Ndị A Kụziiri Ịhụ n’Anya
ỊHỤNANYA bụ mmetụta nke ịhụnanya dabeere n’inwe mmasị, obiọma, ma ọ bụ mmasị ndị e nwekọrọ ọnụ. Ịhụnanya bụ nrapagide na-ekpo ọkụ. Ọ dịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị, ọ na-eguzosi ike n’ihe, ma na-egosi nchegbu obiọma maka ọdịmma ndị ọzọ. Ịhụnanya bụ nnọọ ihe megidere ịkpọasị. Onye ịkpọasị na-akpali na-emikpu onwe ya ná mmetụta nke ya; onye ịhụnanya na-akpali na-eche banyere ndị ọzọ.
Ịhụnanya ka ọ̀ bụ ịkpọasị—olee nke na-achịkwa ndụ gị? Nke a abụghị nnọọ ajụjụ na-abaghị uru n’ihi na ọdịnihu ebighị ebi gị na-adabere n’azịza ya. Ka ha na-ebi n’ime ụwa a na-akụziri ịkpọ asị, ọtụtụ nde mmadụ na-amụta ịhụ n’anya. Ha na-eme nke a site n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ. Ha adịghị nanị ekwu banyere ịhụnanya; ha na-agbalịsi ike ime ya.
Ọ bụrụ na ị gatụwo nzukọ Ndịàmà Jehova, ị pụrụ inwe mmasị n’ihe ị hụrụ. N’agbanyeghị mba i si na ya, Ndịàmà Jehova dị n’otu n’ofufe. Ha mejupụtara òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ezie. A pụrụ ịhụ nke a n’ọgbakọ ha dị iche iche na ná mgbakọ ha ma ikekwe ọ dịghị ebe ọzọ a pụrụ ịhụ ya nke ọma karịa n’ihe ha na-akpọ ezinụlọ Betel. Ndị a bụ ìgwè ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo, ndị na-ebikọ ọnụ ma na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka ezinụlọ, na-emepụta ma na-ekesa akwụkwọ e ji amụ Bible. Ná mba ọ bụla, ụfọdụ n’ime ha na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ebe ahụ. Nke a abụghị obere ọrụ, ebe ọ na-agụnye—ka ọ dị na 1997—ihe karịrị ọgbakọ 82,000 n’ala 233. Iji gboo mkpa a, ihe karịrị mmadụ 16,000 na-eje ozi n’ezinụlọ Betel dị iche iche gburugburu ụwa, gụnyere isi ụlọ ọrụ ụwa nile na n’ihe owuwu alaka dị iche iche dị ntakịrị karị n’ala 103.
Ihe mejupụtara ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ Betel dị iche iche bụ n’ụzọ ka ukwuu ụmụ amaala nke mba ebe alaka ahụ dị na ya. Ma ọ bụghị nanị ha. Ihe mejupụtara ezinụlọ Betel ụfọdụ bụ Ndịàmà si ná mba, ebo, ma ọ bụ agbụrụ dị iche iche tinyere okpukpe mbụ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’ezinụlọ Betel nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 1,200 nke dị na Selters, Germany, e nwere ndị si n’ihe dị ka mba 30. Gịnị na-eme ka ha nwee ike ibikọ, ịrụkọ ọrụ, na ifekọ ofufe n’udo na ịdị n’otu, na gburugburu ebe ikpọasị na-adịghị? Ha na-agbaso ndụmọdụ Bible ahụ dị ná Ndị Kọlọsi 3:14, nke na-ekwu, sị:
“Yikwasịnụ Ịhụnanya”
Ọ dịghị onye na-eyizu ákwà mgbe a mụpụtara ya, ọ dịghịkwa onye na-eyiri ákwà nanị site n’ikwu okwu banyere ya. Mmadụ iyiri ákwà gụnyere ime mkpebi ndị doro anya na itinyezi mgbalị n’isochi ha. N’otu aka ahụ, ọ dịghị onye na-eyikwasị ịhụnanya mgbe a mụpụtara ya. Nanị ikwu okwu banyere ya ezughị. A chọrọ mgbalị.
Ákwà na-aba ọtụtụ uru. Ọ na-echebe ahụ, kpuchie akụkụ ahụ ndị na-adịghị mma ma ọ bụ ntụpọ, ruokwa n’ókè ụfọdụ na-ekpughe ụdị onye mmadụ bụ. Ịhụnanya yiri ya. Ọ na-arụ ọrụ dị ka ihe nchebe n’ihi na ịhụnanya maka ụkpụrụ ndị ziri ezi na maka mkpakọrịta kwesịrị ekwesị na-akpali mmadụ izere mkpakọrịta ma ọ bụ ebe ndị pụrụ ịdị ize ndụ. Ọ na-echebe mmekọrịta mmadụ na mmadụ, bụ́ nke kwesịrị ịdị oké ọnụ ahịa nye anyị. Onye na-ahụ n’anya yikarịrị ka a ga-ahụghachi ya n’anya, onye na-ezerekwa imerụ ndị ọzọ ahụ yikarịrị ka a gaghị emerụ ya onwe ya ahụ.
Ịhụnanya na-ekpuchikwa akụkụ ndị na-adịghị mma karị nke ụdị onye anyị bụ, bụ́ nke pụrụ ịdị na-enye ụmụ mmadụ ibe anyị nsogbu. Ọ̀ bụ na o yikarịghị ka anyị ga-eleghara ntakịrị emezighị emezi nke ndị na-ahụ n’anya anya karịa nke ndị dị mpako, nganga, na-eche nanị banyere onwe ha, na ndị na-enweghị ịhụnanya?
Ndị na-eyikwasị onwe ha ịhụnanya na-ekpughe ịma mma nke àgwà yiri nke Kraịst. Ebe mma elu ahụ na-adịghị abami ime, mma ime mmụọ na-abami n’ime onye ahụ nile. Ikekwe ị maara ndị ị na-ewere dị ka ndị mara mma, ọ bụghị n’ihi ọdịdị elu ahụ ha, kama n’ihi ọdịdị omume ịbụ enyi ha n’ezie. N’aka nke ọzọ, ihe ka ukwuu n’ime anyị ezutewo ụmụ nwanyị ma ọ bụ ụmụ nwoke mara mma bụ́ ndị na-amakwaghị mma n’anya anyị ma ọlị ozugbo àgwà ha pụtara ìhè n’ezie. Lee ka o si adị ụtọ ịnọdewe ndị yikwasịworo onwe ha ịhụnanya!
Iji Ịhụnanya Dochie Ịkpọasị
E gosipụtara na a pụrụ iji ịhụnanya dochie ịkpọasị site ná nnyocha e mere Ndịàmà Jehova 145,958 nọ na Germany na 1994.
Ịṅụbiga mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mpụ, ịgba chaa chaa, na omume na-emegide mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ọ bụ nke ime ihe ike bụcha, n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, ngosipụta nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ nke pụrụ ịkpali ịkpọasị n’ụzọ dị mfe. Ma 38.7 pasent nke ndị a gbara ajụjụ kwuru na iji ruo ụkpụrụ dị elu nke Bible nke Ndịàmà na-akwado, ha aghaghị imeri otu ma ọ bụ karị n’ime nsogbu ndị a. Ịhụnanya maka Chineke na maka ụkpụrụ ezi omume ya banyere àgwà kpaliri ha ime otú ahụ. Ndịàmà Jehova nyere ha enyemaka ịhụnanya, ọtụtụ mgbe ihu na ihu. N’ime afọ ise gara aga (1992-1996), e nyeere mmadụ 1,616,894 n’ala 233 aka ime mgbanwe, na-eji ịhụnanya kasị ike emeri ịkpọasị.
Site n’itinye ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe nanị n’ọrụ n’alụmdi na nwunye ha, Ndịàmà Jehova na-enweta mmekọrịta ndị kwụsiri ike. Ná mba ụfọdụ, otu n’ime alụmdi na nwunye abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla na-etisa n’ịgba alụkwaghịm. Ma nnyocha ahụ e hotara n’elu gosiri na ka ọ dị ugbu a nanị 4.9 pasent nke Ndịàmà ahụ bụ ndị gbara alụkwaghịm ma ọ bụ kewapụ n’ebe di ma ọ bụ nwunye ha nọ. Otú ọ dị, a gaghị echefu na ọnụ ọgụgụ buru ibu n’ime ndị a bụ ndị gbara alụkwaghịm tupu ha ghọọ Ndịàmà Jehova.
Ebe Chineke nke ịhụnanya bụ Onye Nkụzi Ukwu nke na-akụziri ndị hụrụ ya n’anya ụzọ ya, Ndịàmà Jehova na-ebu ụzọ chee ịhụnanya ha ihu n’ebe ọ nọ. N’adịghị ka ndị ọzọ, ndị pụrụ ịbụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya,” Ndịàmà Jehova na-ebute Chineke ụzọ. (2 Timoti 3:4) N’ụzọ megidere ụzọ nke ụwa a na-enweghị ụkpụrụ, ná nkezi, Onyeàmà na-etinye hour 17.5 kwa izu n’ihe omume okpukpe. O doro anya na Ndịàmà ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Nke ahụ bụ ihe na-eme ha obi ụtọ. Jisọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.”—Matiu 5:3, NW.
Ezi ohu Chineke, ka onye dere Abụ Ọma 118 na-ekwu, ekwesịghị ịtụ ụmụ mmadụ egwu. “Jehova dịịrị m; m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?” (Amaokwu nke 6) Ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Chineke nọ na-ewepụ otu n’ime ihe ndị na-akpata ịkpọasị na ịtụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ egwu.
Onye Kraịst, n’ịmara na Chineke ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na-abakwa ụba n’ebere na eziokwu,’ ga-agbalịsi ike iwepụ iwe ná ndụ ya, ebe ọ pụrụ ịbụ ihe ọzọ na-akpata ịkpọasị. Ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ Chineke, gụnyere ịdị nwayọọ na imeru ihe n’ókè, ga-enyere ya aka ime nke a.—Abụ Ọma 86:15; Ndị Galetia 5:22, 23.
Ezi onye Kraịst na-adị umeala n’obi, ọ dịghịkwa eche echiche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị. (Ndị Rom 12:3) Ọ na-azụlite ịhụnanya ná mmekọrịta nke ya na ndị ọzọ. N’ụzọ dị iche n’ịkpọasị, “oké iwe adịghị ewe [ịhụnanya], ọ dịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.”—1 Ndị Kọrint 13:5.
Ee, egwu, iwe, ma ọ bụ echiche nke mmejọ pụrụ ime ka ndị mmadụ na-akpọ asị. Ma ịhụnanya, site n’ịnapụ ịkpọasị ihe ndabere ya, na-emeri ya. N’ezie, ịhụnanya bụ ike kasị ukwuu n’eluigwe na ụwa n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
Ịkpọasị Ga-apụ n’Oge Na-adịghị Anya Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Ebe ha na-abụghị akụkụ nke àgwà Jehova Chineke, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ịkpọasị apụghị ịdịru mgbe ebighị ebi. A ghaghị, dị ka ihe dị mkpa, iwepụ ha, ịbụ ndị e ji ịhụnanya, bụ́ nke ga-adịru ebighị ebi, dochie. Ọ bụrụ na ụwa nke ịkpọasị na-adịghị, nke jupụtakwara n’ịhụnanya, bụ ụdị na-agụ gị agụụ, kwee ka Ndịàmà Jehova kọwaara gị site na Bible ihe ndị a chọrọ maka iji dịrị ndụ hụ ya.
Ee, onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ, sị, ‘Olee àgwà nke na-achịkwa ndụ m, ịhụnanya ka ọ̀ bụ ịkpọasị?’ Nke a abụghị nanị okwu na-abaghị uru. Obi nke na-eti maka onye iro Chineke, bụ́ chi nke ịkpọasị, agaghị etite aka. Obi nke na-eti maka Jehova, bụ́ Chineke nke ịhụnanya, ga-etiru mgbe ebighị ebi!—1 Jọn 2:15-17.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ọbụna taa ndị mmadụ pụrụ iyikwasị onwe ha ịhụnanya