara ntị n’okwu ndụmọdụ Gameliel, a tọhapụkwara ndị ozi ahụ.—Ọrụ 5:34-40.
Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Pọl?
Otu n’ime ndị nkụzi rabaị kasị ukwuu na narị afọ mbụ O.A. azụwo ma zie Pọl ihe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na izo aka onyeozi ahụ zoro n’ebe Gameliel nọ mere ka ìgwè mmadụ ahụ nọ na Jerusalem ṅaa ntị n’ụzọ pụrụ iche n’okwu ya. Ma ọ gwara ha okwu banyere Onye Nkụzi karịrị nnọọ Gameliel—Jisọs, Mesaịa ahụ. Ugbu a ọ bụ dị ka onye na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụghị Gameliel, ka Pọl gwara ìgwè mmadụ ahụ okwu.—Ọrụ 22:4-21.
Ọzụzụ Gameliel nyere ya ò nwere mmetụta n’izi ihe Pọl dị ka onye Kraịst? O yiri ka, izi ihe ahụ siri ike n’Akwụkwọ Nsọ na iwu ndị Juu baara Pọl uru dị ka onye nkụzi bụ́ onye Kraịst. Ma, akwụkwọ ozi Pọl ndị sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke bụ́ ndị a na-achọta na Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ jụrụ ozizi ndị bụ isi dị ná nkweta ndị Farisii nke Gameliel nwere. Pọl dọọrọ uche nke ndị Juu ibe ya na ndị ọzọ nile gaa, ọ bụghị n’ebe ndị rabaị nke okpukpe ndị Juu nọ ma ọ bụ n’ebe ọdịnala ndị mmadụ mere dị, kama n’ebe Jisọs Kraịst nọ.—Ndị Rom 10:1-4.
A sị na Pọl nọgidere bụrụ onye na-eso ụzọ Gameliel, ọ gaara enwetaworị oké ùgwù. Ndị ọzọ ha na Gameliel nọ n’otu ọkwá nyere aka ịkpụzi ọdịnihu nke okpukpe ndị Juu. Dị ka ihe atụ, nwa Gameliel bụ́ Simeọn, nke ya na Pọl gụkọrọ akwụkwọ ma eleghị anya, keere òkè bụ isi ná nnupụisi ndị Juu megide Rom. Mgbe e bibisịrị ụlọ nsọ ahụ, nwa nwa Gameliel bụ́ Gameliel nke Abụọ weghachiri ikike nke Sanhedrin, na-ebufe ya na Yavneh. Nwa nwa Gameliel nke Abụọ bụ́ Judah Ha-Nasi bụ onye chịkọtara Mishnah, bụ́ nke ghọworo nkume ntọala nke echiche ndị Juu ruo taa.
Dị ka nwa akwụkwọ Gameliel, Sọl nke Tasọs gaara aghọworị onye a ma nnọọ ama n’okpukpe ndị Juu. Ma, banyere ọrụ dị otú ahụ, Pọl dere, sị: “Ihe ọ bụla nke baara m uru, ihe ndị a ka m gụrụ n’ihe iyi n’ihi Kraịst anyị. Ee, tụkwasịkwa, ana m agụkwa ihe nile n’ihe iyi n’ihi ọkịka nke ọmụma Kraịst Jisọs, bụ́ Onyenwe m: Onye m yiri iyi ihe nile nke m n’ihi Ya, ana m agụkwa ha n’ihe mkpofu, ka m wee rite Kraịst n’uru.”—Ndị Filipaị 3:7, 8.
Site n’iwezụga ọrụ ya dị ka onye Farisii n’ụsọ na ịghọ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, Pọl na-etinye okwu ndụmọdụ nke onye nkụzi ya mbụ n’ọrụ bụ́ ịnọ na nche “ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke.” Site n’ịkwụsị mkpagbu ọ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jisọs, Pọl kwụsịrị ịlụso Chineke ọgụ. Kama nke ahụ, site n’ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ ghọrọ otu n’ime ndị “ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:9.
Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi nọgidere na-akpọsa ozi nke ezi Iso Ụzọ Kraịst n’ụbọchị anyị. Dị ka Pọl, ọtụtụ n’ime ndị a emewo mgbanwe ndị dị ịrịba ama ná ndụ ha. Ụfọdụ ọbụna ahapụwo ọrụ ndị uru dị na ha iji kere òkè ka ukwuu n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ọrụ “sitere n’aka Chineke” n’ezie. (Ọrụ 5:39) Lee ka ha si nwee obi ụtọ na ha agbasowo ihe nlereanya Pọl kama nke onye nkụzi ya mbụ, bụ́ Gameliel!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ ndị na-ekwu na Gameliel bụ nwa Hillel. Talmud ekwughị ihe ọ bụla doro anya n’okwu a.
[Foto dị na peeji nke 28]
Dị ka Pọl onyeozi, Sọl nke Tasọs kpọsaara ndị nke mba nile ozi ọma ahụ