Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?—Nke 1
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • O nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nghọtahie. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịgbakọ aka dozie nghọtahie ndị ha na-enwe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Dịkwuo ná Mma (5:44)

      • Olee ụfọdụ ihe gosiri na di na nwunye anyị hụrụ na vidio a adịchaghịzi ná mma?

      • Gịnị na gịnị ka ha mere iji dịrịkwa ná mma?

      Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:24 na Ndị Kọlọsi 3:13. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú ime ihe ebe a kwuru nwere ike isi mee ka di na nwunye dịkwuo ná mma?

      Baịbụl sịrị na anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ibe anyị. Otu n’ime ụzọ anyị si asọpụrụ mmadụ bụ igosi ya obiọma na ịkwanyere ya ùgwù. Gụọnụ Ndị Rom 12:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Di ma ọ bụ nwunye ò kwesịrị ịna-atụ anya ka onye nke ọzọ buru ụzọ na-akwanyere ya ùgwù? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

  • Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 3. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na nwanna nwee nghọtahie?

      Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ndị ọzọ ihe ha na-atụghị anya ya ma ọ bụdị mee ihe ga-ewute ha. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị.’ O kwukwara, sị: “Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị enweghị ike ịgụta ugboro ole anyị na-emehie Jehova, ma, ọ na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere onye i mejọrọ, gakwuru ya ka unu kpezie.​—Gụọ Matiu 5:23, 24.b

  • Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 5. Gbaghara ndị ọzọ kpamkpam, gị na ha kpeziekwa

      N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ Jehova mere anyị nke anyị ga-agbaghara ya, ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam. Gụọnụ Abụ Ọma 86:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ike ọ̀ na-agwụ Jehova ịgbaghara anyị?

      • Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ maka otú o si agbaghara anyị?

      • Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-adị n’otu?

      Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu na-aga? Gụọnụ Ilu 19:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe ma ọ bụ mejọọ gị, gịnị ka i nwere ike ime ka ihe ghara ịka njọ?

      Anyị na-emejọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Jehova Ga-agọzi Gị ma Ị Na-eme Udo (6:01)

      • Na vidio a anyị lere, gịnị ka otu nwanna nwaanyị mere ka ya na nwanna nwaanyị ọzọ dịrị ná mma?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya