-
Olee Otú Ị Ga-esi Na-ekwusa Ozi Ọma?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
1. Olee otú ị ga-esi na-agwa ndị ị ma ihe ị na-amụta na Baịbụl?
Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.” (Ọrụ Ndịozi 4:20) Eziokwu ndị ha mụtara tọrọ ha ezigbo ụtọ nke na ha chọrọ ịkọrọ ya mmadụ niile. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, na-achọ mgbe dị mma ị ga-agwa ndị enyi gị na ndị ikwu gị ihe ị na-amụta na Baịbụl otú gosiri na ị na-akwanyere ha ùgwù.—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.
Otú dị iche iche i nwere ike isi malite
Ị chọọ ikwuwe gbasara Baịbụl mgbe gị na ndị ikwu gị na-ekwurịta okwu, i nwere ike ịsị: “E nwere ihe tọrọ m ụtọ m mụtara n’izu a.”
Gụọrọ otu enyi gị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-echegbu onwe ya otu amaokwu Baịbụl ga-akasi ya obi.
E nwee onye gị na ya na-arụkọ ọrụ jụrụ gị otú i mere, gwa ya otu ihe ị mụtara mgbe a na-amụrụ gị ihe ma ọ bụ mgbe ị gara ọmụmụ ihe ọgbakọ.
Gosi ndị enyi gị adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org.
Gwa ndị ọzọ ka ha bịa nọrọ mgbe a na-amụrụ gị ihe ma ọ bụkwanụ gị egosi ha otú ha ga-esi gaa na jw.org kwuo ka a bịa mụwara ha Baịbụl.
-
-
Olee Otú Ị Ga-esi Na-ekwusa Ozi Ọma?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
4. Na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù
Ị chọọ izi mmadụ ozi ọma, chebara ma ihe ị ga-ekwu ma otú ị ga-esi ekwu ya echiche. Gụọnụ 2 Timoti 2:24 na 1 Pita 3:15. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú ị ga-esi mee ihe amaokwu ndị a kwuru ma ị gwawa ndị ọzọ ihe ị na-amụta na Baịbụl?
Ụfọdụ ndị ikwu gị na ndị enyi gị nwere ike ghara ikweta ihe ị na-ekwu. Gịnị ka ị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Gịnị ka ị na-ekwesịghị ime?
Gịnị mere o ji dị mma ka i jiri akọ na-ajụ ndị ị na-agwa okwu ajụjụ ga-eme ka ha kweta ihe ị na-ekwu, kama ịna-amanye ha ka ha kweta ihe ị na-ekwu?
-