-
Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?—Nke 1Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
O nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nghọtahie. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịgbakọ aka dozie nghọtahie ndị ha na-enwe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ụfọdụ ihe gosiri na di na nwunye anyị hụrụ na vidio a adịchaghịzi ná mma?
Gịnị na gịnị ka ha mere iji dịrịkwa ná mma?
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:24 na Ndị Kọlọsi 3:13. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ime ihe ebe a kwuru nwere ike isi mee ka di na nwunye dịkwuo ná mma?
Baịbụl sịrị na anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ibe anyị. Otu n’ime ụzọ anyị si asọpụrụ mmadụ bụ igosi ya obiọma na ịkwanyere ya ùgwù. Gụọnụ Ndị Rom 12:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Di ma ọ bụ nwunye ò kwesịrị ịna-atụ anya ka onye nke ọzọ buru ụzọ na-akwanyere ya ùgwù? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
-
-
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’OtuNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Gịnị ka ị ga-eme ma gị na nwanna nwee nghọtahie?
Ọ bụ eziokwu na anyị dị n’otu, ma anyị ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike mee ndị ọzọ ihe ha na-atụghị anya ya ma ọ bụdị mee ihe ga-ewute ha. Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị.’ O kwukwara, sị: “Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị enweghị ike ịgụta ugboro ole anyị na-emehie Jehova, ma, ọ na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ọ chọrọ ka anyị na-agbaghara ụmụnna anyị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere onye i mejọrọ, gakwuru ya ka unu kpezie.—Gụọ Matiu 5:23, 24.b
-
-
Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’OtuNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
5. Gbaghara ndị ọzọ kpamkpam, gị na ha kpeziekwa
N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ Jehova mere anyị nke anyị ga-agbaghara ya, ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam. Gụọnụ Abụ Ọma 86:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ike ọ̀ na-agwụ Jehova ịgbaghara anyị?
Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ maka otú o si agbaghara anyị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-adị n’otu?
Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma mee ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu na-aga? Gụọnụ Ilu 19:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị iwe ma ọ bụ mejọọ gị, gịnị ka i nwere ike ime ka ihe ghara ịka njọ?
Anyị na-emejọ ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, gịnị ka otu nwanna nwaanyị mere ka ya na nwanna nwaanyị ọzọ dịrị ná mma?
-